Geometric power: Ndị Abia ga-amalite imepụta ọkụ latrik nke ha, lee etu e siri gbapee ya n'Aba

Geometric power: Ihe niile ị kwesịrị ịma maka IPP a na-agbape n'Abia steeti taa
Nkọwa foto, A tụrụ anya na ọkụ si n'aka ndị Geometric Power ga-enye ndị Aba ọkụ kwa ụbọchị

N'Aba ka ụlọ ọrụ Geometric Power na-eme mmemme mgbape igwe ọkụ latrik mbụ kwụụrụ onwe ya na Naịjirịa n'Abia steeti.

Igwe ahụ akpọrọ Integrated Power Project tozuru ịmepụta ọkụ ruru 141 "megawatts" ga-enye aka ịhụ na ọkụ dị mgbe niile nye ndị bi n'Aba, n'Abia steeti.

Etu ọ ga-esi rụ ọrụ bụ site n'okporo ga-esi obodo Owaza dị n'Ukwa Abia steeti ebuga gaasi ebe ahụ.

A na-atụ anya na ọ ga-enye okpuruọchịchị itoolu n'ime iri na asatọ dị na steeti ahụ ọkụ.

Lee ihe BBC Igbo hụrụ mgbe ha gara ebe ahụ. 

Igwe oku latrik ahu di n'Aba abia steeti
Bianca Ojukwu na onye ụkọ Chukwu

Onyeisioche Geometric Power bụ Barth Nnaji kọwara na o hibere ya bụ ihe n'Aba dị n'Abia steeti iji kwalite nka na ụzụ na azụmahịa eji mara ndị Aba. 

A ma Aba dịka "Japan nke Afrịka" maka nrụpụta, ndị ọrụ aka, na ndị ncheputa juru n'ahia Ariaria dị n'ebe ahụ. 

Kashim Shettima bụ osote onyeisiala ga-anọchi anya Bola Tinubu na-achị Naijiria na ya bụ mmemme mgbape taa. 

Igwe latrik ahụ ga-ebido ọrụ na mbido ọnwa Maachị afọ 2024.

Ndi biara ya bu mmemme