Ndị isi NLC amalitela nagagharịiwe n'Abuja agbanyeghị aka na ntị ndị uweojii dọrọ

Aha onyonyo, Ndị isi NLC amalitela nagagharịiwe n'Abuja

Otu jikọrọ ndị ọrụ niile na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress amalitela ngagharịiwe ha sị na ha ga-eme taa bụ Wenezde ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Julaị.

Ngaghgarịiwe a bụ iji kwado abụbụ ọrụ ndị nkuzi mahadum nke ha malitere kemgbe ọnwa ise ugbua.

Ngagharịiwe NLC n'Abuja

Gọọmentị Naịjirịa dọrọ NLC aka na ntị ka ha ghara ịme ya bụ ngagharịiwe, mana ha kpọrọ ekwo nkụ na-ekwusi ike na gọọmenti ejighị okwu abụbụọrụ ndị Asuu gbara kpọrọ ihe.

Ọtụtụ ndị ọrụ gbakọrọ n'ebe a na-akpọ 'Unity Fountain' dị n'Abuja maka ya bụ ngagharịiwe nke ha sị na ọ bụ ịdọ aka na ntị maka abụbụ ọrụ nwereike isochi.

Ndị NLC mekwara ngagharịiwe na steeti dị icheiche n'ala Igbo n'ụbọchị Tuzde

Aha onyonyo, Otu jikọrọ ndị ọrụ Bekee niile bụ NLC emeela ngagharịiwe ịkwado abụbụ ọrụ ndị ASUU

Otu jikoro ndị ọrụ oyibo niile na Naịjirịa bu Nigeria Labour Congress, NLC, emeela ngagharịiwe ha kwere na nkwa iji kwado abụbụọrụ ndị Academic Staff Union of Universities (ASUU) na-agba kemgbe ọnwa anọ ugbua.

ASUU na-esi ọnwụ ka gọọmentị Naịjirịa tinyekwuoro ha ego n'ụgwọ ọnwa ha ma wepụta ego dozie ụlọ akwụkwọ mahamadu niile na Naịjirịa.

NLC kwuru na ha ga-eme ya bụ ngagharịiwe na Naịjria niile n'ụbọchị Tuzde.

Ngagharịiwe Enugu
Nkọwa foto, Ngagharịiwe NLC Enugu steeti
Ngagharịiwe Owerri
Nkọwa foto, Ngagharịiwe NLC n'Owerri

Gọomentị Naịjirịa dọrọ NLC aka na ntị ka ha ghara ịme ngagharịiwe ahụ maka ndị omekome ijiri ohere ahụ mebie ihe.

Mana ha gbara isi akwara na ha ga-eme ya ma mejuputakwa ya bụ nkwa ha kwere ọnwe ha taa,

Na steeti ụfọdụ BBC hụrụ, ya bụ ngagharịiwe n'aga n'ihu, ọkachasị na Port Harcourt, Owerri, Abakaliki, Enugu, Awka nakwa Aba.

NLC Umuahia
Nkọwa foto, Ndị NLC na-eme ngagharịiwe n'Umuahia

N'Ụmụahịa, ndị ọrụ pụtara ịme ya bụ ngagharịiwe nwetara akwụkwọ ndị uweojii deere ha na ha akwadoghị ya bụ ngagharịiwe maka na ndị ajọ mmadụ nwereike iji ohere ahụ mebie ihe.

Onyeisi ndị NLC bụ Uchenna Obigwe bụ onye gụpụtara akwụkwọ ndị uweojii ahụ n'ụlọọrụ ya Umuahia gwara ndị otu ha na ọka mma ime ya bụ ngagharịiwe n'Abuja.

O tikwara mkpu ka ụmụaka siri nọrọ n'ụlọ kemgbe.

Ngagharịiwe NLC
Nkọwa foto, NLC Abakaliki

Ka nke a na-aga, otu jikọrọ ụmụaakwụkwọ n'Aba, Abịa steetị, kpọrọ onwe ha Free Abia Movement gwara ndị ntaakụkọ okwu taa n'Aba.

Otu a katọrọ ihe ha kpọrọ ajọ agwa gọomentị steetị ahụ na-akpaso ndị nkụzi n'ụlọakwụkwọ ukwu anọ nke gọọmentị steetio ahụ nwe.

Ụlọakwụkwọ ndị a bụ Abia State Polytechnic, Aba, Abia State College of Health Management, Abia State University (ABSU), Uturu na Abia State College of Education Technical, Arochukwu.

Ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na ha enweghịzi ntụkwasịobi n'ebe gọomentị Okezie Ikpeazu nọ.

NLC Port Harcourt
Nkọwa foto, NLC Port Harcourt

Kedụ ndị bụ NLC

NLC

NLC bụ otu jikọrọ otu ndị ọrụ gọọmentị dị icheiche na Naịjirịa.

Onyeisi otu a ugbua bụ Ayuba Waba.

Ngagharịiwe bụ otu n'ime akụrụngwa nke NLC na-eji ekwupụta uche ha n'ebe gọọmentị nọ.

N'afọ 2012, NLC haziri ngagharịiwe kpụ ọkụ n'ọnụ na Naịjirịa nke a kpọrọ 'Occupy Nigeria' n'ihi mwepụ e wepụrụ ego 'petroleum subsidy'.

'Petroleum subsidy' bụ ego gọọmentị na-akwụ iji butuo ọnụego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.

Oge Onyeisiala Goodluck Jonathan kwuru na gọọmentị ga-akwụsị ịkwụ 'subsidy' a, ndị NLC haziri ngagharịiwe nke nọrọ karịa otu izu ụka, ma mee ka gọọmentị kwụgharịa ọnụ gbasara ya bụ mwepụ 'subsidy'.

NLC Anambra steeti
Nkọwa foto, NLC Anambra steeti