2023 Presidency: Ihe Tinubu kwuru maka 2023, Buhari na 'third term'

Ahmed Tinubu

Ebe foto si, Bashir Ahmad

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onye ndu otu APC bụ Bola Ahmed Tinubu gara zute Onyeisiala Naijiria bụ Muhammed Buhari n'obi gọọmenti etiti bụ 'Aso Rock n'ehihie Tuzde, were kwuo na Buhari enweghị ebumnobi ọbụla ịzọ oche ahụ nke ugboro atọ.

O kwuru na ndị ọbụla ha na Buhari rụkọrọla ọrụ mara na ọ gaghị akpa iwu Naijiria aka iji nweta ohere ịchị agba nke atọ (Third Term)

Ọ gara n'ihu kwuo na chi ka bụ ụtụtụ ikwu maka onye ga-abụ onyeisiala n'afọ 2023.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Inec, gbaa mbo mee mmeju ntuliaka kwụ ọtọ- Buhari

Mahmood Yakubu na Onyeisiala Buhari,

Ebe foto si, "MBuhari

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari enyela Inec iwu ka ha gbaa mbọ hụ na mmeju ntuliaka ndị enwere gara nke ọma, na-enweghị wuruwuru ọbụla.

Buhari nyere ntụzịaka oge Yakubu du ndị ọrụ ya gara leta Buhari nobi Gọọkmenti ụbọchị Tuzde.

Buhari kwuru sị : A kwụsiri m ike na nkwado ntuliaka kwụ ọtọ. Ụmụ Naịjiria kwesịrị iwe ohere ịtụnyere onye masịrị ha na enweghị tigbuo-zọgbuo ọbụla."

Inec gbara onyeisiala ama na e kpechaala ikpe niile gbasara ntuliaka ndị kwesịrị ibi n'ụlọikpe mkpegharị.

Cheta na e nwere steeti ebe a ga-ementuliaka nakwa mpaghara a ga-enwe mmegharị maọbụ mmeju ntuliaka.

Onye gbagburu onye nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara n'Imo steeti?

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha na-esi imi n'ala ịmata onye gbapụrụ egbe gburu otu onye ka ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị na-azọ oche ọchịchị imeobodo na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Orlando Ikeokwu, gwara BBC Igbo na ọgbaghara a dapụtara ka ndị isioche okpuruọchịchị imeobodo 27 e wepụburu ewepụ gara n'okpuruọchịchị ndị ahụ kwuo na ha chọrọ iweghara ọchịchị.

Ha gbadoro aka na mkpebi ụlọikpe kachasị nyere n'isi Ekiti steeti, wee gaa iweghara ya bụ ọchịchị n'ihi na ha chere na ọ bụ otu mkpebi ahụ metụtara ha; mana ha zutere ndị uweojii bịara ịhụ na ihe niile gara n'anya ya - na-enweghi nsogbu ọbụla.

Mana nsogbu dapụtara ka ndị jibu ọchịchị na ndị a bịara ịnara ọchịchị malitere ise okwu n'okpuruọchịchị Isu, a gbaa mmadụ abụọ egbe, mana otu onye nwụrụ ka e bugara ha ụlọọgwụ.

Ikeokwu kwuru na ndị nke Imo steeti echeghi ka mkpebi ikpe nke ha pụta n'ụlọikpe, tupu ha azọwa onye ga-anọ n'oche, nke bụ ihe butere ọgbaghara a.

N'etiti ndịagha na Gọvanọ Babagana Zulum

Ndị agha Naijiria asaala Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum okwu n'ebubo o boro n'ihe onyonyo fegharịrị na nso nso na ndị agha na-ana aka azụ n'okporoụzọ ma kwuo na ha ga-ama imi n'ala inyocha ndị mere ya bụ ihe.

N'otu aka ahụ, ha rịọrọ ka onye ọbụla nwere ụdị mkpesa ahụ kpọtụrụ ha, kama ịgba ha otele n'anwụ etu ahụ.

N'ofesi,

Igwe mmadụ nuputara n'obodo Kerman dị na mba Ịran, ịkwa ozu Soleimani

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Igwe mmadụ nuputara n'ụzọ n'obodo Kerman dị na mba Ịran, ịkwa ozu Soleimani

Mmadụ iri anọ anwụọla ka ndị mmadụ na-ekwo ekwo ebe ha pụtara akwamozu Qasem Soleimani, bụ ọchịagha ndịagha Qud Force nke onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nyere iwu ka e gbuo, na mba Ịran.

Egwu ga-ada na Manchester

Manchester

Ebe foto si, Twitter/ManCity

Pep Guardiola ekwuola na enweghi ihe ga-eme ka ọ chịkọta ndị Manchester United maọbụ Real Madrid.

Nke a na-abịa dịka Manchester City bụ ndị ọ na-achịkwa, na Man Utd ga-akụkọta mpi n'Iko Carabao n'abalị Tuzde a.

Nwaanyị akwanyela nwunye di ya na nwa ọ kwọ n'azụ n'ime olulu mmiri

Nwata akwó n'azú

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii na Kano anwụchiela otu nwaanyị Hauwa Lawal kwanyere nwunye di ya na nwa o ku n'aka n'ime olulu mmiri.

Ndị uweojii kọwara na ọ bụ esemokwu ezinaụlọ ka o ji kpaa mkpamkpa ahụ.

A kpọpụtara Zuwaira Sani n'olulu ahụ mana o mechara nwụọ n'ụlọọgwụ ebe nwa ya nwoke natara ọgwụgwọ.

Ndị Naịjirịa ọ bụ gịnị?

Nwoke na nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Ị ma na aha Naịjirịa pụtara dịka obodo kachasị e le ndị na-enwe mmekọ n'Intaneti dịka ụlọọrụ Pornhub si kwuo.

Onye ọkammụta n'ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị ekwuola na ụmụ Naịjirịa na-eme mara mara n'ihu gwọmpịtị n'azụ.

N'ofesi

Akwamozu Qasem Soleimani na Tehran

Ebe foto si, AFP

Ihe karịrị mmadụ iri atọ anwụọla na nzogbu nzogbu malitere n'akwamozu Qassem Soleimani bụ ọchịagha mba Iran.

Cheta na Soleimani nwụrụ mgbe ogbunigwe mba Amerịka zipụrụ tụrụ ya.

N'egwuregwu,

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ngalaba na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF n'aha ịchafụ ebunyela ọgba bọọlụ Super Eagles Success Isaac ụkpa ekele dịka taa bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.

Ndị ọrụ Imo steeti

Ebe foto si, Prosper Uzoegbu

Gọọmentị Bauchi steeti ekwuola na ha chọpụtara ihe karịrị mmadụ nari ise nwụrụ anwụ ka na-anata ụgwọ ọnwa na steeti ahụ.

Ha kwuru na nke a gbara n'anwụ mgbe ha malitere ịme nyocha ndị ọrụ na Bauchi steeti.

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii n'Enugwu ji ike na ebube achụ ndị otu ọjọọ ọsọ n'Enugwu

Ndị uweojii n'Enugu anwụchiela ndị otu ha atọ nke a hụrụ n'ihe onyonyo ebe ha na-enye otu onye ntorobịa nsogbu maka ekwentị ya.

Ha kọwara na ha ga-ekpe ha ikpe imeụlọ ma kwuo na ndị uweojii anaghị akwado mwakpo ndị mmadụ n'ụzọ ọbụla.

Anyị kwụ chị m n'Iraq!

soleimani

Ebe foto si, Reuters

Ọ bụ gọọmentị mba Amerịka ebe ha na-agọpụ aka na ụkwụ ha n'akwụkwọ ozi na-efegharị na-ekwu na ha na-achọ ịkpọpụta ndị agha ha ebe ha nọ na mba Iraq.

Cheta na ndị omeiwu mba Iraq na-akpọ oku ka ndị agha mba Amerịka kwara laa n'ihi ọgbaghara ha sunyere na mba Iran dị n'akụkụ ha.

Ọ dị ka Arsenal ekuliela n'ụra ugbua

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ha ji otu ọkpụ goolu merie Leeds mgbe ha zutere onwe ha n'agba nke atọ n'asọmpị Emirates FA Cup

Ha ga-ezute Bournemouth n'agba ọzo n'Abia.

Gee akụkọ n'ime otu nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile