Biafra at 50: Etu azụ okporoko si bata Naịjirịa n'ihi agha Bịafra

Ọgbọ Okporoko
Nkọwa foto, Ahịa okporoko abụghịkwa ahịa ndị ogbenye na-azụ maka na e ji nnukwu ego azụ ya.

Agha Biafra wetara nnukwu ihe mgbu, agụụ na ọnwụ nye ọtụtụ ndị Igbo.

Mana ọ bụghịkwa naanị ihe ọghọm ka ya bụ agha wetara.

Otu ihe bara uru mmadụ nwere ike ikwu n'ọgụ Biafra wetara bụ azụ okporoko.

Okporoko bụ nnukwu ihe oriri n'ala Igbo nakwa na Naịjirịa niile.

N'ezie, okporoko abụghị ụdịrị azụ ị ga-ahụ n'ite ofe nwa ogbenye.

Kedụ ka okporoko si bata ala anyị:

Ebe a na-emepụta azụ okporoko na mba Norway

Ebe foto si, Penny Dale

Nkọwa foto, Mba Norway bụ ndị e ji azụ okporoko mara

Mba Norway bụ mba e ji ịkụpụta azụ okporoko wee mara.

Tupu obodo ahụ achọpụta mmanụ agbidi nakwa ikuku gaasị na be ha, okporoko bụ ihe ha jiri biri.

Taa, okporoko bụ ihe nke abụọ kacha enye Norway ego.

Naịjirịa bụkwa mba kacha atụbata okporoko n'ụwa niile.

Stockfish heads in close-up on the drying racks

Ebe foto si, Penny Dale

Nkọwa foto, Isi okporoko

Frank Jensen, onye ọkachamara maka akụkọ ihe mere mgbe gboo (History) gwara BBC na ọ bụ n'oge agha Biafra ka okporoko batara Naịjirịa.

Mgbe a na-alụ agha na Naịjirịa, oke aguu na ọrịa gburu ọtụtụ ụmụaka na ndị okenye Biafra.

Otu dị icheiche nakwa ụlọụka di icheiche malitere izite nri na ihe ndị ọzọ iji nyere ndị Igbo aka.

Onyingbo market - a man buys some produce from a woman's wooden stall
Nkọwa foto, Ebe a na-ere okporoko n'ahịa Oyingbo dị na Legọs

Jensen kwuru na "ọ bụ azụ okporoko ka Norway zitere."

"Ọ naghị emebi ngwa ngwa. O juputakwara n'ihe na-edozi ahụ."

N'otu aka ahụ, Edwin Mofefe gwara BBC na ọ bụ okporoko zọrọ ha ndụ oge ọrịa kwashịọkọ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ.

Mofefe dị naanị afọ ise oge agha Biafra malitere.

Aha onyonyo, Uli/Amọka Airstrip: Etu Okporoụzọ ụgbọelu asiri zọọ ndị Biafra

O kwuru sị: "Naanị azụ okporoko bụ ihe anyị nwere iji buso agụụ agha."

"Ọ bụ ya ka anyị ji mere ọgwụ."

Oge agha bere, Mofefe kwuru na ya ekweghị eri okporoko ọzọ n'ihi na o na-echetara ya ahụhụ ha gabigara oge agha.

Mana ugbua, okporoko abụrụla ngwa nri e ji mara ndị Igbo.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, O meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme