New Year 2020: Amụma Mbaka maka Hope Uzodinma, Buhari ekwuola okwu, bịa gere ozi ndị ọnụ na-eru n'okwu
Amụma Mbaka maka afọ 2020

Ebe foto si, Adoration Ministry/ Getty Images
Afọ ọhụrụ 2020 eruola, iji nabata ya, ndị ọnụ na-eru n'okwu ekwuputewela ebumnobi nakwa nchekwube ha nwere maka ya.
Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu ụlọ ụka e ji 'Adoration Ministry' mara, buru amụma ka ọ na-aka ụka isi abalị 31 nke ọnwa Disemba gafeta ụbọchị mbụ nke Jenụwarị.
N'amụma o buru, o kwuru na mgbanwe ga-abịa n'ọchịchị Imo steeti n'afọ 2020; na "Chukwu ga-ehicha ndị Imo steeti anyammiri".
Ọ gara n'ihu sị na ọ na-akpọku Hope Uzodimma zọrọ oche gọvanọ Imo steeti n'okpuru APC, ka o bilie gaa were ọchịchị Imo n'afọ a.
O kwuru sị na ọ na-enye ya ikike ime mmụọ 'spiritual empowerment' iji were ọchịchị.
Gbasara Naịjirịa, Mbaka kwuru na a ga-enwe ihe juru anya gbasara ọchịchị n'ogo federalụ nakwa steeti nke ga-ebute mgbanwe.
Anyị chọrọ Biafra, ọ bụghị 'restructuring- Nnamdi Kanu

Ebe foto si, @MaziNnamdiKanu
Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola kwusie ike na ihe ya na ndị otu Ipob chọrọ bụ Biafra ọ bụghị nhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara.
Kanu, onye kwuru nke n'ozi afọ ọhụrụ o wepụtara kwuru na onweghị ka ndị ọnụ na-eru n'okwu nye ohere maka nhazighari Naijiria.
"Ihe anyị chọrọ bụ Biafra, o nweghị ihe ọzọ."
"Anyị agaghị atufu mbọ inweta Biafra maka 'restructuring'."
O gara n'ihu kwuo na ihe mere ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria achọghị ka onye Igbo bụrụ Onyeisiala bụ na ha na-etụ egwu na onye Igbo bangye n'ọkwa ahụ ọ ga-ahazigharị Naijiria.
Umaro Sissoco Emballo enwetala ọkwa onyeisiala Guinea Bisau

Ebe foto si, AFP
Umaru Sissoco Embalo emeriela na ntụlịaka onyeisiala mba Guinea Bissau
Embalo onye bụbu Prima Minista na mba ahụ site n'afọ 2016 rue afọ 2018 ji vootu dị pasent 54% merie.
Embalo, onye kụbụrụ Domingos Simoes Pereira na asọmpi ahụ ga-anọchi onyeisiala mba ahụ bụ Jose Mario Vaz onye achịtaghị aja na ntuliaka ahụ e mere.
Pope arịọla mgbaghara maka ịkụ nwaanyị ihe

Onyeisi ụka Katọlik na mba ụwa bụ Pope Francis ekwuola na o bụ n'ihi e jideghịnwu onwe ya mere ya ji kụọ nwaanyị ihe n'emume ịba afọ ọhụrụ nke 2020 e mere na Peter's Square.
N'ihe onyonyo wuru na soshal midia, Pope Francis gbarụrụ ihu dịka otu nwaanyị n'ime ndị ọbịa bịara emume ahụ jidere ya ma dọọ ya aka n'ike.
Nke mere ka ọ kụ ya bụ nwaanyị ihe n'aka ugboro abụọ dịka ọ na-azọrọ onwe ya.
Mana Pope nọrọ n'ụka afọ ọhụrụ were rịọ gbaghara sị, "Anyị anaghị ejidenwu onwe anyị ọtụtụ mgbe."
"Ọ meela mụ onwe. Gbagharanụ m maka atọghị ezi ụkpụrụ ụnyaahụ."
Onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ọha okwu
Kama ịgwa ọha okwu site n'ihe nkiri dịka onye ọbụla na-atụ anya ya, Buhari si n'elu soshal midia ya zipu ozi nnabata afọ ọhụrụ ya.
Ebe ahụ, o kwuru etu ọ ga-esi rituo ma wepụ aka n'ihe gbasara ịzọ ọchịchị n'afọ 2023.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ọ gara n'ihu kwuo na ihe kachasị ya mkpa bụ inweta ezi nchekwa na obodo na ụmụ Naịjirịa. Lee ihe ndị ọzọ dị mkpa o kwuru.
- Ọchịchị m ga-agba mbọ hụ na anyị sonyere ihe iwu ala anyị na-ekwu
- Atụmaatụ ọhụrụ anyị biputara gbasara akụ na ụba Naịjirịa bụ nke ga-achụpụ ụbịam na ndụ ndị ala a.
- Ọchịchị m na-ahazị ụgbọ ụlọko ga-esi Lagos gawa Kano
- Anyị na-aga n'ihu n'ọrụrụ Second Niger Bridge, Lagos - Ibadan Expressway nakwaAbuja - Kano highway
- Ọchịchị m ga-ewepụta ohere ọhụrụ gbasara ikọ ubi
- A ga-emepekwa ọdọụgbọelu Enugu, Lagos, Kano, Maiduguri n'afọ 2020 a
Ego si mba ofesi bata Naịjirịa

Ebe foto si, Twitter/@nidcom_gov
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ụmụ Naịjirịa bi na mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuola na ego ụmụ Naịjirịa bi mba ofesi webatara n'afọ 2019 pụtara ijeri dọla iri abụọ na ise.
Dabiri kwuru na ego ahụ ga-akarị maka na ọ bụchaghị akụkụ niile e si zibata ego ka ha lebara anya oge a na-eme mgbakọ ahụ.
O kwukwara na ọtụtụ ndị bi na mba ofesi na-ekwu na o kwesịrị ka e nye ha ohere iso na-atụ vootu na Naịjirịa n'ihi na ha na-atụnye nnukwu ihe na akụnụba Naịjirịa.
Dabiri kwuru na ndị omeiwu kwesịrị ileba anya etu a ga-esi mee ka ndị Naịjirịa bi n'ofesi soro na-atụ vootu.
Adeboye kwukwara nke ya

Ebe foto si, Getty Images
Ụkọchukwu ndị Redeem Christian church of God bụ Adeboye Enoch kwuru na gị na ndị be gị ga-enwe ọṅụ akwụsị akwụsị.
O kwuru na ị ga-enwe mmeri akwụsị akwụsị, nke pụtara na ị ga-enwe ọtụtụ mgba mana ị ga-emeri.
N'okwu ya, "Ala ga-ama jiji dịka nwa akwụkwụ na-adọ, nke a ga-eme n'ọtụtụ ebe a na-atụghị anya."Ọ rịọrọ ka ekpere Naịjirịa ekpere, Chukwu ga-enye aka.
"A ga-nwe mgbanwe ọchịchị n'ọtụtụ mba, ụfọdụ mgbanwe ọchịchị a ga-eji nsogbu bịa ebe ụfọdụ ga-aga nkeọma."
Chris Oyakhilome agbajọghị

Ebe foto si, @LoveWorldEvents
Onye ndu ụka Christ Embassy akpọrọ Ụkọchụkwụ Chris Oyakhilome kpebiri na afọ 2020 a bụ nke izuoke.
O kwuru na-enwere owuwe ihe, nwekwa owuwe ihe kachisinu mana ihe ezipụrụla na mmụọ bụ owiwe ihe dị ukwuu.
O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-aka ụka mgafe ịbanye afọ ọhụrụ.
Ihe David Oyedepo nke ụka "Winners Chapel" kwuru

Ebe foto si, Winner Chapel WorldWide
Ụkọchukwu Oyedepo kwuru na ụmụ Chineke ga na-eme ihe ọma n'enweghị mgbochi.
O kwuru na ha ga-enwere onwe ha gbasara ihe ọ bụla na-akwụsị ha i me ihe ịribama.










