Saudi Arabia News: Ihe 5 ụmụnwaanyị Igbo na-eme ndị Saudi Arabia anaghị emenwu

Ụmụnwaanyị Igbo na ndị Sawudi Arebia

Ebe foto si, Getty Images

Mohammed bin Salman bụ onye ọchịchị mba Sawudi Arebia ka na-aga n'ihu ime ụmụnwaanyị mba ya obi ọma dịka ha na-ebuli ọtụtụ iwu e jibu machie ha.

N'ụbọchị Fraịdee, ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọst 2019, e wepụtara iwu ọhụrụ nyere ha ohere ime ụfọdụ ihe ha anaghị emebu.

Ihe ndị a gụnyere ime njem si na mba fere na mba na-ebughi ụzọ nata nwoke ọbụla ikike, ịgba alụkwaghịm, iji aka ha tinye akwụkwọ maka nwa ọhụrụ a mụrụ, alụmdinanwunye nakwa ihe ndị ọzọ.

Mana ị ma na e nwere ihe ole na ole ụmụnwaanyị Igbo nwere ohere ime ndị nke si Sawudi Arebia agaghị emenwu?

Mba Sawudi Arebia bụ mba ndị alakụba kachasị, nke mere na ha nwere ụfọdụ iwu ndị machiri ụmụnwaanyị ha ime ihe ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ na gburugburu ụwa na-emenwu.

Ọtụtụ n'ime ihe na-anaghị eru ha aka maka na a napụrụ ha ikike iji mee ya, bụ ihe ndị ụmụnwaanyị Igbo na-emecha tinye 'jara'.

N'etiti ụmụnwaanyị Igbo na ndị Sawudi Arebia

BBC Igbo na-atụnyere ihe dị iche n'etiti ndụ ụmụnwaanyị Igbo na ụmụnwaanyị ndị Sawudi Arebia.

1. Ime njem

Akwụkwọ e ji eme njem

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ ụmụnwaanyị Igbo na-eme njem etu ọ masịrị ha, mana ọ dịbughi etu ahụ nye ụmụnwaanyị Sawudi Arebia.

Tupu e bulie iwu e buliri n'ọnwa Ọgọst 2019, nwaanyị anaghị eme njem na mba ahụ maọbụghị ma nwoke 'a ga-emere ya mkpebi', kwenye na ọ ga-aga.

Tupu nwaanyị enwetakwa akwụkwọ ikike e ji eme ya bụ njem nke Bekee kpọrọ 'passport', nwoke (nwere ike ịbụdị ma onye ọ tọrọ atọ) ga-ekwenyekwa.

2. Ịnya ụgbọala:

Ụmụnwaanyị Sawudi Arebia

Ebe foto si, Getty Images

Tupu Juun 24 2018 eruo, iwu machiri ụmụnwaanyị Sawudi Arebia ịnya ụgbọala n'obodo ha. Mana ụmụnwaanyị Igbo ịnya ụgbọala abụghị ihe ọhụrụ.

Ụfọdụ n'ime ha, ọ bụ di ha na-azụtara ha ụgbọala iji gosipụta ọkwa ha ma mee "ị makwa ndị anyị bụ" ma ha zute ibe ha.

3. Iyi uwe masịrị ha:

Ụdịrị akwa ha na-eyi

Ebe foto si, BBC/getty images

Nkọwa foto, Mgbe gboo, ụmụnwaanyị Igbo na-ama akwa n'obi mana ekwesịghị ịhụ obi na olu ụmụnwaanyị Sawudi Arebia anya

Ebe ụmụnwaanyị Igbo nwere ike iyi ihe ọbụla masịrị ha ma ọ bụrụhaala na ha agbaghị ọtọ, ọ dịrịghị ndị nke Sawudi Arebia etu ahụ.

Ruo echi, iwu ka machibidoro ha iyi uwe ga-egosi ụkwụ ha.

Ụfọdụ, a gaghị ahụ ntutuisi ha anya, ebe ụfọdụ na-ekpuchi ahụ ha niile hapụ naanị anya ha.

Ha nwere uwe a na-akpọ "abaya" ha na-eyikarị maka nke a.

4. Nwoke na nwanyị ịnọkọ

Nwoke na nwaanyị ịnọkọ ọnụ

Ebe foto si, AFP

Ebe ụmụnwaanyị Igbo na ụmụnwoke nwere ike ịnọ ebe masịrị ha na etu masịrị ha, iwu machibidoro ụmụnwaanyị Sawudi ime etu ahụ.

E wepụ izute n'ụlọọgwụ, ụlọakụ na ụlọakwụkwọ ebe a na-amụ maka nlekọta na ahụike, iwu machiri ha na nwoke ịnọkọ.

Nsonso a ka e bidoro ịhapụ ụmụnwaanyị ịbata n'ogige egwuregwu nke Bekee kpọrọ "stadium" dị n'obodo Dammam, Jeddah na Riyadh dị na mba ahụ.

5. Inweta akara ụlọakụ

Ụmụnwaanyị Sawudi Arebia

Ebe foto si, AFP

A bịa n'ala Igbo, ụmụnwaanyị nwere ihe Bekee kpọrọ "account" n'ụlọakụ.

Ọtụtụ nwere ihe karịrị otu, mana ọ dịrịghị ụmụnwaanyị ibe ha na Sawudi mfe etu a.

Tupu ị nweta akara ụlọakụ, nwoke na-emere gị mkpebi nke bekee kpọrọ "guardian", site n'iso gị aga maọbụ ide akwụkwọ nkwenye.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị:

Aha onyonyo, Gịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?