Coronavirus: Ihe dị iche n'ọrịa a na azụzụ nkịtị

Onye na-akwa ụkwara

Ihe abụọ gbara ọkpụrụkpụ e ji ama onye nwere ọrịa coronavirus bụ ahụ ọkụ na ogologo ụkwara.

Mana ọ pụtaghị na onye ọbụla ahụ ya dị ọkụ nwere ọrịa ahụ.

Ọpụtaghịkwa na onye ọbụla na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere bu nje corona virus.

Ọ bụrụ na ị na-ama uzere ugboro ugboro, maọbụ na imi gi na-agụpụta, maọbụ na isi na-awa gị, o nwere ike ịbụ azụzụ nkịtị, mana ọbụghị coronavirus.

Ngwa lee ihe dị iche na nnukwu 'B' na ọkpa ehi.

Ahụ ọkụ

Onye a na-ele etu ekpomọkụ ahụ ya ha

Ebe foto si, Getty Images

Ahụọkụ coronavirus bụ mgbe ekpomọkụ ahụ mmadụ gafere digrii 37.8.

Mana ọbụghị mmadụ niile nwere tamomita e ji amata etu ekpomọkụ ahụ dị.

Ya mere, ọ bụrụ na obi gi na azụ gị ka dị ọkụ karịa akụkụ ahụ gị ndị ọzọ, mara na ị ga-aga nnyocha.

Ụkwara

Onye na-akwa ụkwara

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụrụ na ị na-akwapụta ihe na-alọ alọ mgbe ị kwara ụkwara, mara na ọ bụghị coronavirus kpatara nke a.

Ọ bụrụkwa na ụkwara gị bụ ịkwaa taa ọ laa echi, ọbụghị coronavirus.

Ụkwara coronavirus bụ nke na-akwa mmadụ ogologo oge, na-enweghị ihe ọbụla onye ahụ na-akwapụta.

Bekee na-akpọ ụdị ụkwara 'Dry Cough'.

Ihe ị ga-eme

Ebe a na-azụ ndị ọrụ ahụike

Ebe foto si, Twitter/@NCDCgov

Nkọwa foto, Ndị NCDC kwuru na ha nwere ndịọrụ ahụike a zụrụ nke ọma maka igbochi ọrịa dịka coronavirus

Ọ bụrụ na gị maọbụ onye ị ma nwere ụdị ụkwara a nakwa ụdị ahụọkụ a, lee ihe ị ga-eme.

  • Zeere mmekọrịta gị na ndị mmadụ
  • Malite ikpuchi ọnụ gị na imi gi
  • Chọọ ụzọ kpọọ ndị ọrụ ahụ ike. Akara ngalaba na-ahụ maka coronavirus na Naịjirịa bụ: 080097000010 maọbụ 08099555577 (ozi 'SMS')
  • I nwekwara ike izigara ụlọọrụ mgbochi ọrịa bụ NCDC ozi na [email protected]
  • Ebe ọzọ ị ga-enweta ha bụ na akara twitter: @NCDCgov
  • Ndị gị na ha bi ga-agbakwa mbọ zeere mmekọrịta ha na ndị mmadụ ruo ubọchị 14.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Lee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị