Porn sites: Enugu na steeti ndị ọzọ kachasị chọọ ihe 'nkiri 'gay' na 'Lesbian'

Ebe foto si, Getty Images
Enugu, Imo na Anambra so na steeti ndị kacha chọọ ihe nkiri "Gay" nakwa "Lesbian" n'afọ 2019 dịka "Google search trends" nke 2019 si gosipụta.
Ebe Bayelsa, Enugu nakwa Edo so na steeti ndị mbụ kachasị chọọ ihe gbasara mmekọ nwaanyị n'afọ 2019 na Naịjirịa.
Lee tebụlụ ya ebe a na ogo pasenti ya.
Steeti ndị kacha chọọ ihe nkiri 'gay' (Source: Google Search Trends 2019)
Naịjirịa bu ụzọ n'obodo kacha achọ ụmụ nwaanyị buru ibu gba ọtọ - 'PornHub Insights'

Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa bụ obodo e ji oke ikpere chukwu mara mana ọ kana gbagọjụ ndị mmadụ anya etu ha si bute ọzọ na mba kachasị ekiri ụnwaanyị gba ọtọ n'ọbaozi PornHub.
Ụlọọrụ Pornhub wepụtara ozi a na webụsaitị ha ka ha na-eme nchịkọta ndị ka wee chọta webụsaitị ha n'afọ 2019.
Ha depụtara na Naịjiria bu ụzọ na mba kachasị chọta ụmụwaanyị buru ibu na-agba ọtọ na webụsaiti ha n'ọnwa Maachị n'afọ 2019 , ebe Ghana , Kenya na Egypt na-eso ha n'azụ.

Ebe foto si, Pornhub.com/Insights
PornHub kwukwara na ndị mmadụ agaghị na webụsaitị nnukwu n'oge ezumike.
Gịnị kpatara nke a?
Ọkammụta Mmirimmasinachi Ekechukwu na-ahụ ihe gbasara maka mmekọrịta ahụ kwuru na ụmụ Naịjirịa na-emekarị mara mara n'ihu gwọmpọtị n'azụ.
O kwuru na o nweghị ihe mmapụ obi dị na ya makana nwoke maọbụ nwaanyi nwere ebumnuche ha nwere wee na-aga na ya bụ webụsaitị.
Mana agwa ndị nsọ ụmụ Naịjirịa meziri ka ọ dịka nchọpụta ọ bụ arụ.
Gbasara akụkọ kwuru na ụmụ nwaanyị kachọ mmekọrịta nwaanyị na nwaanyị ibe ha na webụsaiti ahụ, Ekechukwu kwuru ihe a riri ya ọnụ.
Mana o kwuru na o nwereike ị bụ obi mgbawa ụmụnwoke na-enye ha butere nke a.
Ọ rịọrịọ ka ụmụ Naịjirịa kwụsị mara mara n'ihu gwọmpọti n'azụ.










