ASUU strike: Ihe mere ụmụakwụkwọ mahadum anaghị agụcha n'oge

Ebe foto si, Getty Images
Olamide Tejuoso eteela o lewere anya mmalite 2019.
Ọ tụrụ anya na ọ ga-agụcha akwụkwọ, bido ịmụ ọrụ ebe a ga-akwụ ya ụgwo n'ụlọọrụ mgbasaozi.
Nke a bụ ụzọ nke mbụ n'ịhụ na o mepụtara ebumnobi ya ịbụ onye ode akwụkwọ ka ọ gụchara afọ anọ na mahadum nke Ibadan.
Mana kama aṅụrị, nwata akwụkwọ a na-amụ maka ọrụ mgbasa ozi nwere obi nkụda maka abụbọ ọrụ ndị Asuu na-eme.
Ụmụakwụkwọ na mahadum gọọmentị steeti ebidobeghị akwụkwọ n'ihi abụbọ ọrụ ebighi ebi ndị nkuzi bidoro.

Ebe foto si, Modibbo Adama University of Technology Yola
Ngalaba na-elekọta ndị nkuzi mahadum ebola gọọmentị ebubo na ha adaala mba na nkwenye ha na ha nwere gbasara mgbanwe agụmakwụkwọ mahadum.
Ha gbara abụbọ ọrụ maka enweghị akụrụngwa, ụkọ ego na kepu kepu ha na-anụ maka iweli ego ụgwọ akwụkwọ.
Ndị Asuu na gọọmentị etiti nwere nzukọ ụbọchị Mọnde ebe mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige kwuru na pati abụọ ahụ ekwekọritala.
Gọọmentị kwere nkwa ịtọhapụ ijeri naira iri na ise (15.4bn) n'ọma maka nhazi mahadum nke ọha.

Ebe foto si, Getty Images
O kwukwara na onyeisiala Muhammadu Buhari akwadola ijeri naira iri abụọ a ga-akwu ndị nkuzi mahadum n'ugwọ e ji ha bido n'afọ 2009 ruo 2012.
Onyeisi ndị Asuu bụ Biodun Ogunyemi kwuru na ha ka ga-ekwekọrịta n'etiti ha maka ikwụsị igba abụbọ ọrụ, nke tinyere ndị mahadum gọọmenti ruru otu nde n'ọma na gbagharịa.

Ebe foto si, Getty Images
Mana nwata akwụkwọ Tejuoso kwuru na dika onye nọ n'agba ikpeazụ na Mahadum, na obi na-agbawa ya n'ihi na ihe niile ọ haziri ime enweghị nke na-abịa na mmezu ugbua.
N'okwu ya, "Ekwesiri m ịpụta na mahadum n'ọnwa Disemba 2018 mana maka abụbọ ọrụ a, o nweghị ihe nwereike ime."
"Anyị nọ n'ụjọ makana anyị amaghị mgbe ihe a ga-ebi".
Onye sokwa bụrụ onyeisi ndị ọrụ a kpọrọ Ọkammụta Ogunyemi kwuru na abụbọ ọrụ a bụ maka ichekwa ọdịnihu mahadum nakwa nke ụmụakwụkwọ.
Otu ihe ndị otu ọrụ a na-arịọ bụ ka gọọmentị etiti mezuo nkwa ha kwere na mbụ ma nye ha ego ruru otu tarị naịra iji ghazigharịa mahadum dị icheiche.

Ebe foto si, iStock
Etu ọ dị ugbua, gọọmentị etiti na-ewepụta ego ruru Ijeri nari naira isii maka ngalaba agụmakwụkwọ.
Mahadum nke gọọmentị etiti na-eketa Ijeri narị naịra abụọ n'ọma n'ime ego e kepụtara maka bọjeti 2018.
Ihe a ga-eme ya abụbọ ọrụ nke abụọ kamgbe onyeisiala Buhari banyechara ọchịchị n'afọ 2015.
Asuu na-agbakarị abụbọ ọrụ kamgbe Naijirịa banyere ọchịchị onyekwuo uche ya.
N'agbanyeghị nsogbu abụbọ ọrụ a buterela, ndị dịka Lydia Agu Uka, o kwenyere n'ihe kpatara e ji malite abụbọ ọrụ a.
Ọ bụzi Asuu ka a na-eche ka ha kweta n'ihe gọọmenti kpebiri ma kwụsị abụbọ ọrụ a.
Ka ndị dịka Tejuosho na Agu Uka na-ekwu na ha nwere olileanya n'okwu a ga-enwe isi, e kwere nkwa na ọ bụrụ na a kpachaghị anya, na abụbọ ọrụ ga-abụ ihe a ga na-ahụ n'ime agụmaakwụkwọ Naịjirịa.
Akụkụ ndị ga-amasị gị:









