'Sepsis' ọrịa na-egbu rue ka kansa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Kwa afọ, otu n'ime mmadụ ise na-anwụ site n'ọrịa 'Sepsis' nke bụ ọnọdụ na-adapụta oge nje banyere ọnya maọbụ oghere n'ahụ mmadụ.
Ewezụga imebi ihe dị ezi mkpa n'ahụ mmadụ, ọrịa a na-egbu mmadụ ruo ka ndị na-anwụ site n'ọrịa kansa.
Dịka nchọpụta WHO siri kwuo, mmadụ nde isii na-anwụ n'ihi ọrịa 'sepsis' kwa afọ, ebe kansa na-egbu mmadụ nde itoolu n'ụma.
WHO kwụkwara na n'ime otu n'ime mmadụ iri nwụrụ n'ịmụ nwa, ihe karịrị pasent 95 bụ 'sepsisi na-ebute ya.
Gịnị bụdị 'Sepsis'?
Akwụkwọ 'English-Igbo Medical Dictionary' kọwara 'sepsis' dika "nje ịbanye n'ọnya maọbụ n'ọrịa nke na-eme ka o ruo abụ."
N'otu aka ahụ, Dokịta Ikechukwu Okoroafor kpọrọ ya ọrịa nje ịbanye mmmadụ n'ahụ.
Na nkowa ya, Dọkịta Okoroafor kwuru na ọrịa a na-adị ụzọ abụọ; 'Sepsis' na 'Septicaemia.
"Septicaemia bụ nje ahụ ịbanye n'ọbara mmadụ."

Ebe foto si, Getty Images
Ọ gara n'ihu kwuo na afọ jọrọ ọrịa 'sepsis' njo n'ihi na "o nwereike imebi akụrụ, imeju maọbụ obi mmadụ ma gbuo onye ahụ ma ọ bụrụ na a chọpụtaghị ma gwọọ ya n'oge."
Onye ọ bụla nwere 'infection' nwere ike ọ banye na 'sepsis'.
Njirimara ọrịa 'sepsis' gụnyere:
- Nnukwu Ahụọkụ - Ufodụ na-eche na ọ bụ Iba
- Nchagha ahụ
- Ọrịa nwere ike imebi akụkụ ahụ dị oke mkpa dịka Septicaemia- Iọ banye n'akụ dịka kidney,liver na obi
- Ọ na-egbu mmadụ ma ọ bụrụ na-achọpụtaghị ya n'ogeike igbu mmadụụ/
- Ụfọdụ na-agwọ iba amaghị na ọ bụ 'sepsis'
Ihe e ji agwo 'sepsis'
Ọgwụ na-egbu nje a kpọrọ'antibiotics' ka eji agwọ 'sepsis'.
Uzo e si ebute 'Sepsis
Dika Dọkịta Okoroafọ siri kọwaa, e nwere ike ibute ọrịa 'sepsis site na;
- Nje nwere ike isi n'ọnya maọbụ oghere dị n'ahụ mmadụ
- Ihe mmadu riri n'ọnụ.
- Nwaanyị ịmụ nwa n'ebe adịghị ọcha
- Ịwa nwaanyị afọ ebe edobeghị ọcha
- Inweta nleta n'ụlọọgwụ adịghị ọcha
Ụzọ mgbochi
- I dowe gburugburu ebe ị nọ ọcha
- I merụọ ahụ maọbụ ahụ gị mepe, i kwesiri ị ga hụ ọkacharamara ahụike









