World Cup 2018: Kedụ ụmụntakịrị na-enwu ka kpakpando?

Ebe foto si, Getty Images
Dika Iko Mbaụwa banyere agba nke abụọ, enwela "ndị na-ọchị ndị na-akwa" nke turu uwa n'anya.
Ọtụtụ obodo bụ isi afụrụ kwawa okpụ na asompị mba ụwa ebola aka emeri n'isi.
Dịka ya bụ akwa na-ada, obodo ndị a bụ ochiedike n'egwu bọọlụ dukwa ndị otu ha ala.

Ebe foto si, Getty Images
Nke a pụtara na dịka Messi, Ronaldo, Aguero, Huigain, Lewandosky, Muller, Kroos na ndị ọzọ kwarala lii, ụmụmmbị ndị na-awapụta:
Hirving Lozano nke Mexico

Ebe foto si, Getty Images
Nwaamadị a gbara afọ 22 na-agbara PSV. Ogbaala bọọlụ ugboro atọ na Iko Mbaụwa ma nyekwa otu gọọlụ bụ nke Mexiko jiri merie ndị Jamani.
Aleksandr Sergeyevich Golovin

Ebe foto si, Getty Images
Aleksandr Sergeyevich Golovin na-agbara CSKA Moscow.
Onyekwara otu gool na Iko Mbaụwa a ma kparakwa otu mpempe akwụkwọ edoedo eji adọ ya aka na ntị maka iri-mperi n'egwu bọọlụ.
Yerry Mina

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ isi Yerry Mina nyere goolụ chụpụrụ ndị Sinigal na Iko Mbaụwa a.
Kylian Mbappé

Ebe foto si, Getty Images
Mbappe enyela goolu atọ ugbua, abụọ n'ime ha ka o ji nyụọ ndị Ajentina ịkpakwụ bụ nke e ji gbaara ha ụgbọnwamkpị n'Iko Mbaụwa a.
Akụkọ ga-amasị gị
- Ị ma mba ndị buliri iko mbaụwa kemgbe e bidoro?
- Rọshia 2018: Agaghị enwe referii Briten,Naijiria
- 'Super Eagles' ga-ebido nkwado ha na Mee









