Tinubu si na ya amaghị maka ọrụ ọhụ APC enyere ya

Ebe foto si, Buhari's Twitter
Bola Tinubu agbarala isi onwe ya ka Muhammadu Buhari kpọchara ya aha ịbụ onye okpeudo n'etiti ndị nọ n'otu pati APC.
Maka ịchọpụta ụzọ a ga-esi akwụsị ndị mmadụ isi na otu pati APC pụọ, onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari họpụtara Tinubu ka ọ nọrọ n'ọnọdụ onye ga-ahazi ma gbaa mbọ ịhụ na udo dị n'ime pati ha.
Okwuru na ụfọdụ ihe ọ ga-eme bụ ịkwụsị esemokwu dị n'etiti ndị otu ha, ndị isi otu ha na ndị ji ọkwa ndọrọndọrọ n'ụfọdụ steeti dị na Naịjirịa.
Kama Tinubu gọrọla aka ya n'ime ihe gbasara okwu a Buhari kwuru na social media:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ihe Tinubu kwuru
Ka BBC kpọkuru otu onye na-ekwuchitere Tinubu ọnụ bụ Tunde Rahman, o kwuru sị na onwebeghi ihe ha nụrụ.
Ọ sị "Anyị enweghị ike ikwu ihe ọbụla gbasara ya ugbua maka na ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ejibeghi aka ha gwa Tinubu ihe ọbụla.
Nanị n'ime akwụkwọ mgbasa ozi ka anyị si na-anụ ya. Anyị jiri aka anyị nụ n'ọnụ ndị nọ n'ọkwa ọchịchị, anyị ga-enwezi ike kwuputa."
Ihe nke a pụtara
Otu onye ọkachamara n'ihe gbasara pọlitiks bụ Lasisi Olagunju kwuru sị na "ọ bụ ihe na-agaghị enwe isi ma ncha"









