Modern woman: Iyi mbenukwu na ihe ndị ọzọ ha na-eme ọtụtụ nne anyị emeghi

Ụmụnwaanyị na-asụ n'odo. Nwaanyị yi chebiriọdụ

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ ihe anyị na-emebu na mbụ, anyi adịghịzị eme ha, ụfọdụ ihe anyi adịghị emebu, anyi na-emezi.

Ụwa na-eme mgbanwe kwa mgbe.

Ụmụnwaanyị agbanahụghị mgbanwe nke a.

O nwere ụfọdụ ihe ụmụnwaanyị mebukwara ma ha akwụsịghị ike na ya, ma ugbua, ha na-eme ihe ndị ahụ ka ha siri chọ.

Ilezie anya nke ọma, ị ga ebido chọputawa ụfọdụ ihe anyị ga-edepụta n'okpuru edemede a.

  • Ọ na-azụ ahịa n'ịntanet
nwaanyị na-azụ ahị na ụmụnwaanyị ele kọmputa

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ ụmụnwaanyị adịghịzị aga ahịa ịzụta akwa maọbụ ihe nri maka onyekwanụ chọrọ ịkwụ n'anwụ ebe ihe niile dịzị na ịnternet?

Ọ bụkwa ọ setịpụ ụkwụ n'ụlọ ya, ọ pịa kọmputa maọbụ ekwentị, e wetere ya ihe niile ọ chọrọ ebe ọbụla ọ nọ.

  • Ọ na-eyi agwa ntutu na-apụ ọkụ
Nwaanyị ji ekwentị ese photo na nwaanyị yi agwa isi ọbara ọbara

Ebe foto si, Getty Images

N'oge mbụ, ụmụnwaanyị na-eke isi dị iche iche, kama na ọ na-abụkarị isi ojii

Mana ugbua, ha na-anwale ụdị agwa sọrọ ha, site na isi na-acha ọbara ọbara ruo na nke na-acha edo edo, ha achọghị ịma.

  • Ha na-eme oriri na nkwari ka o si dị ha mma
Ụmụnwaanyị na-eme nkwari

Ebe foto si, Getty Images

Oge agaala mgbe nwaanyị ga-anọ n'ụlọ, nwoke apụo inwete onwe ya naanị ya.

Ugbua, ụmụnwanyị na-akpọrọ ndị enyi ha puo ebe ọ na-akpọtụ, na-enwe anụrị.

  • Ọ naghị ama akwa, ọ na-eyi chebiriọdụ anọ n'ulọ
Ụmụnwaanyị na-asụ n'odo. Nwaanyị yi chebiriọdụ

Ebe foto si, Getty Images

Anyi ahapụla ima akwa na '19 kporogodom'

Oge ima akwa n'obi nọrọ n'ụlọ agafeela.

Ugbua ụmụnwaanyị na-eyi chebiriọdụ dị iche iche.

I yitekwaraala ihe ndị Bekee kpọrọ 'bum short', anyi amara n'iso na ihe a na-eme.

  • Ọ na-ewepụta oge eji eme soshal media
Ụmụnwaanyị na-ele ekwentị ha na amụ amụ

Ebe foto si, Getty Images

Teknụzụ emeela na onye ọbụla nọ n'ụwa nwere ike ijikọ

Nwaanyị agba ọhụrụ ga-akwado, n'eti ka ọnwa, see onwe ya foto, tinye ya n'akara soshal midia ya.

Oge adighi.

  • Ọ na-ete ntecha etu o siri masị ya
Nwaanyị na-etecha ntecha

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụnwaanyị dịbu na mbu ete ntecha, kama ugbua, e nwezịrị agwa dị iche iche

Ndị bekee agbanweela ntecha, ya bụ na ọ bụzị ihe a na-amụ amụ tupu emebe.

Ụmụnwaanyị agba ọhụrụ ejighị ihe Bekee kpọrọ 'makeup' egwu egwu.

Ha chọrọ ịdị ka a chọrọ oge niile.

  • O nwere onwe ya
Nwaanyị na-ede akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụnwaanyị na-arụbụ ọrụ na mbụ, mana o nwere ụfọdụ ọrụ ha anaghị arụ.

Nwaanyị agba ọhụrụ kwetara na ihe nwoke ga-emeli, nwaanyị ga-emelikwa ya karịa.

Ya bụ na ọ na-arụ ọrụ ọbụla masịrị ya, nwee ego nke ya o ji eledo onwe ya na ezinụlọ ya anya.

Akụkọ ga-amasị gị: