2020 Prophecies: Ihe Bishop Katọlik gwara Mbaka maka amụma o buru n'isi Hope Uzodinma

Ebe foto si, Facebook/Adoration Ministry Enugu Nigeria
Ụfọdụ ndị ụkọchukwu Katọlik na ndị ntorobia Imo steeti etinyela ọnụ n'ịkatọ amụma Fada Ejike Mbaka kwuru ebe ọ sị na Hope Uzodinma zọrọ oche n'okpuru APC, ga-eweghara ọchịchị steeti ahụ n'afọ a.
Bishop dayọsis katọlịk dị n'Ụmuahịa bụ Luscious Ugorji kwuru na ụka katọlịk ebe Mbaka bụ ụkọchukwu "anaghị agba afa ka ndị dibịa".
"Nke mere na ha adịghị enye ndị ụkọchukwu ha ikike ikpebi onye ga-emeri n'ikpe dị n'ụlọikpe." dịka ụlọ mgbasaozi "Sun newspaper" si depụta.
N'otu aka ahụ, ndị ntorobia nke Isdore Chukwuemeka na-anọchiteanya ha, kwukwara sị ka Mbaka hapụ gọvanọ Emeka Ihedioha aka n'ihi na ndị mmadụ tụnyeere ya makana ọ masịrị ha, ma kwuo na ọrụ Ihedioha na-arụ n'Imo masịrị ha.
A gba m aka ka m gbuchara enyi m nwaanyị:
Adeeko Owolabi bụ nwataakwụkwọ dị afọ iri abụọ na atọ e jidere maka iso kpaa nkata igbu enyi ya nwaanyị, ekwuola na ọ hụghịdị ihe o ji maka ya kpaa arụ a.
Owolabi kwuru na o gburu Favour enyi ya nwaanyị ka o jiri ya gwọọ ọgwụ ego, mana ka ọ gwọchara ya bụ ọgwụ, o jighi rose, o jighi ndawịị.
Ọkụ gbara n'Ọyọ steeti

Ọkụ agbapịala ngwongwo ndị mmadụ ruru nde kwuru nde naịra n'ahịa dị n'obodo Akesan dị n'Ọyọ steeti.
Ka ndị mmadụ na-ewe iwe ọkụ ọgbụgba ahụ, mgbọ tụrụ otu nwatakịrị dị afọ iri na anọ ebe ahụ, kama ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha na-achọ onye gbapụrụ mgbọ ahụ makana o sighi n'aka ndị otu ha.
Ọkụ na-agba n'Ọstrelia

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mmadụ atụkọtala nde dọla iri na atọ n'ime ụbọchị abụọ, a ga-eji nyere aka menyụọ ọkụ oke ọhịa na-agba n'obodo New South Wales dị na mba Ọstrelia, dịka onye ọkpaọchị a ma ama bụ Celeste Barber rịọrọ arịrịọ.
Ọkụ a ataala isi ihe ruru mmadụ iri abụọ na anọ ma chụpụ ihe karịrị puku iri abụọ n'ụlọ kemgbe ọ malitere.
N'egwuregwu,
Liverpool na Everton ga-ezute ọzọ n'ọgbọegwuregwu Anfield ebe ha abụọ ga-ama aka ịmata onye ga-epiobanye n'agba nke anọ n'asọmpi Iko FA.
Ndụmọdụ maka oke ụgụrụ na-ekunu?

Ebe foto si, @jidesanwoolu
Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti, adụọla ndị mmadụ ọdụ ka ha gbado anya iji gbochie ọkụ ọgụgba n'oge ụgụrụ a.
Na ndụmọdụ ya, o kwuru sị ka ndị mmadụ cheta na-agbanyụsị nakwa kwụpụta ihe ndị na-eji ọkụ latrik arụ ọrụ ma ha na-apụ apụ, nakwa gbaa mbọ nwee ihe e ji emenyụ ọkụ nke bekee kpọrọ extinguisher.
Trump ka na-aba mba?

Ebe foto si, Reuters
Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka ekwuola sị na mba ya na-ede ọdọ iri ise na abụọ dị na mba Ịran ha ga-ebu ọgụ agakwu ma ọ bụrụ na Tehran buru ụzọ wakpoo ndị Amerịka.
Trump kwuru na Amerịka achọghị mmaja ọzọ sitere n'aka ndị Ịran, ma ọ bụghị ya, ha agaghị egbu oge iwakpo ha ebe ọ ga-eru ha n'ọkpụkpụ.
Onye ka ike ga-agwụ?

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Chelsea na Nottingham Forest ga-akwata ya na Stamford Bridge taa, ịmata onye ga-agafe na onye ga-efere asọmpi FA aka, dịka a na-akwado ibanye agba nke anọ.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











