Champions League: Real Madrid na Bayern Munich bụ ndị mmeri

Cristiano Ronaldo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Cristiano Ronaldo nyere goolu nke iri anọ na otu nke afọ a n'ime asọmpi nke a

Ndị Real Madrid mewara ndị Juventus obi ka ha ji otu ọkpụ goolu gbapụ ha n'asọmpị Champions league.

N'agbanyeghị na Juventus nyere goolu atọ n'abalị ụnyaahụ, goolu atọ ndị Madrid nyere ha na be ha tinyere otu nke ụnyaahụ, mere ka ha gafee banye na ọkara-ikpeazụ.

Mana Juventus tinyere nnukwu egwu n'ime ndị Real Madrid oge Mario Mandzukic nyere goolu abụọ n'ime nkeji abụọ eji bido egwuregwu nakwa n'ime nkeji iri atọ na asaa.

Blaise Matuidi nyere goolu nke atọ.

Ọ bụ goolu Cristiano Ronaldo ji penariti nye n'ime nkeji ise etinyere ka nkeji iri itoolu (90) eji agba ya bụ egwuregwu gachara, bụ ihe nyere Real Madrid mmeri.

Arjen Robben

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'agbanyeghị na Arjen Robben bụ onye egwu ndị Bayern enyeghị goolu n'egwuregwu a, Bayern gafekwara n'ọkara-ikpeazụ

N'asọmpị ndị Bayern Munich na Sevilla ụnyaahụ, onweghị onye nyere goolu ọbụla, mana Bayern ji ọkpụ abụọ asataghị otu wee mmerie Sevilla na nchịkọta goolu ha.

Ndị otu ga-agba n'agba nke ọkara-ikpeazụ bụ Liverpool, Roma, Real Madrid na Bayern Munich.

Ogbubọọlụ Michael Oliver na onyenchebọọlụ Gianluigi Buffon

Gianluigi Buffon

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nke a bụ nke mbụ Buffon bụ onye nchebọọlụ ndị Juventus na-anara akwụkwọ nchupu n'asọmpi Champions League

Mana ọtụtụ mmadụ ka na-ekwu uche ha gbasara nchụpụ Michael Oliver chụpụrụ onye nchebọọlụ Gianluigi Buffon.

Asọmpi a bụ nke ikpeazụ Buffon dị afọ iri anọ ga-agba n'asọmpi Champions League.

Oliver nyere Buffon akwụkwọ nchụpụ maka na ọ gbara ọnụ ọjọọ gbasara mkpebi Oliver kpebiri oge o nyere Real Madrid penariti ha ji merie Juventus.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ