World Cup 2018: Ihe mere Super Eagles jị pụọ

Ebe foto si, @cuneyt_cakirr
Akwa ka na-akpọtụ n'elu Soshal Midia maka mmeri Ajentina meriri Super Eagles nke Naịjirịa n'asọmpi Iko Mbaụwa ụnyaahụ.
Mana ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ gịnị mere udi ihe a ji eme ndị Super Eagles ma ọ bụ otu ndị ọzọ si na mpaghara Afrịka?
Ugbu a, ọ bụ naanị otu bọọlụ Senegal ka fọrọ n'asọmpi Iko Mbaụwa.
Cheta na kemgbe amalitere asọmpi Iko Mbaụwa, onwebeghi mba si mpaghara Afrịka rurula agba nke anọ n'asọmpi a.
Gịnị butere udi ihe a? Gụọ ihe ndị mmadụ na-ekwu.
Egwuregwu bọọlụ abụghị nke anyị

Ebe foto si, Blessing Nwosu facebook
Blessing Nwosu bụ onye ama ama dịka onye na-apụta n'ime ihe nkiri gbasara egwuregwu bọọlụ kọwara na ha na-agbapụ otu si mpaghara Afirika n'asọmpị iko mbaụwa na-afịa makana egwuregwu bọọlụ abụghị ihe si n'aka anyị pụta.
Nwosu kwukwara na "Ọ bụrụ na i lee anya ka ndị Afrịka si agba bọọlụ nke ha, i ga-ahụ na ha chọrọ ịgba ka ndị ọcha sị agba bọọlụ nke ha."
Ọ kọwara na ihe a mere ike na-apụ ha n'arụ tupu ha gbachasịa.
Nsogbu anyi bụ nkpa ịkpa bọọlụ

Ebe foto si, Kenneth Umerie facebook
Mana nwata nwoke aha ya bụ Kenneth Umerie ekweteghị n'ihe Nwosu kwuru.
Ọ gwara anyị na, nsogbu anyị abụghị na anyi bụ ndị Afrika, cheta na etuola nwoke aha bụ Samuel Eto sị mba Ghana ugo dịka onye kachasị agba bọọlụ nke onye atọ na mba ụwa niile n'afọ 2005. Nsogbu anyị bu na anyị enweghị ezigbo nkpa ịkpa bọọlụ.
Ọ bụ ndị agadi nwoke na-agba bọọlụ n'Afirika

Ebe foto si, Steve Mbonu facebook
Stephen Mbonu bụkwa onye ọzọ na-akwadọ bọọlụ kwete n'ihe Umeruo kwuru. N'uche ya, mmeri ha na-emeri ndị otu Afirika bụ makana ọtụtụ ndị egwuregwu anyi anaghị ekwu ezi okwu gbasara afọ ha ji mụ ha.
Mbonu kwukwara n'egwuregwu bọọlụ, ịnaghị eji onye dị afọ iri abụọ tunyere onye dị afọ iri atọ. Ihe a kwesiri ị kwụsị kpam kpam n'egwuregwu anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-emeri ndị ọcha n'asọmpị iko mba ụwa.
Onye ọzọ aha ya bụ Nnamdi Nwosu kwuru na ihe anyị kwesiri na-eme ugbua bu ịchọpụta onye ga-elebaanya nkpa ịkpa ịgba bọọlụ.
Nwosu kwuru na onye a bụ onye kwesiri ị nwere ọtụtụ ahụmahụ na nchikọta ịgba bọọlụ.
Blessing Nwosu kwekwara na nke a. O kwuru na anyi kwesiri ibido ịhọpụta ndị ọhụrụ ga bụ ndị ọgba bọọlụ Afirika n'ihu.
Amaghị m ihe mmere enyeghị m Naịjirịa penariti ahụ - Ogbubọọlụ
Aha ya bụ Cuneyt Cakirr sị mba Tọkị.
N'elu na twitter na Instagram ndị mmadụ na-akpọ ya iyi makana ọnyeghị penariti. Nke a bụ nke mbụ ndị Naijiria chakwasị onye ogbu bọọlụ otua, na-akpọya iyi dị iche iche.
Onye ọgba bọọlụ Super Eagles bụ Mikel Obi kwuru na mgbe agbachara asọmpị ahụ, Cakirr kwuru na ya-aghọtaghị ihe mere o nyeghị Naijirịa ohere ịgba penariti ahụ.

Ebe foto si, @cuneyt_cakirr
Super Eagles ji obi ngbawa alaghachịta Naịjirịa










