Amotekun: Gọọmenti etiti chọrọ ka e wugharịa nhazi Amotekun

Amotekun
Nkọwa foto, Ụgbọala ndị nche Amotekun
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Gọọmenti etiti na ndị gọvanọ Ọdịda Anyanwụ ekwekọrịtala n'okwu banyere Amotekun n'ọgbakọ ha nwere n'obi gọọmenti n'Abuja ụbọchị Tọọzde.

Ndị nọ n'ọgbakọ ahụ nke Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo no n'isi ya gụnyere onyeisi ndị uweojii nakwa Ọkaiwu Ukwu Naijiria na ndị gọvanọ Ọdida-Anyanwụ.

Okwu banyere Amotekun kpowanyere ọkụ na Naijiria dịka ndị nwere agba n'ala Yoroba na Ugwu-Awusa na-adụ onwe ha aka n'ọnụ banyere otu nche ahụ Yoroba hiwere na nsonso maka nsogbu ntọ na iji egbe ezu.

Mana gọọmenti ekwuola na ha ekpeziela ya bụ okwu.

Dịka ozi ụlọọrụ onyeisiala wepụtara n'akara Twitter ha kwuru na ha kwekọrịtara na a ga-ahazigharị Amotekun ka ọ gbaso atụmatụ nche ọha obodo nke bekee kpọrọ 'Community policing.'

Ha kwekọrịtakwara na steeti niile o metụtara mee iwu ga-akwado atụmatụ Amotekun.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Cheta na ụbọchị Wenezde, Tinubu tinyere ọnụ n'okwu ahụ were kpọọ oku ka a kpaa ya akpaa.

Tinubu etinyela ọnụ na ndọrịtaụka gbasara Amotekun

Tinubu

Ebe foto si, Tinubu/Twitter

Onye ndu otu APC bụ Ahmed Tinubu etinyela ọnụ ndọrịtaụka na-akpọtụ n'etiti ndị Ugwu na ndị Yoroba gbasara otu nche a kpọrọ 'Amotekun' nke ndị gọvanọ Ọdịda-Anyanwụ hibere na nsonso a.

'Amotekun' bụ otu nche nke gọọmenti steeti isii dị n' Ọdịda- Anyanwụ hiwere maka ibu agha megide ntọ, iji egbe ezu na arụrụala ndị ọzọ.

Tinubu kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi nke o binyere aka na ya n'ụbọchị Wenezde.

O kwuru na ma ndị na-akwado ya bụ atụmatụ, ma ndị na-ekwugide ya, ha aghọtaghị ihe otu ahụ bụ.

Ọ sịrị: "Ị jụọ ndị na-akwado Amotekun, ọtụtụ n'ime ha amaghị nke a na-akọ banyere ya karịa ị na-ebo ndị na-akatọ ya ibu ajọ ihe n'obi."

"Ị jụkwaanụ ndị na-akatọ ya, ha amaghị ihe ọbụla banyere atụmatụ ahụ."

"Ha na-akatọ ya n'ihi na ọ bụ atụmatụ nke ndị ha na ha anọghị n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị maọbụ nke enweghị uru ha ga-eritenwụ na ya."

"Etu ndị mmadụ si adọrịta ụka maka ya bụ atụmatụ na-egosi na ọchịchị onye kwuo uche ya akwụsibeghị ike."

Ọ gara n'ihu kpooo oku ka a kpa ya bụ okwu akpa.

Cheta na kemgbe e hiwere Amotekun, ọtụtụ otu na ndị nwere agba na mpaghara Ugwu akatọọla ya.

Otu Miyetti Allah sị na ọ bụ ụzọ ndị Yoroba ji chọọ ikewapụ na Naijiria .

Ha gara n'ihu gwa ndị Yoroba ka ha chefuo ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 ma ha jụ ikposa otu nche ahụ.

N'aka nke ọzọ, ọkaikpe Naijiria bụ Abubakar Malami kwuru na ya bụ atụmatụ megidere iwu Naijiria.

Amotekun: Gọọmenti etiti esepụla ndị ndịda-anyanwụ ara n'ọnụ

Amotekun
Nkọwa foto, Ụgbọala ndị nche Amotekun

Gọọmenti etiti akagbuola atụmatụ otu nchekwa nke steeti dị na Nda-Anyanwụ Naijiria jịkọro aka wube.

Gọọmenti steeti isii nọ na Ndịda-Anyanwụ Naijiria(Oyo,Ogun,Osun,Ondo,Ekiti na Legọs) jịkọtara hiwe otu nchekwa obodo maka ibelata nsogbu iji egbe ezu ,ntọ na mkpamkpa ndị ọzọ nke ha kpọrọ 'Amotekun.".

Mana n'ozi nke onye nnyemaka mgbasaozi nke ụlọọrụ Abubakar Malami bụ Ọkaikpe Naijiria a kpọrọ Umar Jibrilu Gwandu binyere aka Ọ sịrị na ,

"Nhibe e hibere otu nche a kpọrọ Amotekun megidere iwu, o megidere iwu Ala Naijiria."

Gọọmenti etiti gbadoro ụkwụ na nke a were sị na o nweghị onye nwere ike ihiwe na steeti.

"O nweghị steet maọbụ mpaghara nwere ikike ihibe otu maka ichekwa Naijiria maọbụ akụkụ ọlụla n'ime ya."

Mana ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Yoroba gụnyere Wole Soyinka nakwa Femi Falana akatọọla ya bụ okwu Malabi kwuru.

Cheta na ụfọdụ ndị Ugwu ọnụ na-eru n'okwu katọrọ atụmatụ 'Amotekun.'

Otu Miyetti Allah site n'ọnụ odeakwụkwọ ha bụ Alhassan Saleh kwuru nkata ha na ụlọakụkọ Punch nwere na ya bụ mkpookọba otu nche nwereike ime ka ohere iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 gbalahụ ndị Yoroba.

Tanka mmanụ agbịdị agbaala ọkụ ma gbuo otu nwoke

Tanka na-agba ọkụ

Ebe foto si, Haruna Mohammed

Tanka mmanụ agbịdị agbaala ọkụ ma gbuo otu nwoke na bypass AmawbiaTanka bu mmadụ agbịdị agbaala ọkụ na Bypass Amawbia nke dị nso n'okporoụzọ Enugu na Anambara.

Ndị uweojii kwuru nas ọkụ ahụ na-agbasi ike ma dọ ha aka na ntị maka ịbịa nso n'ebe ahụ.

Ha kwuru na ha agbachiela gburugburu ebe ahụ ma kpọọ ndị ọrụ mmenyụ ọkụ ka ha bịa rụọ ọrụ.

Nyocha gosiri na ya bụ tanka biara ka arụọ ya ọrụ dịka ọ wụpụchara mmanụ ụgbọala.

O bụ onye 'Welder' aha ya bụ Ayo Adenipekun eji 'AY' mara chọrọ igba ya bụ ụgbọala ọkụ ka ọku a gbagburu.

Ebe otu nwoke na aruzi ụgbọala na otu nwaanyị bụ ndị ọzo ebu gawa ụloọgwu maka ya bụ ọkụ.

Ụgbọala anọ, Tanka abụo, otu 'tipper' na ụgbọala 'Toyota Camry.

Akụkọ si ebe ahụ ka na-abịa.

Ihe ndị dị mkpa maka 'Finance Bill' Buhari binyere aka na ya

Onyeisiala Muhammadu Buharị na onyeisi ndịọrụ ya bụ Abba Kyari

Ebe foto si, Twitter/@MBuhari

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buharị na onyeisi ndịọrụ ya bụ Abba Kyari

Dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari binyerela aka n'akwụkwọ iwu ọhụrụ a kpọrọ 'Finance Bill' ọtụtụ ụmụ Naịjitịa na-ajụ ihe ya bụ iwu pụtara.

Iwu 'Finance Bill' gbadoro ụkwụ n'ụzọ gọọmentị etiti nwere ike isi wulie akụnụba ya site n'ịnakọ ụtụisi.

Nke a pụtara n'ịnakọ ụtụisi na Naịjirịa apụọla n'egwu a chị ụtaba n'aka agba.

Lee ihe ndị dị mkpa gbasara iwu 'Finance Bill':

  • Tupu imepee akara ọbaego n'ụlọakụ, ị ga-enwerịrị akara ụtụisi bụ 'Taxpayer Identification mumber' (TIN).
  • Ọ bụrụ na ị nweburu akara ọbaego, ị ga-aga n'ụlọakụ gị nye ha akara TIN gi, emeghị otu a, e nwere ike ịkwụsị akara ọba ego ahụ ma nwa oge gasịa.
  • E buliela ụtụisi a kpọrọ 'Value Added Tax' (VAT) site na pasentị ise (%5), ruo pasentị asaa na ụma ise (%7.5).
  • Ụgwọ 'stamp duty' ga-abụzị naanị mgbe i zipuru ego karịrị puku naịra iri (N10,000).
  • Akara ọbaego e mepere maka ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ụmụaka, agaghị akwụ ụgwọ 'stamp duty'.
  • Ụlọọrụ na-anaghị enweta egu ruru nde naịra 25 (N25m) kwa afọ agaghịzị akwụ ụtụisi 'Company Income Tax' (CIT).
  • Ụlọọrụ na-enweta ego karịrị nde naịra 25 (N25m) ga-akwụ pasentị iri abụọ n'ọmụrụnwa ha dịka CIT.
  • Iwu 'Finance Bill' megharịrị iwu ụtụisi ndị ọzọ dịka: 'Petroleum Profit Tax Act; Customs and Excise Tariff Act; Company Income Tax Act; Personal Income Tax Act; Stamp Duties Act; and the Capital Gains Tax.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka iwu ọhụrụ a

Aha onyonyo, Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi

@yojora kwuru na iwu a mara mma nke ukwuu maka ụlọọrụ nta na-amalite amalite:

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@Miss_Bilala jụrụ ndị mmadụ ma ha enwetakwala akara TIN ha:

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ị ma etu azụ okporoko si bata na Naịjirịa?

Onyingbo market - a man buys some produce from a woman's wooden stall
Nkọwa foto, Ebe a na-ere okporoko n'ahịa Oyingbo dị na Legọs

Otu ihe ọma e nwere ike ikwu na agha Biafra wetara na Naịjirịa bụ azụ okporoko.

Ọ bụ mgbe mba Norway gbataara ndị Biafra ọsọ enyemaka n'oge agha ka ha bubatara okporoko iji nyere ndị agụụ na-egbu aka.

Akụkọ a dị n'uju ebe a.

Atụmatụ nchekwa 'Amotekun' bụ n'Ebonyi ka o si

Gọv David Umahi

Ebe foto si, David Umahị onn Facebook

Gọọmentị Ebonyi steeti na-akọwa na ọbụ na steeti ahụ ka ndị gọvanọ mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa si nyopute atụmatụ nchekwa ọhụrụ ha hibere bụ nke a kpọrọ 'Amotekun'.

Onye kwuru nke a bụ Cọmisọna na-ahụ maka nchekwa na Ebọnyị bụ Stanley Emegha.

Ọ kọwara na atụmatụ ahụ adịla ire kamgbe n'Ebonyị nke mere na ụmụ kịrịkịrị mpụ dịka ọhị, ntọ na ndị ọzọ adịghịzị na steeti ahụ.

Emegha kwuru sị: "Oteela anyị malitere ụdị atụmatụ a n'Ebonyi."

"Onye chepụtara ya bụ ọchịagha a ma ama larala ezumike nka aha ya bụ Obi Umahị."

"Anyị achọghị ime mkpọtụ maka ya ka ndị omekome ghara ịma ka anyị si kwado chebiri ha."

Iran

Akụkụ ụgbọelu ahụ a gbaturu.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Iran kwuru na ọbụ amaghị ama ka ndịagha mba ahụ ji gbatuo ụgbọelu

Anwụchiela ọtụtụ ndịagha na mba Iran maka ịgbatu ụgboelu ụgbọelu mba Yukren ma gbuo otu narị mmadụ na iri asaa na isii n'abalị asatọ nke ọnwa Janụwarị a.

Ndi isi Yukren kwuru na nke a bụ iji gosi njikere ha ịhụ na ikpe nkwụmọtọ weere ọnọdụ gbasara ya bụ ọdachi.

Ibuso ndị oyi egwu agha n'Afrịka

Onyeagha Fransị na-arụ ọrụ na Bọkịna Faso

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Onyeagha Fransị na-arụ ọrụ na Bọkịna Faso

Mba Fransị na mba ndị si na mpaghara 'Sahel' nke Afrịka ekwekọrịtala ibusi agha ike megide ndị oyi egwu.

Nkwekọrịta bụ n'ọgbakọ e nwere na Pau dị na Fransị.

Ndị isiala Niger, Mali, Burkina Faso, Chad na Mauritania sọnyere na ya bụ ọgbakọ.

Onyeisiala Fransị bụ Emmanuel Macron nọrọ n'ọgbakọ ahụ kwe nkwa iziga ndị agha 220 ọzọ tinyere ndịagha 4,500 bụ ndị nọ ugbua n'Afrịka.

Ọgụ Fury na Wilder

Deontay Wider na Tyson Fury

Ebe foto si, Rex Features

Nkọwa foto, Deontay Wider na Tyson Fury

Oti ọkpọ bụ Tyson Fury etuola ọnụ na ya ga-akụpụ Deontay Wilder naanị n'agba nke abụọ mgbe ha ga-ezute onwe ha n'oge adịghị anya.

Ogụ a ga-abụ na abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Febụwarị ka ọ ga-akpọtụ.

Barcelona enyela Valverde ọsọ

Ernesto Velvarde

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ernesto Velvarde

Otu egwuregwu bọọlụ nke mba Spen bụ Barcelona enyela onye nkuzi ha bụ Ernesto Valverde ọsọ.

N'egbughị oge ọbụla, ha họọrọ nwa amadị aha ya bụ Quique Setian ka ọ nọchie anya ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Uli/Amọka Airstrip: Etu Okporoụzọ ụgbọelu asiri zọọ ndị Biafra