Ndị Enugwu etipụla mkpu akwa maka enweghị ezi mmiri ọṅụṅụ na steeti ahụ

Ọnọdụ mmiri n'Enugwu steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọtụtụ ndị bi n'Enugwu steeti etipụla mkpu akwa maka ụkọ mmiri na ọnọdụ enweghị ezigbo mmiri ọṅụṅụ na steeti ahụ.

Ha kporo oku ka gọọmenti Enugwu steeti gbatara ha ọsọ enyemaka ma kwuo etu o si emetụta ha na ezinaụlọ ha.

Ebe BBC News Igbo gara jụọ ndị mmadụ ajụjụ banyere ọnọdụ enweghị mmiri ọṅụnụ gunyere Achara Layout, Maryland, Ugwuaji, na Presidential road.

Ọnọdụ enweghị mmeri n'ebe dị iche iche n'Enugwu

Maryland:

Otu onye BBC News Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na aha ya bụ Stecey Nwakaego kọwara etu ọnọdụ siri dị na gburugburu ha na mpaghara Maryland.

N'okwu ya "ihe anyị na-akọwa bụ na anyị adịghị ahụ ezigbo mmeri na Maryland".

"Ihe anyị na-azụ otu 'bọketị ọcha' mmiri bụ N250, ị gbakọzịa ole ị ga-azụ".

"Ebe niile a na-agwupụta mmiri na Maryland ebe, mmiri taraata".

"Mana a na-ekwe anyị nkwa na mmiri ga-adị mana enwebeghị ihe anyị hụrụ"

"Biko anyị na-arịọ ka ha nyere anyị aka maka na ọ bụ mmiri bụ nsogbu anyị na-enwe".

Ubaka, Achara Layout:

Ndị bi n'Ubaka, Achara Layout dị n'okpuru ọchịchi Enugwu saụt kwuru na ha na-ata ahụhụ mmiri.

Ọnọdụ mmiri n'Enugwu

Otu onye n'ime ha bụ Chinonso Edeh sị "etu anyị si ese mmiri n'ụlọ anyị ugbua bụ otu onye sere taa, onye ọzọ esere".

"Ụlọ anyị nwere 'flat' iri abụọ na anọ, mana etu anyị si eke ise mmiri bụ otu onye otu ụbọchị".

"N'oge m kpere mpe, mmiri na-agba n'ime Achara Layout niile".

Ugwuaji

Kelechukwu Udeh kwuru na mpaghara Ugwuaji enweghị mmiri ma kọwaa ahụhụ ha na-ata tupu ha enweta mmiri.

N'okwu ya "ebe m si bịa ebe a ịzụta mmiri bụ ebe Ugwuaji"

"Anyị na-echere ihe ruru awa atọ n'ebe a na-ere mmiri tupu orutu anyị".

Etu mmiri si emetụta ezinaụlọ anyị

Stacey Nwakaego kọwara ihe ezinaụlọ dị iche iche na-agabịga maka enweghị mmịrị ma kwuo etu o si emetụta ma ụmụaka.

Ọ gwara anyị na mmiri ha na-ahụ adịghị mma iji sie nri maka na ọ dịghị ọcha.

N'okwu ya "ọ dịghị mma iji asa ihe. ọ bụlụzịa iji ya esi nri maọbụ asa ahụ".

"O mere anyị a na-eji mmiri 'pure -water' asa ahụ ma na-esi nri".

"Anyị chọrọ ka gọọmenti nyereaka nye anyị mmiri ga-adị anyị mma n'ahụ".

"E nye anyị mmiri anyị na ha enweghị nsogbu".

Otu ihe a ka ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na mpaghara dị iche iche n'Enugwu steeti.

Ihe onye a maama na Gọọmenti Enugwu Steeti kwuru

Otu onye na Gọọmenti Enugwu steeti a maama gwara BBC News Igbo ihe gọọmenti na-eme iji kwụsị ụkọ mmiri na steeti ahụ.

Ọ kọwara na gọọmenti na-agba mbọ imezi ihe mibiri n'ebe a na-esi ekesa mmiri na steeti ahụ.

Mana o kweghị akpọ okwu aha maọbụ kwuo ihe mebiri mana o mere ka anyị mara na gọọmenti na-agba mbọ ka mmiri bido na-agba na steeti ahụ.