Ronaldo enyela goolu atọ n'ime otu egwuruegwu nke 50 ya

Cristiano Ronaldo

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Cristiano Ronaldo bidoro iji bọọlụ akpata ego oge ọ dị afọ 12 ka ndị otu egwuregwu Sporting CP dị na mba Pọtụgal ji £1,500 zụta ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Cristiano Ronaldo na-agbara ndị otu Real Madrid na mba Pọtụgal bọọlụ nyere goolu atọ n'ime otu egwuregwu (hat-trick) nke ugboro 50 ya ka ha na Girona sọrọ mpi na Sụnde.

O nyere goolu anọ ka ha ji 6-3 merie Girona n'egwuregwu a mere ka ha gbagoo n'ọkwa atọ na La Liga.

Ronaldo enyela goolu 37 n'ime asọmpi niile ọ gbarala Real Madrid n'ime afọ a, tụmadụ 21 o nyere n'ime egwuregwu 11 ikpeazụ ọ gbara.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Kamgbe o jiri bido ịgba bọọlụ, Ronaldo enyerela Real Madrid goolu atọ n'ime otu egwuregwu ugboro 44, nyere ala nna ya bụ Pọtụgal ugboro ise ma nye otu oge ọ gbarala Manchester United bọọlụ.

Goolu atọ n'ime otu egwuregwu nke 50 a Ronaldo nyere ụnyaahụ mere ya nke 34 ọ na-enye na La Liga, ebe o nyerela asatọ n'asọmpi Champions League, anọ n'ime asọmpi itozu oke iko mbaụwa, abụọ n'asọmpi Copa del Rey, otu na Premier League, otu n'iko mbaụwa ndị klọb na otu n'itozu oke nke European Championship.

C.Ronaldo

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ronaldo dị afọ 33 nwere ụmụ anọ nke abụọ n'ime ha bụ ejima

Site na mgbe Ronaldo bidoro iji bọọlụ akpa ego ruo n'ọnwa Mee 2017, o jirila isi ya nye goolu ugboro 27.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ugbua a Ronaldo enyela goolu anọ n'ime otu egwuregwu ugboro itoolu kamgbe o jiri bido ịgba bọọlụ, ma nyekwa goolu ise n'ime otu egwuregwu ugboro abụọ kamgbe o bidoro iji bọọlụ akpata ego.