Buhari na-arịọ ka udo dị na Plateau steeti

Ebe foto si, AFP
Muhammadu Buhari rịọrọ arịrịọ site n'akara soshal midia ya n'abalị ụnyaahụ ka okwu gbasara ogbugbu mmadụ na Plateau steeti biri ọkụ.
O kwuru na ndị agha na ndị uweojii kwudosiri ike inye gọvanọ na-achị steeti ahụ enyemaka n'ihe gbasara nchekwa ndụ ndị mmadụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
"Anyị ga-agba mbo ịhụ na a nwụchiri ndị mere ihe a, iji gbochie ya ime ọzọ" bụ ihe o depụtara na Twitter ụnyaahụ.
Ndị uweojii ekwuola na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe a bụ iri asatọ na isii mana ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o ruru narị abụọ.
Mkpa mkpa a bidoro kemgbe ụbọchị Tọzde mgbe ndị ọchịehi na ndị ọrụụgbo malitere ịlụ ọgụ maka ogbugbu e gburu ndị ọchịehi ise.

Ebe foto si, Getty Images
Ka o ruru ụnyaahụ, ọgụ ahụ agbasala rue ụfọdụ obodo ndị ọzọ dịka Riyom, Barkin Ladi, Gashish na Ropp.
Ya mere gọọmentị jiri tinye iwu ọnọdụ apụla ezi bụ site n'elekere isii nke mgbede rue elekere isii nke ụtụtụ kwa ụbọchị.






