Madrid mewara Juventus obi na champions League ụnyaahụ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Nkwanye ugwu Ojukwu

Ebe foto si, Getty Images
Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano na-akwado ikwanyere Dike Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ugwu n'ụzọ pụrụiche.
O kwuru na ọ ga-emezi Ojukwu Bunker nke dị n'Amorka, n'okpuru ọchịchị obodo Ihiala, ka ọ bụrụ ebe ndị mmadụ ga na-abịa njem nkiri.
Ndọtị ụtụisi

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola ka a dọtịa ụbọchị eji emecha nkwuputa maka ihe onye nwere na ụtụisi.
O kwuru ka ewega ya n'ụbọchị iri atọ (30) nke ọnwa Juun, site n'ụbọchị iri atọ na otu (31) nke ọnwa Maachị ọ kwesịbụrụ ịgwụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị
Nyocha Facebook

Ebe foto si, EPA
Mark Zuckerberg bụ onye nwe Facebook ka na-eme ọfụma n'agbanyeghị ọkụ ndị sineeti Amerịka na-akwanye ya n'ike.
Kama ịda maka mmekpa ahụ ọ nọ n'ime ya, akụnaụba ya ka na-arigo elu.
Cheta na ọ rịọrọ mgbaghara maka ịhapụ ka ndị ụlọọrụ Cambridge Analytica na ụfọdị ndị ọrụ na mba Rọshịa were Facebook mee ihe masịrị ha.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Real Madrid mewara ndị Juventus obi ka ha ji otu ọkpụ goolu gbapụ ha n'asọmpi Champions league.
N'agbanyeghị na Juventus nyere goolu atọ n'abalị ụnyaahụ, goolu atọ ndị Madrid nyere ha na be ha tinyere otu nke ụnyaahụ mere ka ha gafee ọkara-ikpeazụ.
Mana Juventus tinyere nnukwu egwu n'ime ndị Real Madrid oge Mario Mandzukic nyere goolu abụọ n'ime nkeji abụọ eji bido egwuregwu nakwa n'ime nkeji iri atọ na asaa, ebe Blaise Matuidi nyere goolu nke atọ.
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Kelechi Amadi-Obi bụ onye ose foto ama ama gwara anyị n'ime onyonyo a, ihe ị kwesiri ị ma, ma mee maọbụrụ na ị chọrọ ka ị dịka ya dika onye osefoto.











