Cholera: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka ọrịa otoro
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Okechukwu Omeire
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist and Video Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Ọrịa otoro a maara dịka Cholera n’asụsụ Bekee nwere ike igbu onye ọ na-eme n’ime awa anọ o jiri malite ma ọ bụrụ na enweghị ihe onye ahụ mere gbasara ya.
A na-enyo mmadụ karịrị 1141 dịka ndị butere ọrịa otoro na Naịjirịa malite n’ọnwa Jenụwarị ruo n’ọnwa Juun afọ 2024.
Ihe karịrị madụ iri atọ n’ime ha anwụọla ebe ihe karịrị mmadụ iri isii na ise bụ ndị achọpụtara butere ya bụ ọrịa na Naịjirịa.
Njirimara ọrịa otoro gụnyere ịnyụ nsị gbara oke mmiri dịka mmiri osikapa, ọgbụgbọ, agụụ mmiri, ukwu mgbu, afọ ịfụ ụfụ maọbụ igbu mgbu nakwa mgbakasị ahụ.
Ụzọ ndị a pụrụ isi gbanahụ ya bụ site n’ịṅụ mmiri dị ọcha mgbe niile, iji ncha na mmiri dị ọcha na-agba agba akwọcha aka nke ọma ugboro ugboro; ịkwọcha aka tupu e sie nri, tupu e rie nri nakwa mgbe e richara nri; tupu agaa mposi nakwa mgbe a gachara mposi.
Etu a pụrụ isi gwọọ ya bụ site n'ịṅụ Oral Rehydration Therapy nakwa ịgbara gawa ụlọọgwụ ozugbo ọ malitere.
Ọrịa otoro egbuola mmadụ 13 n’Ebonyi steeti

Ebe foto si, Getty Images
E kwupụtala mmadụ iri na atọ (13) dịka ndị nwụrụ anwụ n’ihi ọrịa otoro tiwapụrụ n’Okpuru ọchịchị Ebonyi na Izzi dịcha n’Ebonyi steeti.
Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike n’Ebonyi steeti bụ Moses Ekuma kwuru na mmadụ iri nwụrụ izuụka gara aga ebe mmadụ atọ ndị ọzọ nwụrụ mkpụrụ ụbọchị ole na ole gara aga tupu gọọmenti agbata ọsọ enyemaaka.
Oge ọ na-ekwu okwu n’isi obodo Ebonyi steeti bụ Abakaliki n’ụbọchị Sọnde 29 Septemba 2024, Ekuma sịrị na ọnụọgụ ndị butere ọrịa otoro na steeti ahụ bụ mmadụ iri isii na itolu (69).
Ka o siladị, ọ sịrị na e nwebeghị ndị ọhụrụ nwụrụ kemgbe Fraịde 27 Septemba 2024 dịka ndị butere ọrịa ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ogige ahụike dị iche iche a gbapere n’ime obodo ndị a hụtara ya bụ ọrịa n’Okpuru ọchịchị Ebonyi na Izzi.
Ọ kọwara sị ewezuga obodo Ndiogbaga Obashi, Oferekpe dị n’Okpuru ọchịchị Izzi na Okum dị n’Okpuru ọchịchị Ebonyi nakwa Ndibokote ebe ya bụ ọrịa malitere, na ọkụ ọkụ ministri ahụike Ebonyi steeti, ndị mgbakọaka ya na ndị ọnụ na-eru n’okwu jiri chụọ ọrịa ahụ ọsọ mere ka ndị butere ya ka dịrị ndụ.
Ọrịa otolo: Mmadụ 143 ebutala ya na Kirikiri nakwa steeti Katsina

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Gọọmenti Lagos steeti mere ka amata na mmadụ ịrị abụọ na ise butere ọrịa otolo n’ụlọ nga Kirikiri dị na steeti ahụ.
Gọọmenti ahụ mere ka amata na otu ahụike mba ụwa na enye ha nkwado me tinyekwa na ihe ha mere iji kwụsị ọrịa ahụ na Kirikiri na amịta ezi mkpụrụ.
Onye na ahụ maka ahụike oha n’Lagos bụ Tunbosun Ogunbanwo kwuru na Kọmịshịọna na ahụ maka ahụike n’steeti ahụ bụ ọkammụta Akin Abayomi kwuputara na otu na ahụ maka ahụike mba ụwa nyere steeti ahụ ọgwụ rụrụ 10,000 na ihe ndi ọzọ ịjị nyere aka kwụsị ọrịa ahụ na Kirikiri.
Ọ sị na “ọgwụ ahụ ga enyere aka chekwa ahụike ndị nga ọnụ ọgụgụ ha ruru 3200 ma ọ dị na mkpa. Ma kwukwa na ihe gbasara ọnọdụ mmịrị na ịdị-ọcha bụ nke ha tinyere anya ma dozie ya”.
“Anyị na enyocha ọnọdụ ụlọ nga ndị ọzọ dị icheiche n’Lagos”.
Abayomi kọwara na ọnụ ọgugụ ndị na arịa ọrịa otolo na agbadata ma kwukwaa na ọ bụ mmịrị na ihe onunu a na ere n’ụzọ bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ sị ebuta ọrịa otolo.
N'otu aka ahụ ngalaba NCDC ekwukwala na ihe ruru mmadụ 118 ebutela ya bụ ọrịa na steeti Katsina.
NCDC agbapeela ogige gbatagbata maka ọrịa otoro na Naịjirịa
Ụlọorụ na-ahụ maka ọrịa ndị na-efe efe na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control and Prevention (NCDC) agbapeela ogige gbatagbata maka ọrịa otoro.
NCDC sịrị na ya mere nke ahụ oge ndị ọkachamara na-ahụ maka ọrịa otoro mechara nchọcha gbasara ọnọdụ iyi egwu nke ya bụ ọrịa na Naịjirịa izuụka gara aga.
Ụlọọrụ ahụ kwuru na dabere na ya bụ nchọcha, ha gbapere ‘National Cholera Multi-Sectoral Emergency Operations Centre’ (EOC) n’isi obodo Naịjirịa nakwa steeti niile e nwere na Naịjịrịa.
NCDC kwuru na mkpebi o nwere ịgbape ogige gbatagbata ndị ahụ bụ n’ihi ogogo ntiwapụ nje ọrịa otoro nakwa iji belata mmetụta ọjọọ ya.
Ọrụ EOC bụ inyere steeti ndị ọrịa otoro na-emekpaahụ aka ma hụkwa na e zigaara ha akụrụngwa ndị ha chọrọ tinyere ime nchọpụta, nnyochaahụ, inye ndị ọrụ ọzụzụ na ịgbasaara ọhanaeze ozi banyere ya bụ ọrịa.










