Zinedine Zidane ahapụla Real Madrid

Zidane

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Zidane so na ndị kachasị ritere otu egwuregwu uru na obere oge n'ụwa niile

Zinedine Zidane arituola n'ọkwa dịka onye nkụzị otu egwu bọọlụ Real Madrid.

Zidane bụ onye France (mana nne ya na nna ya sị Algeria) ritere iko mbaụwa na Champions League mgbe ọ na-agba bọọlụ nke onwe ya.

Ọ gara Real Madrid n'afọ 2016 mgbe Rafael Benitez rituru ma nyere ha aka rite iko Yurope nke 11 ha.

Mana, onweghi onye ga-ekwe na Zidane ga-emenwu ihe o mere, nke bụ ibute Champions League ugboro atọ, ma butekwa iko nke Itali akpọrọ La Liga.

Ọ bụ n'izuụka gara aga ka Madrid buru otu egwuregwu nke mbụ n'ime afọ 40 butere iko Yurope atọ n'usoro.

Mmeri a ha nwetere mere Zidane ka o soro na ndị nkụzị egwuregwu bọọlụ kachasị gbaa mbọ, ihe tụrụ n'anya makana ọ mere nka n'ime afọ atọ.

Zidane, bu onye dị afọ 45, kwuru na ya agaghị abụzị onyendụ ndị Madrid na ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ nwere tata n'ọgbọ egwuregwu ndị Madrid dị na Valdebebas na Itali.

"Ahụrụ m otu a n'anya, nakwa onyeisi ya bụ onye nyere m ohere ị rụ ọrụ ka onye ndu otu a masịrị m. Mana, ihe niile na-agbanwe bu ihe mere m jiri mee mkpebi a," O kwuru.

Florentino Perez, bu onyeisi Madrid kwuru: "Anyị atụghị anya ihe a chaa chaa nke mere taa jiri bụrụ oge akwa n'ebe mụ na ndị niile na-arụrụ otu a orụ. Mgbe ọ gwara anyị na ya ga-apụ, anyi nabatara ya."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ