Water Drinking: I so na ndị na-akpụrụtụ mmiri akpụrụtụ, lekwa nsogbu so aṅụghị mmiri

Nwata nwaanyị na-anụ mmiri

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Dịka oti egwu a ma ama bụ Fela siri gụọ n'egwu ya a ma ama "Water e no get enemy" - mmiri enweghị onye iro - mmiri bụ ihe ụwa dum ma dịka ihe dị ezigbote mkpa maka ndụ.

Mmiri mejupụtara pasenti iri isii n'ahụ mmadụ nke bụ na ma mmiri ezughị oke n'ahụ mmadụ onye ahụ nwereike inwe nsọgbụ n'ahụ ya ma na ụbụrụ isi ya.

Eziokwu bụ na ụbụrụ isi, umeeju na obi mmadụ kwesiri inwe mmiri na nnuu ka ha were rụọ ọrụ nke ọma.

Mgbe ọsụsọ na-apụ mmadụ n'ahụ, mara na ọ bụ etu ahụ gị si ewetuo ekpemọkụ ahụ gị.

Kama echefukwala na ọ bụ mmiri ka ahụ gị ji arụ ọrụ a.

Ịnyụ mamiri, ịnyụ nsị na ịku ume sokwa n'ụzo mmiri ji esi n'ahụ mmadụ apụ.

Ihe ka mkpa bụ ka ị mara mgbe ahụ gị na-agwa gị "nye m mmiri, a chọrọ m mmiri".

Akụkọ a ga-ekuziri gị ihe na-egosi na mmịrị akọọla gị n'ahụ.

Ihe na-egosi na mmiri kọrọ gị n'ahụ

Dọkịta Uche Ogundele kọwara njirimara na ihe ịgba ama na-egosi na mmiri kọrọ mmadụ n'ahụ.

Egbugbere ọnụ ịkpọ nkụ

Egbugbere ọnụ kpọrọ nkụ

Dọkịta Ogundele kwuru sị "mgbe egbugbere ọnụ gị kpọrọ nkụ na-agbanyeghị na ọ bụghị oge ụgụrụ, nwanne gbalịa chọọ mmiri ṅụọ".

Ọ kọwara na mgbe mmiri kọrọ mmadụ n'ahụ, ọ na-ebute ka ụfọdụ ihe 'odozi ahụ' - nke Bekee na-akpọ "minerals" - kọọ n'ahụ mmadụ nke na-eme ka egbugbere ọnụ mmadụ kpọọ nkụ.

Anya ị ba n'ime

Anya bara n'ime

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Anya gị baa n'ime, biko ṅụọ mmiri

Anya gị ọ bara n'ime?

Okirikiri anya gị ọ na-eji oji?

Ogundele kọwakwara na ọ bụrụ na ihe ndị a na-eme n'anya gị maọbụ onye ị ma, mara na mmiri kọrọ onye ahụ na-ahụ.

Ọrịa na-ebute afọ ọsịsa na ịgbọ agbọ n'ụmụaka na-eme ka mmiri kọọ ha n'ahụ.

Ọ bụrụ na njirimara ndị a na-eme nwa gị dịka ọrịara ọrịa butere ọgbụgbọ maọbụ afọ ọsịsa, were ọsọ were ije kpọga ya ụlọọgwụ.

Ahụ kpọrọ nkụ ma hịkọahịkọ

Ahụ kpọrọ nkụ
Nkọwa foto, Ahụ kpọrọ nkụ na-egosi na mmiri kọrọ n'ahụ mmadụ

Dọkịta Uche Ogundele kwukwara na ihe ọzọ na-egosi na mmiri kọrọ mmadụ n'ahụ bụ etu anụ ahụ onye ahụ dị.

Ahụ kpọrọ nkụ sọkwa na otu ihe Ogundele kwuru na-egosi na mmiri kọrọ gị n'ahụ.

Njirimara ahụ ikpọ nkụ bụ mgbe ahụ mmadụ bidoro sewa alịghịlị dịka nke onye kara nka.

Kama chetakwa na-enwere ndị amụrụ ha ejiri ahụ kpọrọ nkụ pụta ụwa, kama nke ahụ dị iche na njirimara nke ya.

Nke mmadụ bu pụta ụwa na-egosi na mmanụ adịghị ndị ahụ n'ahụ, nke a dị iche na nke ọzọ na ezipụta na mmiri kọrọ mmadụ n'ahụ.

Dịka ndị BBC siri dee, lee etu ị ga-eme ma ị chọrọ ịmata ma ahụ gị ọkporọ nkụ maka na mmiri adịghị ya:

  • pịdo anụ ahụ gị aka
  • Welie ya elu
  • Ọ bụrụ na o gburu oge ịlọghachị etu ọ dị mbụ, mara na mmiri kọrọ gị n'ahụ.

Nkụtụme akwara gị agaghị esi ike

Ntule Nyocke nkutuma akwara

Ogundele kwukwara na ihe ọzọ na-egosi na mmiri kọrọ madụ n'ahụ bụ mgbe nkutume akwara onye ahụ adịghị ike.

A na-enweta nkutume akwara n'ọlụ na nkeji aka nke Bekee kpọrọ "wrist".

Onye mmiri kọrọ n'ahụ, ọ na-esikarị ike ịchọta nkutume akwara ya.

Aha onyonyo, Lassa Fever Outbreak:Etu e si lie nwaanyị Lassa Fever gburu

Dọkịta Ogundele na-ekwu na ọ na-esikarị ndị ahụike ike ma ha chọwa itinye ọgwụ maọbụ ọ bara n'akwara onye mmịrị kọrọ n'ahụ.

Ọ kọwara na ọ bụrụ na nkutume akwara gị esighị ike mara na otu ihe na-ebute ya bụ na mmiri kọrọ gị n'ahụ.

Lee etu ị ga-esi mata maka nkutume akwara gị

Mamiri gị

Mammiri mmad

Ebe foto si, Getty Images

Ogundele kọwara na mamịrị na adịka ka nyonyo na-egosi ihe na-eme n'ime ahụ.

O kwuputara ụzọ atọ mamịrị mmadụ si egosi ma mmiri ọ kọrọ mmadụ n'ahụ .

Nke mbụ abụrụ etu mamiri gị si acha:

Ogundele kọwara na mgbe mamiri mmadụ na-acha odo odo nke di oji, ka onye ahụ mara na mmiri kọrọ ya n'ahụ.

Nke abụọ abụrụ na ọ bụrụ na mmadụ anyụghị mamiri etu o si anyụ mbụ, ka onye ahụ mara na mmiri kọrọ ya n'ahụ. Ogundele mara atụ were sị na ọ bụrụ na mmadụ na anyubu mammịrị ugbọrọ atọ maọbụ anọ, mgbe mmiri kọro onye ahụ n'ahụ, onye ahụ nwereike na-anyụ nanị otu mgbe maọbụ abụọ.

Nke atọ dịka Ogundele siri kọwaa bụ na onye ahụ agaghị anyụ kwa mammịrị ọzọ nke ga-emesị ka umeeju ya kwụsị ịrụ ọrụ.

Kedu mmiri ole mmadụ kwesiri ịṅụ kwa ụbọchị?

Dịka ndị Bakụkọ maka ya BBC dere siri kwuo sayensi akwadoghị akụkọ na mmadụ kwesiri ịnụ ihe dịka lịta mmiri abụọ kwa ụbọchị.

Edemede a kọwara na akụklọ na mgbe mmiri na-agụ mmadụ pụtara na mmiri kọrọ n'ahụ mmadụ ebe ọ dị njọ abụghị kwa eziokwu.

Kama ha kwuru na ndị ọkammụta kọwara na ahụ mmadụ mara iko mmiri ole ga-adị ahụ mma, nke pụtara na mgbe mmiri na-agụ mmadụ na ahu gị na-agwa gị "Nye m mmiri".

Kama ngalaba ahụike mba Briten bụ NHS kwuru na ọbụrụ na mmadụ chọro ịṅụ mmiri, ka onye ahụ nụọ ihe dịka ịko isii maọbụ asatọ kwa ụbọchị iji gbanahụ mmiri ịko mmadụ n'ahụ. Iko a nwereike ị gunye mmiri ara ehi, mmanya na-enweghị shuga maọbụ Tee na Kọffị.

Lekwa ụzọ itolu mmiri si enyere ndụ gị aka

Dịka Edemde ndị BBCGoodfood dere maka uru mmiri bara, ha depụtara ihe itolu na-egosi ụzọ mmiri si enyere ndụ anyị aka

1) Mmiri na-eme ka ụbụru gị na-echeta ihe nke ọma dịka nyocha gosiri na ndị mmiri kọrọ n'ahụ na-echefu ihe

2) Ịnụ mmiri naegbochi agụrụ shụga maọbụ ihe na-atọ ụtọ ị na agụ mmadụ. Ma nwee kwa ike ịkwụsị mmadụ ibu oke ibu.

Aha onyonyo, Covid 19 n'otu nkeji: 'Dogoyaro' o nwereike ịgwọta coronavirus

3) ịnụ mmiri etu okwesiri na enyere aka mgbe mmadụ na-eme ihe mmegharị ahụ dịka ịgba ọsọ na ihe ndị ọzọ.

4) Ịnụ mmiri nwereike ịkwụsị isi ọwụwa n'ahụ ụfọdụ ndị.

5) Mmiri na-akwụsịkwa afọ ịmachi mmadụ ọkachasị ụmụaka.

6) Ọ na-akwụsịkwa ọrịa okwute umeeju (Kidney Stones)

7) Ịnụ mmiri na-egbochikwa ọrịa akpa mmiri (Bladder Infection)

8) Edemede a na-ekwu na ị nụ mmiri nwereike ime ka ahụ mgbu sitere na-ịnụ oke mmanya belata.

9) Dịka mmiri na-enyere ụbụrụisi aka ịrụ ọrụ ya, o nwekwaraike ịkwụsị oke nchegbu.

Aha onyonyo, Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka