Ọgụ Izzi na Ukelle: Lee ihe onye ntaakụkọ BBC hụrụ

Aha onyonyo, Onye nta akụkọ BBC banyere na ọgbọ ọgụ ndị Izzi na Ukelle. kirie ihe ọ hụrụ

Ndụ adịghị n'Igbeagụ dị n'Ebonyi steeti ebe ndị obodo ahụ eleghi anya n'azụ wee gbaa ọsọ ndụ hapụ ụlọ ha, ụlọakwụkwọ, ahịa na ihe niile ha nwere.Ha gbagara obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu maka ụjọ na ndị Ukelle ha na ha nwere nsogbu nwere ike ịbịa ọgụ.

Ọtụtụ ahịa dị icheiche na ụlọakwụkwọ dị n'Ochafu, Amuzu, Eteguideigwe bụ nke ndị mmadụ hapụrụ gbaa ọsọ ndụ.

Map

Ọtụtụ ụmụokoroọbịa na ya bụ Izzi zukọrọ ebe dị icheiche kwuru na ha agaghị ezu ike ganye na ha abọ ọbọ ndị e gburu.

Ndị na-agba ọsọ
Nkọwa foto, Ndị mmadụ bu akpa ha agbapụ ọzọ agbaga obodo ndị ọzọ
Ahịa
Nkọwa foto, Ahịa tọgbọrọ chakoo

Ha kwukwara na ha na-achọ ihe karịrị mmadụ otu narị ndị ahụbeghi ozu ha.

Onye Eze na-achị Izzi bụ Eze Michael Ukwa kọwara na nsogbu ahụ dị n'etịtị ha na ndị Ukelle dị na Kross 'Riva bụ ala dị n'ikpere mmiri dị n'oke ala ka a na-azọ.

Ndị mmadụ agbafuola n'ụlọ ha
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ agbafuola n'ụlọ ha maka ọgụ a

O kwuru na esemokwu ahụ malitere kamgbe afọ 2005.

Eze Ukwa kwara arịrị na ya onwe ya nọ na nsogbu maka na ya gwara ndị ntoroọbịa obodo ya agala ọgụ.

Ahịa
Ụlọ a hapụrụ

Ndị ọrụ agha na ndị uweojii anọchiela obodo abụọ ahụ na-alụ ọgụ.

N'okporouzọ awara awara si Abakaliki aga Ogoja, ndị ọrụ nchekwa ahụ ji oke osisi gbachisịa ụzọ iji gbochie ndị Ukelle ịbata n'Izzi ma kwụsịkwa ndị Izzi ibanye n'Ukelle.

Obodo Izzi dị n'Ebonyi
Nkọwa foto, E ji ihe gbochie okporoụzọ

Mgbe BBC batara n'ime obodo ahụ, ọgụ ahụ ka na-ada bụ na Ndịalobo dị n'Izzi, ụmụokorobịa karịrị mmadụ ịrị anọ gbachiri ụzọ n'ahịa eke Ndịalobo, ma jụ inye BBC ohere ibanye ebe ha gbara ụlọ ọkụ.

Mbata obodo Ndịalobo

BBC Igbo laghachịrị azụ wee chọọ isi n'ụzọ awara awara banye, mana ụmụokorobịa obodo ahụ chụrụ ha ọsọ.

Ndị uweojii ahụ gbachiri ụzọ n'oke ala Krọs Riva na Ebonyi, bịazịrị nyere ndị ntaakụkọ BBC aka ịgba ọsọndụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ