Otu jikotara ndị ụka bụ CAN ebidola ngaghari iwe ha taa

Ndi otu ụka Krist

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu jikoro ndị na-ekpe ụka Kraịst na Naịjirịa a kpọrọ Christian Association of Nigeria (CAN) na bekee na-eme ngagharị iwe taa maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa na ọtụtụ ndị mmadụ e gburu na Benue steeti na steeti ndị ọzọ na mpaghara ugwu Awụsa.

Cheta na CAN kwuru n'ụbọchị Fraide garaaga na ha ga-eme ngagharị iwe ahụ taa bụ ubọchị uka n'ụlọụka niile n'ala Naịjirịa.

Ngagharị iwe a bu maka ndị ụkọchukwu abụọ na mmadụ iri na isi ndị ọzọ ndị ọchịehi jiri egbe gbuo na Benue steeti ụbọchị 25 ọnwa Epureel.

Otu nwoke aha ya bụ Oluyemi Fasipe weputara ihe nkiri a na twitter gosi nghagharị iwe CAN mere n'Ondo steeti taa.

O kwuru na ha mere ngagharị iwe a n'ihu ụlọọrụ gọvanọ steeti ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Onye ọzọ aha yabụ Easy Akins weputara ihe nkiri nke ya gọsị ndị ụlọakwụkwọ so kwa na ngagharị iwe CAN taa. O kwuru na ogbugbu mmadụ a kwesịrị ịkwụsị kpam kpam.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mana ọtụtụ ụlọụka na Naịjirịa esonyeghị na ngagharị iwe nke taa dịka CAN siri kwu.

Oge BBC Igbo kpọrọ onye ode akwụkwọ otu CAN aha ya bụ Musa Asaki maka ihe a, o kwuru na ọtụtụ ụlọụka esonyeghị na ngagharị iwe a maka na ekwughị maka ya bụ ngagharị iwe n'oge ya mere ọtụtụ.

N'okwu ya: "Anyị ga-eme ngagharị iwe ọzọ n'ụbọchị ụka n'abia. Anyị nwere olileanya na oge ahụ, ọtụtụ ụlọụka ga-eso anyị na ngagharị iwe anyị.

Uru ọ dị na ngagharị iwe a

Asaki kwuru na o nweghị ihe ọnye ọbụla nwere ike ịme n'oge ọchịchị gọọmentị a ga-adị iche maọbụ ga-amịta uru.

"Anyị na-eme nghagharị iwe a, makana sọọsọ ọlụ anyị bụ ike anyị ugbua. Ka chukwu nna mmere anyị ebere".

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị: