ASUU Strike: Ihe abụbụọrụ a napụrụ ụmụakwụkwọ mahadum, ndị nkuzi

Ụmụakwụkwọ na Mahadum Legọs

Ebe foto si, Pius Utomi Ekpei

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ mahadum na Naịjirịa akọọla ihe ha na ije ụwa ha na-eje kemgbe ọnwa itoolu ndị ASUU gbara abụbụọrụ.

ASUU bụ aha ịchafụ nke otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum gọọmentị niile dị na Naịjirịa a kpọrọ 'Academic Staff Union of University'(ASUU).

Amalitela m ịzụ ahịa n'ihi 'ASUU Strike' - Nwata akwụkwọ

Ụlọahịa ebe a na-ere akwa

Ebe foto si, Iwaria.com

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụakwụkwọ amalitela ịzụ ahịa maọbụ ịrụ ọrụ dị icheiche kama ha ga-anọ nkịtị

Rapuluchukwu Obiejesi bụ nwaakwụkwọ na mahadum 'Abia State University, Uturu'.

Ọ kọọrọ BBC Igbo na ọ malitela ịzụ ahịa iji zeere ịnọ nkịtị.

Rapuluchukwu kwuru sị, "Ọ bụrụ na anyị nọ n'ụlọakwụkwọ, ekwesịla m idecha 'project' m, na-elezi anya ịga fee ala nna anyị" .

"Arụọla m ọrụ dị icheiche ma malitezie ịzụ ahịa."

"Ka ọ dị ugbua, ị jụọ m ụmụ ihe ụfọdụ gbasara akwụkwọ, agaghị m echetachazi ya n'ihi na o teela mmadụ hapụrụ ịgụ akwụkwọ."

Rapuluchukwu gara n'ihu kwuo na ọ bụ ugbua o bidoro ịmụta ahịa ya nke ọma ka ASUU kwuru na ha akwụsịla abụbụ ọrụ ha.

N'aka nke ọzọ, o kwukwara na uru dị na ya bụ abụbụọrụ ndị ASUU gbara bụ na ya onwe ya ejila ya mụta ihe ndị ọzọ chere ya n'ihu dịka nwoke.

Onye ọzọ aha ya bụ Nina kwuru na iwe ya bụ na abụbụọrụ ndị ASUU emeela ka otu afọ laa ya n'iyi.

ASUU Strike

Timy Sopuruchukwu kọwara na iwe nke ya bụ na ego mmachi akpa ọ na-enwetabu akwụsịla n'ihi 'ASUU strike'.

ASUU Strike

Abụbụọrụ a soro mee ka ngaghrịiwe EndSARS sie ike - kachamara agụmakwụkwọ

UNIZIK

Ebe foto si, Facebook/UNIZIK

N'okwu nke ya, Ignatius Agu, bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara mmụta, kwuru na abụbụọrụ a ndị ASUU gbara dọlara agụmakwụkwọ azụ nke ukwuu.

O kwuru sị: "Oge a nọ 'strike', mpụ dị icheiche rịrị elu n'ihi na ọtụtụ ụmụakwụkwọ enweghịzi ihe na-eme."

"I lee anya n'ọgbaaghara End SARS, ọ bụrụ na ụmụakwụkwọ anọghị n'ụlọ, ọ gaghị abawanye etu o si bawanye."

"Ọtụtụ n'ime ha malitekwara ịzụ ahịa nakwa ịchọ ụzọ obwere ego ga-esi na-abata ha aka."

"Ugbua ụlọakwụkwọ mepekwara, ọtụtụ agaghị alaghachizi n'ụlọakwụkwọ n'ihi na ha amalitela ịkpata obere ego."

"N'ezie ọghọ dị na abụbụọrụ a karịrị akarị, anyị ga-amalite ịhụ ya n'oge adịghị anya."

O nweghị uru ASUU ritere n'abụbụọrụ a - Ọkammụta Nnabuihe

Chris Ngige na ndị Asuu

Ebe foto si, Federal Ministry of Labour

Nkọwa foto, Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige na Onyeisi ndị ASUU bụ Biodun Ogunyemi

Ọkammụta Chigozie Nnabuihe, onye nkuzi na mahadum 'University of Lagos', kwuru na o nweghi uru ọbụla ASUU ritere n'abụbụọrụ a ha gbara.

O kwuru na nkwa niile gọọmentị etiti kwere ASUU ugbua erubeghị nke ha kwere ha n'afọ 2014 mana o nweghị otu nke e mezuru.

Nnabuihe kwuru sị: "Anyị gbara abụbụọrụ na ihe adịghị mma, mana nkwa niile gọọmentị kwere anyị ọtụtụ afọ gara aga, o nwebeghị nke ha mezuru."

"Amaghị m ihe gọọmentị na ndị isi anyị kpara mere ha ji kweta ka a kwụsị abụbụọrụ."

Mana Nnabuihe kwuru na ya ga-amalitekwa ikuzi ihe ma akwụkwọ mepee n'ihi na "otu onye anaghị aga ọgụ na be ndị mmụọ".

ASUU Strike: ASUU akwụsịla abụbuọrụ mana...

Ógbakó ASUU na ndí na-anóchite góómenti etiti

Ebe foto si, Ministry of Education

Otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ 'Academic Staff Union of University (ASUU) ekwuola na ha akwụsila abụbọọrụ ha gbara kemgbe ọnwa itoolu gara aga.

Onyeisi otu ASUU bụ Biodun Ogunyemi bụ onye gbara ama oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu banyere ka ihe si kwụrụ na nkwekọrịta ha na Gọọmenti Etiti n'Abuja n'ụtụtụ Tọzde.

Ogunyemi sị, "Achọrọ m ịgwa ụnụ na anyị akwụsịla abụbọrụ dịka ndị imeobi ASUU mechara ọgbakọ n'ime abalị."

O kwuru na nke na-abịa dika ha na ndị nnọchiteanya Gọọmenti Etiti nke Chris Ngige nọ n'isi ya binyechara aka n'akwụkwọ nkwekọrịta.

Mgbebi ASUU na-abịa dịka ndị nnochiteanya ASUU na na ndị na-anọchite gọọmenti etiti mere ọgbakọ nọrọ awa asatọ n'abalị foro Wenezde n'Abuja.

N'okwu mmalite ya, mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige kwuburu na ya nwere olileanya na ụmụakwụkwọ mahadum ga-amalite na Jenuwarị, afọ 2021.

N'aka nke ọzọ, onyeisi otu ASUU bụ ọkammụta Ogunyemi kwuru na ha na-ele anya na ọgbakọ ahụ ga-ewetara ụmụakwụkwọ akụkọ obi ụtọ.

Ebe okwu abụbụọrụ ndị nkuzi mahadum kwụ ugbua

ASUU akwụsila abụbọọrụ n'ezie mana okwu ebibeghị.

Ha kpọrọ ekwo nkụ na ha ga-alachị n'abụbọọrụ na amaghị ọkwa ya ma ọ bụụ na gọọmenti emeghị ihe ndị ha kwekọrịtara gụnyere:

  • Anya ha ga-adị n'ile mmezu nkwekọrịta
  • Ha ga-agba mbọ ịhụ na ataghị ndị otu ha esonyeghị isoro 'IPPIS' ahụhụ n'ihi abụbọọrụ a ha gbara
  • Ịkwụ ha ụgwọ ego mgbakwunye e ji ha
  • Inye mahadum niile ego 'Revitalization' ha
  • Iwepụ ha n'atụmatụ akwụmụgwọ 'IPPIS'
  • Ikwụ ha ụgwọ ọnwa e ji ha

Ụmụakwụkwọ na-atụ anya na ọgbakọ a ga-atọ ha n'agbụ ịnọ n'ụlọ kemgbe ọnwa itoolu.

Cheta na ASUU na Gọọmenti enwela ọtụtụ ọgbakọ iji dozie okwu gbasara ọnọdụ ọrụ ha nakwa ndakpọ agụmakwụọ mahadum na Naijiria dịka ndị nkuzi gbara abụbọọrụ mana ọ mitaghị mkpụrụ.

Gọọmenti kweburu ha nkwa inye ha ijeri naira iri anọ (N40bn) maka ụgwọ e ji ha eji nakwa ijeri naira iri atọ (N3bn) maka mwuzigharị mahadum n'ọgbakọ ikpeazụ ha nwere mana nkwa ahụ ebighị abụbọọrụ ahụ.

ASUU Strike: Gọọmenti achọghị ịma maka anyị - Ọkammụta Ogunyemi

Akụkọ maka ụlọakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi 'Academic Staff Union of Universities (ASUU)' bụ Ọkammụta Biodun Ogunyemi ekwuola na gọọmenti etiti achọghị ịma maka ha makana ha na-akwụ ha agụrụ.

ASUU gbara abụbọ ọrụ ga-ete aka bido taa bụ ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachi.

Ogunyemi gwara BBC na ọ dị mkpa ka ndị nkuzi mahadum gosi gọọmenti na ha anaghị egwu egwu.

Ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia ekwu uche ha gbasara abụbọ ọrụ a.

@_harrisonJNR kwuru na ASUU kwesiri iche ka ọrịa Coronavirus belata tupu ha gawa abụbụ ọrụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@@Kayomideee_ kwuru na ASUU na-ekwu ka ga-aasị na agwa ha kwụsị abụbụ ọrụ, ụmụ akwụkwọ alaghachi.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Nkatọ ezuola Hope Uzodimma ahụ maka idu ndị ọrụ ya n'iyiọrụ taa

Uzodimma edoola ndị ọrụ n'iyiọrụ
Nkọwa foto, Uzodimma edoola ndị ọrụ n'iyiọrụ

Gọvanọ Imo steeti ahụ bụ Hope Uzodimma duru ndị kọmishọna ya n'iyiọrụ taa bụ Monde.

Uzodimma na-anata nkọtọ n'aka ndị mmadụ maka isionwu mee ya bụ emume agbanyeghị ka steeti ndị ọzọ sị akwụsịnata emume ugbua maka egwu coronavirus.

Ọtụtụ mmadụ gbarụrụ ihu na ihe mmemme a na-aga n'ihu dịka mgbasa ọrịa coronavirus na-akawanye njọ na mbaụwa gbaa gburugburu.N'agbanyeghị mmachi amachiri mbiakorita nakwa mmekọrịta ndị mmadụ iji gbochie ọrịa a, BBC Igbo hutara ọtụtụ ndị mmadụ n'ógbè ihe omume Ahiajioku, ebe ha gbakọtara iji donyere ndị a e duru n'iyi ọrụ

ukwu.Ụfọdụ ndị Gọvanọ Hope Uzodinma duru n'iyi ọrụ gụnyere; ndị Komishona ọhụrụ, ndị enyemaka pụrụ iche (SA) nakwa ndị nnọchiteanya pụrụ iche.

Nwunye onyeisiala chọrọ ka akwụsị ọrụ

Aisha M. Buhari

Ebe foto si, Aisha M. Buhari/Twitter

Nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari ekwuputala uche ya wee sị ka emechie ebe niile na Naijirịa.

Aisha Buharị kọwara na ị gaghị edobe ụmụaka n'ụlo ma sị nne na nna ha pụọ, n'ihi na mgbe ha batara ọbụ ụmụ ha ga-ezute ha.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ọtụtụ mba dị icheiche emechiela ebe niile na be ha iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus.

Mba dịka Briten, Itali, Fransị, Jamani nakwa obodo Calfornia na New York nke mba Amerịka socha na ndị mechiri elu na ala.

Mana akụkọ ọma si mba Chaịna apụta bụ na ndị nwere ọrịa a ebelatala nke ukwuu.

kpara Atiku ebutela ya

Atiku Abubakar

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Atiku Abubakar

Onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar ekwupụtala na nwa ya nwoke butere ọrịa coronavirus.

Atiku si n'akara Twitter na Facebook ya wee zipụ ozi a n'abalị Sọnde.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

O kwuru na a kpọrọla nwa ya gawa n'ụlọọgwụ 'Gwagwalada Specialist Hospital' dị n'Abụja.

Atiku rịọkwara ka ndị mmadụ na-echeta ezinụlọ ya n'ekpere.

Zimbabwe na Coronavirus

Zimbabwe

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Zimbabwe akagbuola emume ncheta ụbọchị nwereonwe ha chọburu ime n'ọnwa ọzọ dịka ha kagburu ọgbakọ niile karịrị mmadụ otu narị na mba ahụ.

N'Afrika, onye mbụ anwụọla n'aka ọrịa Coronavirus na Zimbabwe bụ ebe Minister ahụike mba ahụ bụ Obadiah Moyo na-agwa ndị mmadụ ha kara obi.

Akụkọ a na-akọwa na ahụ adịbụghị ya bụ nwaamadị nwụrụ, gbara afọ iri atọ ike tupu ya bụ ọrịa ejituo ya.

Ọnwụ Zororo Makamba gosiri na ya bụ ọrịa nwekwara ike igbu onye ntorobịa.

Achọpụtara ya bụ ọrịa n'ahụ ya ụbọchị ụka mgbe ejiri nabata ya n'ụlọọgwụ dị na Harare ụbọchị Satọde bụ ebe ya bụ ọrịa nọ kawanye njọ.

Coronavirus na egwuregwu

Olympic 2020

Ebe foto si, Reuters

N'egwuregwu, akụkọ na-eru anyị ntị taa bụ na mba Kanada na Ọstrelia si na ha agaghị eso gaa asompi Olympics ma enyigharịghị ya maka egwu ọrịa Coronavirus.

Kanada bụ ndị mbụ nupuruisi na 2020 Olympics maka ya bụ ọrịa ozuru mba ọnụ.

Onyeisiala mba Japan bụ Shinzo Abe ekwetala n'ezie na-enwereike ibugharị ya bụ emume maka mkpamkpa ya bụ ọrịa na-akpa na-aga n'ihu.

Ọstralịa sị na ha ahụlarị na ya bụ egwuregwu agaghị aga n'ihu.

Ugbua Briten ekwetala na ha agaghịzị aga ya bụ emume ma ọrịa a si otu a na-agbasa.

Ndị Dọkịnta Naijirịa

Otu akpọrọ Nigeria Association of Resident Doctors sị na ha akwụsịla abụbụ ọrụ ha.

Ha kwụsịrị ya bụ abụbọ ọrụ dịka ha nwere obi ebere bebe ndị Naijirịa nọ dịka Coronavirus na-awakpo ha.

N'Oge edere akụkọ a, mmadụ iri atọ ebutela ya bụ ọrịa na Naijirịa.

NCDC na Coronavirus

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Ngalaba na-ahụ maka ịchekwa ọrịa na nje bụ NCDC ekwuputala na mmadụ ise ọzọ ebutela ya bụ ọrịa Coronoavirus.

Ụgbụ a, mmadụ iri atọ na atọ ebutela ya bụ ọrịa ebe mmadụ abụọ alaa ụlọ ha.

Ikpe ebubo nrụrụaka nke Winnifred Oyo-Ita

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

O bụ taa ka a ga-ekpe ikpe onye bụbu onyeisioche ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ na Naijirịa bụ Winnifred Oyo-Ita .

Ọ bụ ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka bụ EFCC gbara ya akwụkwọ na ụloikpe ukwu nke dị na Abuja maka ebubo nrụrụaka ruru ijeri naira atọ.

Na Saụt Afrịka

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 7

Ndị mba Saut Afrịka eweela iwe dịka Minista na-ahụ maka ịkwalite mmekọ bụ Lindiwe Zulu pụtara n'ezi kwuo na atụmatụ eji chekwa maka Coronavirus na-emekpa ya ahụ.

O mere ihe onyonyo n'ezi were sị " Nọrọ n'ụlo ma okwe gị, mana ọ siri m ike ị nọ n'ụlọ, Nje a biko laa anyị chọrọ ibi ndụ".

Iwe were ọtụtụ ndị Saut Afrịka nke mere ka ha pụta n'igwe kaọọ ihe Zulu mere.

Zulu rịọrịọ mgbaghara ma sị na ọ bụ obi ọtụtụ ndị Saụt Afrịka ka ọ na-ekwuputa.

N'Egwuregwu

Akara Olympic

Ebe foto si, IOC

Nkọwa foto, A na-ekwu ka eyiharịa Olympic nke 2020

Ndị mba Kanada ekwuola na ndị otu egwuregwu ha agaghị eso n'asọmpị Olympik a ga-eme n'ọnwa Julị ma kwuo kwa ka eyiherịa ya maka Coronavirus.

Nke a na-abịa dịka onyeisiala mba Japan na-ekwu na e nwere ike iyiharị ya bụ egwuregwu maka ọrịa Coronavirus.

N'otu aka ahụ ka nyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị egwuregwu ụwa niile bụ Lord Coe amaala ọkwa ka eyiharịa egwuregwu Olympic nke 2020.

Ọ na-ekwu nke a dịka mba Kanada, ngalaba na achịkọta ndị egwuregwu mba Ingland na nke Amerịka na-ama ọkwa iyigharị ya bụ asọmpị.

Gee akụkọ ndị n'uju n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile