Ụlọoriri dị na Lagos etiela onye ntaakụkọ BBC ihe, kpachie ngwaọrụ ya

Nke a na-abịa site n'ihe mere n'abalị ụnyaahụ ka ndị na-arụ ọrụ n'ụlọoriri na nkwari Blue Ivy dị na Legọs wakporo onye ntaakụkọ BBC Igbo.
Chris Okereke bụ onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ ịgba Godwin Opara bụ otiegwu a ma ama dịka 'Kabaka' ajụjụọnụ, oge ndị na-arụ ebe ahụ wakporo ya, tie ya ihe ma kpachie ngwaọrụ niile o ji gaa.
Onye na-ahaziri Kabaka ihe bụ Solomon Chidubem na BBC Igbo nwere nkwekọrịta na ha ga-abịa ịgba ya ajụjụọnụ ebe ọ ga-anọ tie egwu n'ụlọoriri ahụ.
Nke a bụ ugboro atọ ụdịrị ihe a na-eme onye ntaakụkọ BBC n'ime ihe na-erughị ọnwa anọ. BBC na-ekwu ka mwakpo a na-eme ndị ọrụ ya kwụsị, ma na-ekwu ka ndị na-ebuso ndị ntaakụkọ agha taa ahụhụ dị na ya.
Dịka onye ntaakụkọ BBC siri kwuo, oge o rutere n'ụlọoriri ahụ, otu nwoke ọ na-amaghị gwara ya na ọ gaghị agbanwu Kabaka ajụjụ ọnụ ruo oge ọ ga-eticha egwu ọ bịara iti.
Okereke kwuru na ọ tụgharịrị ka ọ lawa mana Chidubem kpọrọ ya n'ekwentị, gwa ya na ọ na-enye ya nkeji ise ka o ji gbaa ajụjụọnụ a.
Okereke kwuru "Kabaka kpọgara m n'ọnụụlọ ya maka ịgba ajụjụ ọnụ a, mana ka m chọrọ ịgba ya ajụjụọnụ nke ikpeazụ, otu nwoke gbabatara n'ime ọnụụlọ ahụ bido iti m ihe. Ọ nọ na-eti mkpụ na ọ gwara m agbala Kabaka ajụjụ ọnụ, ọ mara m ezigbo ụra n'ihu mana maka ejim kamera m, enweghị m ike ikpuchite onwe m.
Ọ kụrụ m ihe tinka kụrụ pan ma ndị 'bouncer' ya tinyekwara aka tie m ihe."

Okereke kwuru na ndị ụlọoriri ahụ tiri ya ihe ma kwapụ ya n'ezi, mana o nwere ohere bute kamera ya na-ebutenwughị ngwaọrụ ndị ọzọ, bunye ya Chidubem ka o bunye onye ụgbọala Taxify na-eche ya.
"Ọkwọ ụgbọala ahụ chọrọ ịnyapụ mana ha kwụsịrị ya ma kpachie ụgbọala ya na ihe dị ya n'ime. Ụgbọala ahụ na ngwaọrụ ahụ ka nọ n'ụlọoriri ahụ," Okereke tinyekwuru.
Ọkwọ ụgbọala ahụ gbara ọsọndụ ya.
BBC na Kabaka kwuru, ebe ọ gwara anyị na n'agbanyeghị biko niile ọ rịọrọ, ha kụrụla Okereke gawa.
"Anyị na-achọ ịgba na ịza ajụjụọnụ oge otu nwoke batara, ghasasịa anyị ma bido iti onye ntaakụkọ ihe. E bidoro m rịọwa ya arịrịọ mana ọ nọ na-achọ iti onye ọbụla nọ ebe ahụ ihe."
Mgbe BBC kpọtụrụ ụlọoriri ahụ, ndị na-arụ ebe ahụ kwuru na Okereke ji otiegwu ha kwụrụ ụgwọ eji, na-agba ya ajụjụọnụ na-anataghị ha ikike.
Otu onye na-arụ n'ụlọoriri ahụ jụrụ ikwupute aha ya gọrọ agọ na awakpoghị Okereke ma kpachie ngwaọrụ BBC.
Mana, onyeisioche ụlọọrụ kpọtara Kabaka Legọs bụ Nicholas Orji, kwuru na ndị ụlọoriri ahụ gwara ya na ha kpachiri ngwaọrụ BBC maka na onye ntaakụkọ ahụ gbochiri otiegwu ahụ ime ihe ha kpọtara ya ka o mee.
E kpesala akụkọ a n'aka ndị uweojii Legọs.










