COVID 19: Gọọmenti ewetuola mmanụ ụgbọala ruo N130

Gọọmentị Naịjirịa ebutuola ọnụahịa mmanụ ụgbọala site na'otu naịra na iri anọ na ise were ruo na otu naịra na iri atọ.
Atụgharịa ya na dọla ọbụrụ $0.35, ọ gaghịzị abụ $0.40.
Na nkwado ya bụ ntuziaka onyeisi ụlọọrụ Nigeria National Petroleum Corporation, Mele Kyari ebutukwoola ọnụahịa mmanụ ụgbụọal na stashon ndị NNPC niile bụ ebe ha ga na-erezị mmanụ $0.34.
Minista nke steeti nke mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva sị na nke bụ maka imezu nkwa gọọmenti kwere n'afo 2015 mgbe ebuliri ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ nke dara okwu mgbe ahụ.
Nke a pụtara na ọnụahịa mmanụ agbidi gbagokwa ọzọ tupu afọ akwụ, ọnụahịa mmanụ ụgbọala ga-esokwa ya rigoo.
Cheta na ọnụahịa mmanụ agbidi si n'elu ọji ebe ọ nọ na $45 daa na $31.52 bụkwa ebe o si sụọ kwu n'ala n'ọnụ $27.46 n'izuụka gara aga bụ nke ndị mmadụ sị na-ahụbeghị ụdị ya kemgbe 1930.
Naịjirịa kwadoburu iji ego mbite dị ijeri dọla iri abụọ na abụọ na ụma asaa were mezuo ego akwadoro iji rụọ ọrụ n'afọ 2020 bụ nke ndị ụlọomeiwu nta zodoro ọkpa kemgbe.
Onwebeghị onye ma ebe ụsụahịa si na mmanụ agbidi ga-edowe akụ na ụba Naịjirịa ọkachasị ụgbụa ọrịa COVID-19 bịagoro mgba nke ya.
Gọọmenti amachiel ndị ọrụ ime njem

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Naịjrịa amachiela ndị orụ ha ịme njem ọbụla maka egwu Coronavirus.
N'otu aka ahụ ha dọrọ aka na ntị ka ndị ọbụla chọrọ ime njem chaara mba ndị ahụ ha machiri amachị dịka Chaịna, Italị, Amerika.
Mba ndị ọzọ ya bụ mmachị metutara bụ Iran, South Korea, Spain, Japan, France, Germany, Norway, UK, Netherlands na Switzerland.
Nke a bụ ihe pụtara na nzuko mbụ onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buharị na ndị ọrụ ya nwere gbasara ọrịa COVID-19 nke ọdeakwụkwọ ya nọ n'isi ya.
Nnenne si n'ụlọelụ daa n'Anambra steeti

Ebe foto si, Getty Images
Otu agadị nwaanyị gbara afọ iri asatọ na ise esila n'ụlọelụ ogogo anọ matụọ n'Awada dị n'Onicha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Haruna Mohammed kọwara na ya bụ nwaanyị nwuru maka ada ahụ dị ka isi ezuchaghị ya oke.
Saụt Afrịka ajụla ndị so ụgbọmmiri ịritu be ha

Ebe foto si, AFP/Getty Images
N'Afrịka, mba Saụt Afrịka ekweghị ka ndị so ụgbọmmiri si Yurobe bata mba ahụ rituo n'ikperemmiri n'ihi egwu ọrịa Coronavirus.
Ndị isi ọrụ ahụike na mba ahụ kwuru na ha na-eche mpụtara nynyocha mmadụ isii nọ n'ụgbọmmiri ahụ.
Facebook ajụla akụkọ asị

Ebe foto si, PA
Ndị ọrụ Facebook nke Naịjirịa ehiwela amụma nnyọcha ịmata ụzọ aga esi kwusịlata akụkọ asị ana agbasa na ya bụ ọba nzikọrịta ozi.
Nke a bụ nke mbụ Facebook na amalite amụma bụ nke ndị gọọmentị Afrịka ụfọdụ na-akwado.
Lee mba ndi Gọọmenti Naịjirịa machiri

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Naịjirịa amachiela mba ndị coronavirus na-akpa ike ịbata Naịjirịa.
Mba ndị ahụ gunyere Chaịna, Itali, Ịran, Saụt Korea, Spen, Japan, Fransị, Jamanị, USA, Nọọwee, UK, Nedalands na Swizaland.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Oteela ndị mmadụ ji tiwe mkpu ka amachie ndị si mba ebe coronavirus na-akpa ike.
Mba Saut Afrịka, Ghana, Kenya, Moroko na ndị ọzọ emeela nke a.
Ọtụtụ mba ndị ọzọ na Yurop nakwa Amerịka emkwaala otu ihe ahụ.
Gọọmentị Naịjirịa sị na onye ọbụla si mba ndịa bata ga-anọrọ onwe ha ruo abalị iri na anọ.
Gọọmentị Sịkwa na ha agaghị enyezị 'visa' na mbata dịka ha na-emebu.
Ihe ọzọ ha mekwara bụ inye ndi Naịjirịa ndumọdụ ka ha ghara ịga mba ndị a.

E mechiela ogige ndị kọpa na Naịjirịa

Ebe foto si, @nysc_ng
E mechiela ogige ebe a na-azụ ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ 'National Youth Service Corps' n'ihi ọrịa coronavirus.
Nke a na-eme n'isi ụtụtụ ụbọchị Tuzde.
Otu onye ezigara Rivers steeti maka ife ala nna gwara BBC Igbo na ndị nlekọta ha gwara ha ka onye ọbụla kwara laa.
Onye NYSC ọzọ na Nasarawa steeti gwakwara anyị otu ihe ahụ.
Ọzụzụ ndị ji otu afọ efe ala nna ha na-abụkarị izuụka atọ.


N'izu ụka gara aga ka ọzụzụ nke ugbua malitere n'akụkụ Naịjirịa niile.
Nke pụtara na ya bụ ọzụzụ were naanị otu izuụka ugbua.

Mikel Obi apụọla na Trabzonspor

Ebe foto si, Getty Images
Mikel Obi ahapụla otu egwuregwu bọọlụ Trabzonspor nke mba Turkey.
Nke a na-abịa dịka Obi katọrọ etu asọmpi bọọlụ ka si aga n'ihu na mba ahụ na-agbanyeghi mfesa ọrịa coronavirus.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Orịa coronavirus mere ka akagbuo ọtụtụ asọmpi n'akụkụ ụwa niile.
Mba Briten, Fransị, Spain, nakwa Italị kagbuchara asọmpi ha.
Otu UEFA kagbukwara asọmp 'UEFA Champions League' na 'Europa League', ma yigharịa nke 'EURO 2020'.
Mana mba Tọki kachiri ntị na-agba asọmpi nke ha, kama ha kwuru na ndị mmadụ agaghị abịa n'ọgbọ egwuregwu ikiri ya.
Nke a mere ka Mikel kwuo na o kwesịrị ka a kwụsịtụ asọmpi ahụ iji zọọ ndị mmadụ ndụ.
Ka ọ dị ugbu a, Mikel ekwubeghị ma ọ bụ nke a kpatara o ji ahapụ Trabzonspor.
Otu bọọlụ ahụ ekwughịkwa ihe mere ha na Mikel ji see okwu.
Naanị ihe ha abụọ kwuru bụ na ha ji obi ọcha ha kagbuo nkwekọrịta ha na Mikel.

Onye India na Legọs enweghị coronavirus

Ebe foto si, Lagos state ministry of health
Ngalaba na-ahụ maka ahụike na Legọs steeti akpọrọ "Lagos State Ministry of Health" ekwuola na otu nwoke onye India a na-enyocha ma o bu coronavirus ebughi ya bụ nje.
N'ozi ha dere n'akara Twiter ngalaba ahụike a si na nwoke a nọ n'ebe ha na-edewe ndị a na-enyocha, ma kwukwa na a ga-etinyekwu anya n'okwu ya n'ụtụtụ Wenesde.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ugbua ndi achọpụtarala nwere nje a na Naịjirịa dị mmadụ atọ, otu onye mba Itali na ndị Naịjirịa abụọ.
Agwọtala otu onye nke Naịjirịa ebe onye Itali ahụ enwetakwala onwe ya.
Onye nke atọ bụ onye nke ekwupụtara n'ụbọchị Tuzde.
Gọọmentị amachiela ime njem mba ofesi

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Iji buso ọrịa coronavirus agha, gọọmentị Naịjirịa amachiela ndị ọrụ gọọmentị welitere isi ime njem ọbụla gaa mba ofesi.
Odeakwụkwọ gọọmentị bụ Boss Mustapha nyere iwu a n'abalị Tuzde.
Ọ dọkwara aka na ntị ka onye ọbụla si mba ofesị alọta dopu onwe ya iche ruo abalị iri na anọ.
EU emechiela oke ala ha

Ebe foto si, AFP
Otu European Union emechiela oke ala ha ruo abalị iri atọ iji belata mgbasa ọrịa coronavirus.
Nke a pụtara na agaghị ekwe onye abụghị onye mba EU bata na mpaghara ahụ.
Mmechi oke ala metụtara mba iri abụọ na isii so n'otu ahụ.
O metụtakwara mba Iceland, Liechtenstein, Norway na Switzerland, mana o metụtaghị mba UK.
Ọtụtụ mba so n'otu EU emechibuola oke ala ha n'ihi ọrịa a.









