Coronavirus: Onyeisiala Buhari ekwuola okwu n'onyonyo banyere coronavirus

Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

N'ikpeazụ onyeisiala Buhari emeela ihe ọtụtụ ndị Naịjirịa na-atụ anya n'aka ya nke bụ ka o kwuo okwu n'onyonyo maka coronavirus.

O mere nke a site n'ihe onyonye onye enyemaka mgbasaozi bụ Bashir Ahmed wepụtara na twitter.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Buhari sị na ya ministri ahụike na-arụkọ iji hụ na e chekwara ndị Naịjirịa site na ọria Covid-19 dịka ọ bụ nke kachasị ọchịchị ya mkpa ugbua.

Ọ gwara ministri a ka ha gbaa mbọ dosa ihe ọrụahụike ọbụla dị mkpa iji buso ọrịa agha.

Akara ntụ-ntụ

Legọs enyeela ndị ọrụ bekee ezumike izuụka abụọ

Babajide Sanwo-Olu gọvanọ Legọs Steeti

Ebe foto si, @jidesanwoolu

Gọomenti Legọs Steeti enyeela ndị ọrụ bekee nọ n'ogogo 1 ruo 12 ezumike izuụka abụọ dịka ụzọ iji kee nkwụcha na mgbochi ọrịa coronavirus.

Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nyere iwu a na mgbasaozi o mere n'ụbọchị Sọnde.

Ọ sị na ụzọ mgbochi niile etinyere iji gbochie ọrị a ka dị ire ma kwuo na onye ọbụla si ofesi bata nọrọ n'ime ụlọ ruo izuụka abụọ.

Akara ntụ-ntụ

'Coronavirus ga-agabiga Abia maka na Abia dị n'akwụkwọ nsọ'

Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Ebe foto si, @okezieikpeazu

Nkọwa foto, Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Gọvanọ na-achị Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazụ ekwuola na ọrịa coronavirus agaghị erute Abia nso n'ihi na ọ bụ steeti e dere aha ya n'akwụkwọ nsọ.

O kwuru nke n'ihe onyonyo mgbe ya na odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Onyebuchi Ememanka na-akparịtaụka.

Ikpeazu bụ onye kpere nke a dịka ekpere sị na dịka Abia bụ steeti e dere n'akwụkwọ nsọ na Chineke kwere nkwa na ọrịa ọjọọ ọbụla agaghị erute ndị Abia nso.

Ọ sị na oge ọrịa ebola, monkey pox na ụmụnne ya bịara, na ha eruteghi n'ime Abia steei, na ọ bụ otu aka ahụ ka coronavirus ga-eji gafee na-eruteghi Abia.

Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji kpọrọ Abia n'ọnụ na soshal midia.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Onye bụ Ifeanyi George nwụrụ anwụ?

Ifeanyi George

Ebe foto si, @rangersint

Nkọwa foto, Ifeanyi George si Enyimba banye Rangers International FC na 2016

Otu onye egwu bọọlụ Rangers International nke Enugwu ji eme onụ bụ Ifeanyi George alaala mụọ n'ụtụtụ Sọnde.

Ifeanyi nwụrụ n'ihe mberede okporo ụzọ ka o si Enugwu aga Legọs.

Dịka akụkọ siri kwuo, ọ bụ ya na mmadụ abụọ ọzọ nọ n'ime ụgbọala oge mberede a mere.

Otu egwuregwu bọọlụ Rangers kwuru n'ihe a mere n'akara Twitter ha.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọtụtụ ndị ihe ya na amasị na-ezigara ezi na ụlọ ya ozi itiaka n'obi na soshal midia.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Foto ndi mmadu setere n'ebe mberede mere gosiri na ụgbọala ya banyere n'okpuru ụgbọala.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Akụku na-ekwu na nwaamadị a nọ n'ụzọ ịlaghachị ebe o bi na Legọs dị ka akagburu asọmpị premiership na Naịjirịa oge ihe a mere.

Ifeanyi George na-agbaburu Enyimba nke Aba bọọlụ.

Akara ntụ-ntụ

Coronavirus na Gana

Gana

Ebe foto si, Getty Creative Stock

N'Afrika, otu onye anwụọla na mba Ghana n'aka Coronavirus dịka mba ahụ gbachiri ọpụpụ na mbata ụbọchị Satọde.

Otu onye ọkachamara na ngalaba World Health Organisation ekwuola na inwete ọgwọ mgbochi nje a ga-rucha otu afọ.

Mike Ryan bu onye na-ahu maka gbata gbata ahuike na WHO sị a na-agbalị mana ọrụ ka dị n'ịmata ma ọgwụ enwere o ga-enye nsogbu ma aṅụọ ha.

Akara ntụ-ntụ

N'egwuregwu

Lorenzo Sanz

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lorenzo Sanz weere oche na Real madrid dịka onyeisi site n'afọ 1995 ruo 2000

N'egwuregwu, onye bụbụ onyeisi oche ndị Real Madrid, Lorenzo Sanz anwụọla n'aka Coronavirus ụbọchị Satọde.

Sanz gbara afọ iri asaa na isi tupu ọnwụọ bụ ya kpọbatara Roberto Carlos, Clarence Seedorf na Davor Suker mgbe ọ nọ n'ọchịchị.

Akara ntụ-ntụ

gbakọ ndị gọvanọ agbatarala ndị ọkụ meturu ọsọ enyemaka

Abule Ado

Ọgbakọ ndị Gọvanọ na Naịjrịa akpọrọ Nigeria Governors Forum enyela nde narị naịra abụọ maka inyere ndị ọkụ gbara ihe ha n'Abule Ado aka, Legọs steeti.

Abdulrazaque Bello-Barkindo bụ odeakwụkwọ mgbasa ozi ha kwuputara nke a ụbọchị Satụde.

Legọs steeti hibere akpaego ha kpọrọ Abule Ado/Soba Emergency Relief Fund maka ịnyere ndị ya bụ ọkụ metutere aka.

Ndị nọchite anya ọgbakọ ahụ nke Gọvanọ Kayode Fayemi nọ n'isi ya gara njem nleta na-ebe ya bụ ihe mere.

Ka Fayemi kwuchara maka ego a, ọ gwakwara ndị mmadụ na ego ọzọ nwekwara ike isi an akpa ndị steeti dị iche iche bịa.

Fayemi bụ onye ihe mere ebe ahụ gbagwojuru anya tiri ndị mmadụ aka n'obi.

Akara ntụ-ntụ

Coronavirus n'Ogun steeti

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Achọpụtakwala na otu onye ọzọ ebutela Coronavirus na Ogun steeti.

Nigeria Centre for Desease control bụ ndị kwuru nke a n'akara Twitter ha n'ụtụtụ taa

Nke na-ebute ndị ahụrụ nje a n'ahu ha mmadụ iri abụọ na isii nke mmadụ abụọ n'ime ha agbakela ma laa be ha.

Achịọla ndị otu nzuzo na Mahadum Abuja

Mahadum Abuja

Ebe foto si, University of Abuja

Ubọchị Faịde ka Mahadum Abuja chụrụ ụmụakwụkwọ iri abụọ na anọ maka isonye otu nzụzọ.

Aka kpaara ụmụaka ahụ ka ha nọ n'ime ọhịa eme emume ịsonye otu ahụ díka ndị obodo gbara ha ama.

Akara ntụ-ntụ

Obi adighị ndị nga mma

Ndí nga na Colombía

Ebe foto si, Getty Images

N'ofesi,

Ọgbaghara adaala na mkpọrọ iri na anọ na mba Colombia dịka ndị eji ebe ahụ na-agbarụ ịrụ maka na-atọhapụghị ha ka ha ga zere isi onwe maka coronavirus.

A na-eche na ọ nwere ka ndị nga a niile ahụ sị nwe nkwekọrịta ịmalite ya bụ ọgbaghara.

Akara ntụ-ntụ

N'egwuregwu

Robert Lewandowski

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Robert Lewandowski na Anna, nwunye ya

Robert Levandowski nke Bayern Munich na onye be ya enyela otu nde Euro maka ibuso coronavirus agha.

Leon Kọreska na Joshua Kimmik nyekwara otu nde Euro maka otu agha ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị