Ronaldo adịla njikere ịgafe Juventus

Ebe foto si, Getty Images
Cristiano Ronaldo na-agbara Real Madrid bọọlụ adịla njikere ịgafe otu bọọlụ Juventus dịka Real Madrid kwuputara.
Otu bọọlụ abụọ ndị a kwekọrịtara n'ọnụ ego dị nde paụnds otu narị na ise (£105) iji hụ na Ronaldo bụ onye nọrọ afọ itoolu na Real Madrid mere njem a.
Ronaldo mabutere iko Uefa Champions League anọ mana mmekọrịta ya na onyeisi otu real Madrid bụ Florentino Perez, adịchaghị mma n'oge ya na Madrid.
N'okwu Ronaldo, "Oge abịala imepe ọgbọ ndụ ọhụrụ na ndụ m, ọ bụ ya mere m ji sị otu bọọlụ a nabata orire m."
Onye otu ya bụ Sergio Ramos kwuru etu ọ dị ya n'ahụ na Ronaldo na-apụ:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Akụkọ ndị ga-amasị gị:







