Daalụ nụ maka ịnọnyere anyị
Anyị ekele gị maka isonyere anyị na mgbasa ozi a.
Sonyekwara anyị na nke Abia steeti n'abalị 25 ọnwa Jenuwarị, 2019.
Ya gazie.
Ndị na-azọ ọchịchi gọvanọ n'Imo na-eme nrụrịtaụka n'Owere taa
Chimezie UcheAgbo and Chiagozie Nwonwu
Anyị ekele gị maka isonyere anyị na mgbasa ozi a.
Sonyekwara anyị na nke Abia steeti n'abalị 25 ọnwa Jenuwarị, 2019.
Ya gazie.

Kerịe ya ebe a:
"Okwu Biafra bụ okwu mmepe obodo. A ga-anọkọ wee kpa ya bu ihe.” - Uche Nwosu


"Arụtụbeghị m ọrụ gọọmentị" - Onye bịara nrụrịtra ụka

"Ndị ọrụsi ga-erite erere na ọchịchị m." Uche Nwosu

"A bụ m onye gbaworo mgbọrọgwụ n'ihe gbasara ọchịchị." - Uche Nwosu
#BBCGovDebate, #BBCIgboDebate
Uche Nwosu na-agọrọ isi onwe ya sị n'ebubo ahụ eboro ya na ọ na-anara ndị mmadụ ala ha wee sị na nke ahụ abụghị ezịokwu.

Maazị Nwosu kwuru Ihe dị iche iche ọ ga emere ndị Imo gunyere Ịgụ akwụkwọ n'efu.
#BBCGovDebate, #BBCIgboDebate

Nwantịntị oge, anyị amalite.


Onye na-azọ ọchịchị n'okpuruAction Alliance bụ Uche Nwosu abatara n’ụlọ nrụrịta ụka anyi.
Anyị na-eche ndị ọzọ.

Unu ma na ọjị adịghị asụ Bekee!
#BBCGovDebate, #BBCIgboDebate

Ndị anyị ji maka ha nọdụ ebe a nọ nso
#BBCGovDebate, #BBCIgboDebate

Lee ụmụ Igbo na-ekwu obi ha gbasara ajụjụ ha chọrọ ka ndị ga-esonye ndọrịtaụka maka ịzọ ọkwa gọvanọ nke BBC Igbo na-ahazi.
#BBCGovDebate #BBCIgboDebate
Ndị uweojii na ndị nchekwa ọzọ nọkwa ebe a ịhụ na ihe gara nke ọma.
#BBCGovDebate #BBCIgboDebate


Ebe foto si, b
#BBCGovDebate, #BBCIgboDebate
