Coronavirus: A ga-agbachi ọdọụgbọelu Legọs na Abuja maka coronavirus

Ọdọụgbọelu dị na Pọtakọt
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-agbachi ọdọụgbọelu dị na Legọs na Abuja malite na Mọnde abali iri na atọ nke ọnwa Maachị maka otu ọrịa a kpọ n'ọnụ bụ coronvirus.

Onyeisi ụlọọrụ Nigerian Civil Aviation Authority bụ Musa Nuhu sị nke a bụ ịgbakwụnyere n'ọdọụgbọelu nke Enugwu, Pọtakọt na Kano e mechirila na mbụ.

Ọ sị mmechi a ga-adị ruo ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Eprelụ.

NCAA tok for statement

Ebe foto si, NCAA

Kama na mfepu na mfebata ụgbọelu ndị dị ezigbote mkpa ga na-aga n'ihu n'oge mmechi a.

Nke a na-abịa dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na Naịjirịa ugbua eruola iri abụọ na abụọ

Ihe mberede mere n'elu akwammiri Naịja

Ebe foto si, FRSC Onitsha

Nke na-akpọtụ ugbua bụ na enwere ihe mberede okporoụzọ n'elụ akwa mmịrị nịaja ebe otu obere ụgbọla makpunyere n'okpuru gwongworo.

Ndị uweojii na ndị Federal Road Safety nọ ebe ahụ ugbua ịmata ihe mere ya.

Ọnweghị onye nwụrụ n'ime mmadụ isii ya bụ ihe metutara, mana mmadụ anọ n'ime ha meruru ahụdịka ndị ọrụ Road Safety si kwụọ.

Ihe mberede mere n'elu akwammiri Naịja

Ebe foto si, FRSC Onitsha

Mmadụ anọ ndị ahụ nọ na FMC Asaba anata ọkwụkwọ ka ọ dị ugbua.

Road Safety sị na ọ bụ oke ịgbaọsọ n'aka onye obere ụgbụọla Toyota Celica bụ ihe mere o ji sọkanye isi n'okpuru gwongworo Mark ahụ.

Ka o dị ugbua, ebupula ụgbọala abụọ ahụ n'ụzọ nke mere ụzọ ji aga were were.

Onyeisi Federal Road safety n'Anambra steeti bụ Andrew Kumapayi na-arịọ ndị mmadụ ka ha benete aka n'oke ọsọ ma ghara ịgbafe oke asịrị ka aghara ịgba ọkachasị n'ebe dị kpachị kpachị.

Mmadụ iri ọhụrụ ọzọ ebutela coronavirus na Naịjirịa

A passenger"s body temperature is being tested at the gate of entry upon arrival at the Murtala International Airport in Lagos

Ebe foto si, AFP

Mịnịsta ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehinare ekwupụtala na mmadụ iri ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

Nke a mere ya mmadụ iri abụọ na abụọ buterela ya na Naịjirịa ugbua.

Ọ sị na mmadụ 16 si na Legọs, 3 si na Abuja, 2 si n'Ogun steeti ebe 1 si n'Ekiti steeti.

Ehinare gara n'ihu kwuo na mmadụ abụọ enwerela onwe ha ebe a na-elekọta ndị ọzọ anya n'ụlọọgwụ di iche iche ugbua.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

CBN ebuliela ego ana ere dọla

Godwin Emefiele

Ebe foto si, Getty Images

Ụnụ anụrụ Ụlọakụ gọomentị etiti akụdaala ọnụego ana ere dọla.

Ugbua, ya bụ ụlọakụ na-eresizia ụlọakụ ndị ọzọ narị naịra atọ na iri isii (N360) nke ji pasent iri na ise (15%) karịa ihe ana erebu ya na.

Nke a ga-eme ka ndị ụlọakụ obere na ndi ahịa Bureau de change rewezie dọla otu ọnụego.

Otiegwu na Kongo alaala mụọ

Aurlus Mabélé

Ebe foto si, Youtube

Nkọwa foto, Aurlus Mabélé ereela egwu karịri nde iri n'ọnụogu

N'Afrịka, otuiegwu ama ama bụ Aurlus Mabélé anwụọla n'ụlọọgwụ dị na Paris, France.

Kepu kepu na-ana anụ n'aka ndị na-eso ya na soshal media na-ekwu na ọ bụ Coronavirus gburu ya, mana BBC achọpụtabeghị nke ahụ ka ọ bụ eziokwu.

Kenny Rogers alaala mụọ

Kenny Rogers

Ebe foto si, Getty Images

Ọzọ dịka ibe ya bụrụkwa na otuegwu ọzọ ama ama bụ Kenny Roger nwụọla ka ọ gbara afọ iri asatọ na otu.

Onye ezi na ụlọ ya sị na ya bụ nwaamadị kụwara egwu kemgbe 1976 rahụru nwụọ ka ọ nakpuru.

Nse na Waje no ọnọdụ nkwụcha maka coronavirus

Waje na Nse

Ebe foto si, Waje/Nse

Enenewe ejeghị ọlụ na Naịjirịa bụ Ikpe-Etim na oti egwu Waje etinyele onwe ha n'ọnọdụ nkwụcha.

Nse ikpe mere nke a kemgbe o si UK lọta , mana Waje mere nke ya makana ọ nụrụ na-ekwuru ka ndị niile gara AMVCA tinye onwe ha n'ọnọdụ ahụ.

Ha gbara ama n'akara Instagram ya bụ ebe ọnọ kwụọ na ya mere nke a dịka ntuzịaka gọomenti sị kwuo maka ịgbochị ọrịa Covid-19.

Ngagharị iwe n'Ọljirịa

Óljiria

Ebe foto si, Getty Images

N'Afrịka,. ndị na-eme ngagharị iwe na mba Ọljirịa ejirile aka ha kagbuo ngagharị iwe nke izu a maka ọrịa Covid-19

Mmadụ iri n'ime iri itoolu ndị bu ọrịa a anwụọla na mba ahụ kemgbe ya bụ ọrịa malitere.

Tokyo 2020

Nic Coward

Ebe foto si, Reuters

Oruola mgbe aga etinye ọnụ n'okwu ibugharị ụbọchị mmalite egwuregwu Tokyo 2020.

Mbanụ, ọ bụ Nic Coward, onyeisioche egwuregwu dị iche iche n'UK na-akwado ya bụ emume sị na ọbaghị uru isiọnwụ na-aga eme ya bụ asọmpi ebe akagbuchagoro egwuregwu eji akwado ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: