NLC Strike: Oku adịghị, ụgbọelu efeghị dịka NLC,Gọọmentị Imo na-ama aka

NLC

Ebe foto si, Stringer

E nweghị ọkụ , nke ụgbọelu na-efe n'Imo steeti taa bụ Monde dịka ndị otu jikọrọ ndị ọrụ na Naijiria bụ NLC gbara abụbọọrụ.

Abụbọrụ ahụ na-eso mwakpo ndị agboro wakporo ndị ọrụ NLC dịka ha na-eme emume ụbọchị ncheta ndị ọrụ n' ụbọchị Monde, abalị mbụ nke ọnwa Maachi n'isi ụlọọrụ ha n'Owere.

Otu onye bi n'Owere, Imo steeti, achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC sị, " "Kemgbe ụtụtụ, anyị ahụghị ọkụ, n'ihi abụbọọrụ ndị ọrụ."

"Ndị ọrụ agaghị ọrụ taa, naanị ndị gara ọrụ bụ ndị na-arụrụ gọọmentị steeti bụ ndị na-atụ egwu na e nwere ike ịta ha ahụhụ maọbụrụ na ha soro ibe ha bụ ndị gara ọrụ."

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ na-eke ọkụ na steeti ahụ bụ Enugu Electricity Distribution Company Plc (EEDC) Emeka Ezeh kwuru na ozi o wepụtara ụbọchị Wenezde na enyeghị ọkụ ahụ sitere " na abụbọ ọrụ nke NLC nakwa Alaka ya bụ TUC gbara nke metụtara Inye ndị bi n'Owere, New Owerri,Ọlụ nakwa Mbaise ganye na ekpezie okwu ahụ. “The EEDC na-agwa ndị ahịa ya na ọkụ adịghị bụ n'ihi abụbọọrụ nke NLC na TUC na-agba n'ihi itigbuo-zogbuo ndị na-agara gọọmentị Imo steeti ozi ji kposaa mmemme ndị ọrụ ụbọchị ncheta ha."

Ozi NLC

Ebe foto si, NLC

N'otu aka ahụ, onyeisi oche komiti nlekọta NLC Imo steeti bụ Comrade George Ofoegbu gwara BBC Igbo na ọ bụ NLC nke etiti kpọrọ oku abụbọọrụ ahụ iji gosi iwe ha mwakpo a wakporo ndị NLC nke o boro 'agboro ndị na-arụrụ gọọmenti Imo steeti' ọrụ."

"N'abalị 7 nke ọnwa Maachị ka oge ndị a họọ ọrụ dịka ndị NLC ndị a họọrọ afọ anọ gara aga gwụrụ."

" E mere ntuliaka otu oge na steeti 36 mana nke Imo steeti, ndị na-agara gọọmentị Imo steeti kposara ya nke mere ka enwee nsogbu onye ga-abụ onye ndu.."

"Nsogbu a mere ha NLC nke etiti họrọ otu nlekọta ga na-edu NLC Imo steeti were rue oge edoziri ihe mebiri ma mee m onyeiisioche komiti ahụ."

Ofoegbu kwuru na ha degaara gọọmentị akwụkwọ ikike inye ha ebe ha ga-anọ mee mmemme ncheta ụbọchị ndị ọrụ, ha enyeghị ha nke mere ka ha hiwee emume ahu n'isiụlọọrụ ha bụ ebe ndị agborowakporo ha.

"Anyị jekwuru ndị ọrụ nchekwa, ha nyere anyị mmadụ mana oge o ruru ka onyeisioche NLC ịgụ ozi ya, a hụghịkwa ndị ọrụ nchekwa"

"Ndị agboro ji ụgbọala Hilux bia wakporo ebe ahụ na-eme emume kpụsasịa ihe nile."

"Ọ bụ nke mere ka NLC nke etiti kpoo oku abụbo ọrụ n'Imo steeti. NLC nakwa otu ndị ọzọ so na ya akwụsila ọụ. ndị esonyebeghị ga-esonye echi."

Mbọ BBC Igbo gbara inweta olu Gọọmenti Imo steeti amịtaghị mkpụrụ oge anyị wepụtara akụkọ.