Plateau: Lee ndị nwụrụ kemgbe ọgbaghara 2018 bidoro

Ụmụnwaanyị na-eru ụjụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị agha nwụrụ na nsogbu a

Ọgụ dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụụgbo na mpaghara ndị nọ n'etiti Naịjirịa e teela aka ọ na-aga.

Mana ọ dịka nke afọ 2018 a pụrụiche n'ihi na ọ chịrịla ndụ ihe ruru mmadụ otu puku ọkachasị ndị nọ n'okpuru ọchịchị Bassa .

Lee ndị nwụrụ na nsogbu a na mgbe ha jiri nwụọ kemgbe afọ 2018.

Jenụwarị 14 - otu onye nwụrụ, otu onye merụrụ ahụ n'ime obodo Dundu-Maiyanga na Bassa LGA

Jenụwarị 20 - otu onye nwụrụ na Barkin Ladi.

Jenụwarị 22 - otu onyw nwụrụ na ọdịda Jos.

Jenụwarị 24 - mmadụ asatọ nwụrụ na Bokkos.

Jenụwarị 25 - mmadụ isii nwụrụ na Bassa.

Jenụwarị 26 - mmadụ atọ nwụrụ na Bassa.

Jenụwarị 28 - mmadụ abụọ nwụrụ na Bassa.

Febụrụwarị 5 - mmadụ 75 nwụrụ na Bassa LGA, Plateau steeti

Febụrụwarị 10 - mmadụ atọ nwụrụ na Bassa.

Eserese na-egosi obodo ebe ọgụ nke ụnyahụ metụtara na Platu.
Nkọwa foto, Eserese na-egosi obodo ebe ọgụ nke ụnyahụ metụtara na Platu.

Maachị 5 - otu onye nwụrụ na Rafin-Bauna Bassa LGA.

Maachị 8 - mmadụ 11 nwụrụ na Bassa.

Maachị 11 - mmadụ ise nwụrụ na Bokkos.

Maachị 12 - mmadụ 26 nwụrụ na Bassa.

Maachị 13 - mmadụ 25 nwụrụ n'ime obodo Dundu na Bassa LGA.

Maachị 14 - mmadụ anọ (ndị agha Naịjirịa ) nwụrụ na Miangọ.

Maachị 22 - mmadụ atọ nwụrụ na ndịda Jọs.

Eprelu l 8 - mmadụ ise nwụrụ, mmadụ atọ merụọ ahụ na Barkin Ladi.

Eprelu 13 - mmadụ ise nwụrụ na Bassa.

Eprelu 18 - mmadụ anọ nwụrụ na Bassa.

Juun 24 - mmadụ 86 nwụrụ na Gashish na Ropp.

Akara ntụ-ntụ
Akara ntụ-ntụ