Kano Deaths: Ọnwụ amaghị ebe o si na Kano na-agba anyị gharị - Ndị Igbo bi na Kano

Ebe foto si, AFP
Ọtụtụ ndị Ọwụwa Anyanwụ bi na Kano ekwuola na akụkọ ọnwụ na-akpọtụ na steeti ahụ emetụghị ha.
Kano steeti so n'obodo kachasị n'Ugwu-Awụsa dịka ọnụgụgụ mmadụ bi na ya, gụnyere ọtụtụ ụmụ Igbo, ruru nde iri na ise mana akụkọ na-agba anyamiri na-ewu na nsonso a bụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-anwụ na steeti ahụ n'oge a n'ihi ọrịa amaghị ebe o si.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-ebo ya coronavirus mana gọọmentị steeti ahụ sị na ha enweghị ike ịkọwa ihe butere ya bụ ọnwụ mberede dịka ha rụtụrụ aka na o nwere ike bụ ọrịa shuga, ọbara mgbanielu na ịba.
Ndịsi ọwụwa anyanwụ bi na Kano ha na BBC Igbo kpara sị na ya bụ ọnwụ na-egbu ka ọkụkọ bụ n'akụkọ ka ha na-anụ ya.
Mazi Romanus Okoro bụ onye birila na Sabon-Gari dị na Kano karịa afọ iri atọ sị na ha na-anụ ya bụ akụkọ na redio nakwa onyonyo TV.
O kwuru sị: "O nweghị ka ya bụ ihe si metụta anyị."

N'otu aka ahụ, nwaafọ Igbo ọzọ bikwa na Kano bụ Nduka Abili sị na "o metụtaghị anyị. Ọ bụ ndị Ugwu ka ọ na-egbu."
Okoro kwuru na ya che na ihe ga-eso bute ya bụ ọrịa bụ ka ndị Ugwu si arụ ụlọ nke ezigbo ikuku anaghị abata na ya.
O kwuru sị: "Ụdị ekpomọkụ dị na Kano ugbua nwere ike igbu mmadụ".
O kwukwara na ya bụ ọnwụ ka njọ n'ime obodo bụ ebe tere aka site n'ebe ha bi.
Abili gara n'ihu kwuo na ọrịa ahụ na-egbu ma ogbenye ma ọgaranya ọkachasị ndị afọ ha gbalịiterela.
Ọ kọwakwara na ọtụtụ ụlọọgwu abụghị nke gọọmentị anaghị anabata onye bu mkpesa ịba maọbụ ahụọkụ n'ihi egwu coronavirus.
"Nke a na-eme ka ndị nwere ọrịa alaa, ha aṅụwara onwe ha ọgwụ, ụfọdụ ọnọdụ ha akawanye njọ, ha esi na ya nwụọ", Abili na-ekwu.

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe BBC jụrụ ndị ọrụ ahuike na Kano, Onyeisi otu jikọrọ ndị dọkịta bụ 'Nigeria Medical Association' na steeti ahụ bụ Sanusi Mohammed Bala kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu chaachaa.
Bala sị na ihe mere o ji dị ka ndị dọkịta anaghị anọ bụ maka usoro ha weputaara ha ji arụ ọrụ maka ịchekwa onwe ha maka ya bụ ọrịa.
Bala sị na "onye ọbụla na-akpachapụ anya ya ugbua".
Cheta na Gọvanọ Abdullahi Ganduje kpọchichara Kano steeti ịzụụka abụọ gara aga mgbe ọrịa covid-19 malitere ịrị ibe ya elu.

Onye Ugwu ọzọ anyị gbara ajụjụ ọnụ bụ nke na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya bụ onye bi na Ida dị na Kano steeti sị na ya bụ ọnwụ mberede malitere n'izuuka mbụ mkpọchi a bidoro.
Ọ na-eche na o nwere ike ịbụ agụụ, ihe isiike na obi mmapụ butere ya bụ ọnwụ ọkachasị ebe ụfọdụ na-eche ihe ha na ezinaụlọ ha ga-eri dịka mmachi ngaghari biara ha na mberede.
Ọ sị na o nwekwara ike ịbụ na ahụ adịghị ọtụtụ n'ime ndị ahụ gbabiiri nwụọ maka na ọtụtụ n'ime ndị a dị n'agbata afọ iri ise na iri isii.
Ọ sịkwa na ọ bụghị eziokwu na ọ bụ naani n'ime obodo ka ya bụ ọnwụ dị, "a ma m mmadụ abụọ ndị o gburu n'Ida ebe a".










