Ọkụ agbagbuola ụmụaka atọ nne ha hapụrụ n'ụlọ
Akụkọ dị mkpa
Ọkụ agbaala ụmụaka atọ nne hapụrụ n'ụlọ

Ebe foto si, Anambra Police
Ọkụ gbara n'ọdọahịa nakwa ụlọ dị nso High Tension Road, Ugwuagba-Obosi n'Anambara steeti ụbọchị Tọọzde ataala isi ụmụaka atọ otu nne ji.
Ozi sị n' aka ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na nne ha bụ Blessing Okafor anọghị n'ụlọ oge ọkụ bidoro ma gbagrie ụmụ ya ;Chimerie, nwa nwoke dị afọ ise; Onyedika nwa nwoke dị afọ anọ nakwa Esther, nwa nwaanyị dị afọ atọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed onye kwuru na amabeghị ihe butere ọkụ ahụ kwuru na e bugala ozu ndị ahụ gbariri agbari ụlọozu Bex Hospital maka nyocha.
2019: Ohanaeze Ndigbo akwadobeghị onye ọbụla

Ebe foto si, @atiku
Onyeisi ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo bụ Kingsley Dozie ekwuola na onwebeghi onye ọbụla Ohanaeze Ndigbo dọnyere ukwu na ntuliaka afọ 2019.
Dozie kwuru na njem ha mere n'Aso Rock bụ ịza oku onyeisiala Muhammadu Buhari kpọrọ ha maka mkparịta ụka maka ọdị mma Ndigbo.
Ọ gara n'ihu kwuo na onye Ohanaeze ga-akwado bụ onye ga-enye ndị Igbo ọchịchị n'afọ 2023.
NAssarawa PDP Rally: Secondus agwaala Buhari ka ọ pụta bịa gwa ụmụ Naijiria ihe o mepụtara

Ebe foto si, Ike Abonyi
Onyeisioche otu PDP na Naijiria bụ uche Secondus akọọla onyeisiala muhammadu Buhari oku ka ọpụta jiri ọnụ ya gwa ndị Naijiria ihe o mere ha.
Secondus kwuru nke n'ọgbakọ achumnta vootu pati ya mere na Lafia Square dị na Nassarawa steeti. Ọ dọọ Inec aka na ntị sị na inwogharị ebunobi ndị ụmụ Naijiria na ntuliaka na-abịa ga-ebute ọgbaghara.
Jamb: Etu ị ga-esi debanye aha gị

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ gọọmenti na-ahụ maka ule ịbanye mahadum ekwupụtala na oge ịgba akwụkwọ ule ahụ eruola.
Ha kọwapụtakwara ụzọ ụmụakwụkwọ ga-esi debanye aha n'akwụkwọ maka ule ahụ n'ozi ha wepụtara n'igwe okwu Twitter ha.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, onye chọrọ so lee ule Jamb ga-ebu ụzọ ziga aha ya(aha nna gị ga-ebu ụzọ, aha gị na-eso na aha gị nke etiti ) na ekwenti n'akara 55019)
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ha ga- azachigha gị ma sitere gị akara ị ga-eji gaa ụlọakụ ka zute akwụkwọ mdebanye aha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
PDP Rally:
Anyị akụọla Boko Haram isi a baa okpu na Baga - Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndịagha Naịjirịa sị ha akụọla Boko Haram isi aba okpu na Baga nakwa obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu.
Ozi a si n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ndịagha Naịjirịa bụ Sani Kukasheka Usman wepụtara.
Usman kwuru na ọ bụ ndị agha si na ngalaba 'Operation LAFIYA DOLE' buru agha.
PVC nọ n'aka anyị maara anyị - INEC

Ebe foto si, INEC NIGERIA/FACEBOOK
Ụlọọrụ INEC nke Enugwu Steeti ekwupụtala mwute ha na ọtụtụ akwụkwọ ntuliaka PVC ndị mmadụ ka dị n'aka ugbua ruru puku narị ise.
Onyeisi ndị ụlọọrụ ahụ bụ Emeka Ononamadu rịọrọ arịrịọ ka ndị mmadụ gbalịa bịa were akwụkwọ ntuliaka ha ma jikere maka ntuliaka na-abịa.
Na mba Kongo

Ebe foto si, Reuters
Mmeri Felix Tshisekedi meriri na ntuliaka onyeisiala mba Kongo ebutela oke arụmụka na egwu dịka onye na-ama ya aka bụ Martin Fayulu jụrụ ị nabata mpụtara ntuliaka ahụ.
Ụka Katọlik na Kongo kwuru na mpụtara ntuliaka ahụ adabaghị na ihe nke ndị na-ele ka ntuliaka si aga wepụtara.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Nkeji
Sarakị sị na aka Buhari akwụghị ọtọ

Ebe foto si, @NGRpresident
Onyeisi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki, ekwuola na aka Onyeisiala Muhammadu Buhari akwụghị ọtọ, ma kwuo na mpụ juru n'ọchịchị ya.
Saraki kwuru nke a ka ọ na-aza ajụjụ ọnụ na Channels TV, kwukwara na ebe Buhari kwuru na ọ na-ebuso mpụ agha, gịnị kpatara na akpụpụbeghị ndị na-arụrụ ya ọrụ eboro ebubo mpụ na nrụrụaka ụlọikpe?
Ndị agha anapụla Boko Haram obodo Baga

Ebe foto si, Nigerian Army/Facebook
Ndị agha Naịjirịa sị na ọbụghịeziokwu na ụzọ si Maiduguri gawa Damaturu dị n'aka ndi Boko Haram.
Na ozi ha dere n'akara Facebook ha, ha kwuru na ha kwụsịkwara mwakpo ndị oyi egwu a chọrọ ime n'obodo Damasak, ma chụpụ ha n'okporoụzọ batara Maiduguri.
Felix Tshisekedi enwere mmeri na Congo

Ebe foto si, AFP
Na Democratic Republic of Congo, Felix Tshisekedi enwetela mmeri na ntuliaka emere iji họpụta onye ga-anọchi anya Laurent Kabila dịka onyeisiala mba.
Tshisekedi nwetere pasentị iri atọ na anọ iji nweta mmeri a ga-eme ya onye mbụ nọ na pati na-anọghị n'ọchịchị ga-achị Congo.
Manchester City sụrụ Burton akwụ

Ebe foto si, AFP
N'egwuregwu, Otu Manchester City mere ihe a ga-eji cheta ha ka ha zuru ndị Burton Albion ike n'ahụ n'asọmpi Iko Carabao.
Gabriel Jesus nyere ọkpụ anọ naanị ya ebe ndị ọzọ kere otu ọkpụ, otu ọkpụ mezuru ya goolu itoolu asataghị otu ha ji merie.
Gee akụkọ ndị a ebe a:
Ihe nkiri nwereike masị gị:












