Ignaz Semmelweis: Ihe asaa ị maghị maka nwoke chọpụtara ịkwọ aka

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị Fraide, Ụlọọrụ 'Google' chetara Ignaz Semmelweis n'ụzọ pụrụiche site n'iji foto ya e sere ese mee ihu ọba ozi ha iji kwanyere ya ugwu maka ịchọpụta uru ịkwọ aka bara n'ibelata nkesa ọrịa.
Lee ihe ndị mere Ignaz Semmelweis oyoyo ị na-amaghị:

Ebe foto si, Google
1. Ọ bụ onye dọkịta chọpụtara na e nwereike site n'ịkwọ aka belata ọrịa ahụọkụ na-egbụkarị ụmụnwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'oge agba afọ 1800 na 1820, oge ụmụnwaanyị na-anwụ ka ọkụkọ n'ịmụ nwa.
2. Semmelweis gwara ndị dọkịta ka ha bido ịkwọ aka tupu ha a naa nwaanyị nwa. N'afọ 1847, wọọdụ ya mere ya, ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị nwụrụ n'ịmụ nwa site na pasent 18.3 gbatuo rue pasent 2.2.
3. A mụrụ ya n'obodo Taban dị nso na Buda na Budapest n'afọ 1818.

Ebe foto si, Getty Images
4. Mana ndị dọkịta ibe ya kwara ya emo maka nchọpụta ya ma jụ ịgbaso nchọpụta ya n'ihi na ọ gbasoghi usoro ha na-esobu.
5. Ọ na-azubu ahịa tupu ọ lọgachị ụlọakwụkwọ gụọ maka ahụike.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
6. Ọjụjụ a jụrụ nchọpụta ya mere ya butere ya obi ịda mba dịka ọ kpọrọ ndị dọkịta agbaso amụma ya 'ndị ọmụma egbu ọchụ', n'ihi na ha na-eji aka e ji naa otu nwaanyị nwa ga naa nwaanyị ọzọ.
7. A tụnyere ya n'ogige a na-elekọta ndị isi mgbaka ebe ọ nọọ nwụọ ka ọ gbachara afọ iri anọ na asaa (47) n'ihi abụ sochiri ihe ndị nche kụrụ ya.
8. Ọ bụ mgbe Semmelweis nwụchara ka ọha jiri were okwu ya kpọrọ ihe ma tinyekwa ya n'ọrụ.








