Ego Ronaldo kachasị nke ụfọdụ ndị bọọlụ a ma ama

Ebe foto si, Getty Images
Ị ma na oti egwu bọọlụ bụ Cristiano Ronaldo na-anata ego karịrị a gbakọta ego a na-akwụ ndị egwu bọọlụ anọ ama ama?
NKe a so n'ihe nwa amadị a banyere otu egwuregwu Juventus ọhụrụ ji ewu na soshal midia ugbua.
Ego Ronaldo karịrị ugboro anọ ego Higuain, Dybala, Donnarumma na Souza na-anata ugbua, dịka Team FA siri kwupụta na Twitter.
Cristiano Ronaldo dos Santos Aveiro bụ onye ama ama dịka ọgba bọọlụ nke ala Portugal na Juventus. Nwa amadị a a mụrụ n'ụbọchị 5 n'afọ 1985 na-eri €30m dịka ụgwọ ọnwa n'afọ. Ronaldo bụ onye ngalaba na-achịkọta egwuregwu bọọlụ a kpọrọ Federation of International Football Association (FIFA) turu ugo ruo ugboro ise dịka onye kachasị agba bọọlụ n'uwa niile ugboro ise.

Ebe foto si, Getty Images
Gonzalo Gerardo Higuaín bụ onye ọgba bọọlụ Ajentina na Juventus a muru n'ụbọchị 10 n'ime ọnwa December n'afọ 1987 na-ana €8.5m n'afọ.

Ebe foto si, Getty Images
Paulo Bruno Exequiel Dybala bụkwa onye ọgbabọọlụ ala Argentine na Juventus na-eri €7m n'afọ. A mụrụ nwata nwoke a n'ụbọchị 15 n'ime onwa November n'afọ 1993

Ebe foto si, Getty Images
Gianluigi Donnarumma bụ ọgba bọọlụ ha mụrụ n'ụbọchị 25, ọnwa Febuwarị, afọ 1999 na-anata €6m.
Ọ bụ onye otu Serie A na kwa bụrụ onye otu mba Italy.

Ebe foto si, Getty Images
Douglas Costa de Souza bụ onye ala Brazil na-eri €6m.
A mụrụ nwa amadị a n'ụbọchị 14 n'ịme ọnwa September, afọ 1990.
Lee ka Team FA sị depụtara na Twitter na-ebute nnukwu ndọrịtaụka na Twitter ugbua.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Akụkọ ga-amasị gị










