Real Madrid: Courtois ahapụla Chelsea wụfere

Ebe foto si, Getty Images
Real Madrid azụrụla Thibaut Courtois bụ oche goolu, n'aka Chelsea.
Courtois bụ onye ritere erere 'Ọkachasị eche goolu' n'Iko Mbaụwa nke 2018, kwụbara ndị mmadụ ọtọ na mkpịsị ụkwụ ha ka ha na-enyo ịma ebe ọ ga-agba bọolụ ma afọ bọọlụ ọhụrụ bido.
Iji kpọbata ya n'otu ha, Real Madrid dere "Anyị na Chelsea enweela nkwekọrịta gbasara ngafete @ThibautCourtois, onye ga-anọnyere anyị afọ isii."
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Chelsea n'onwe ha kwuru sị "N'abalịa, anyị na Real Madrid ekwekọrịtala na Thibault Courtois ga-esonye ha, ma ha na ya nwee nkwekọrịta nakwa ma o mee ọfụma na nyocha ahụike ya.
Iji mee ka nke a dị ire, Mateo Kovacic ga-esonye Chelsea n'obibi (loan) nke otu afọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Cheta na o teela ndị mmadụ na-eche ịnụ ma ọ ga-agafe Real Madrid, ma ọ ka ga-agbara Chelsea.

Akụkọ ga-amasị gị






