Coronavirus in Nigeria: Mmadụ ise ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

Ndị na-ekpuchi ihu ha iji gbochie coronavirus

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọbụghị ndị nọ na foto a ka a na-ekwu maka ha.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Mmadụ ise ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

Ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' kwupụtara nke a n'ụbọchị Wenezde.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nke a pụtara na ndị butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa eruola asatọ.

Abụọ n'ime asatọ a agbakeela.

Ụlọọrụ NCDC kwuru na mmadụ ise ọhụrụ mere njem gaa mba Briten maọbụ Amerịka.

Ọbụghị n'aka onye mbụ bubatara ọrịa ahụ ka ha si bute ya.

Ndị nọ n'ọdụọụgbọelu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Naịjirịa amachiela

Ha kwukwara na ha na-agba mbọ ugbua ịchọpụta ndị niile ha na ndị ahụ mekọtara ahụ kamgbe ha lọtara.

Nke a na-abịa dịka gọọmentị Naịjirịa machiri ndị si mba ebe coronavirus ka njọ ịbata na Naịjirịa.

N'ọgbakọ 'Federal Executive Council' n'ụbọchị Wenezde ka a nọrọ nwee nkwekọrịta a.