Plateau: Nkwekọrịta Buhari, Saraki na Dogara nwere

Buhari, Saraki na Dogara

Ebe foto si, @NGRpresident

Nkọwa foto, Mkparịta ụka ha na-abịa n'ime abalị anọ awakpochara ụfọdụ dị mmadụ ma gbuo ihe ruru mmadụ iri asatọ na isii na Plateau Steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogara nwere mkparịta ụka taa.

Onyeisiala kọwara ndị isi ụlọomeiwu ihe ndị ọ na-eme i ji gboo nsogbu nchekwa dị na Naịjirịa ugbua.

Na ngwụcha nzụkọ ha, onyeisi ụlọomeiwu ntaa bụ Yakubu Dogara gwara ndị ntaakụkọ na okwu nchekwa abụghị okwu a na-ekwuputa n'ihu ọha.

Ọ gara n'ihu kwuo na onyeisiala gwara ha na ọ ga-ekpogharị nchekwa ala Naịjirịa.

Buhari, Saraki na Dogara

Ebe foto si, @NGRPresident

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọimeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogaran na-enwe mkparịta ụka

O kwuru na agbanyeghi na ugbu a bụ oge iri uju, na ndị Naịjirịa agaghị a na-abata ọnọdụ enweghị nchekwa.

Dọgara n'aha ndị ụlọomeiwu zigara ezinaụlọ ndị ihe a metụtara ozi iti aka n'obi.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Onyeisiala Mohammadu Buhari kwupụtara nzụkọ ahụ site n'akara twitter ya.

Mkparịta ụka ha na-abịa n'ime abalị anọ awakpochara ụfọdụ ndị mmadụ ma gbuo ihe ruru iri asatọ na isii na Plateau steeti.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ