New Year 2020: Okwu ise gbara ọkpụrụkpụ Nnamdi Kanu kwuru n'ozi afọ ọhụrụ

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, @MaziNnamdiKanu

Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ihe mere ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria achọghị ka onye Igbo bụrụ Onyeisiala bụ na ha na-ekwu na ndị Igbo ga-ahazigharị Naijiria nke bekee kpọrọ "restructuring."

Kanu onye kwuru nke n'ozi afọ ọhụrụ o wepụtara kwuru na ya na ndị otu ya kwụsiri ike na okwu nnwereonwe Biafra.

O kwuru sị: "Biafra ga-abịa na mmezu ka anyị ka dị ndụ."

"Ihe anyị chọrọ bụ Biafra, o nweghị ihe ọzọ."

"Anyị agaghị atufu mbọ inweta Biafra maka 'restructuring'."

"Onye ọbụla na-agba mbọ 'One Naijiria', achọghị ọganihu ndị Owuwa-Anyanwu".

A ga-amụ ụmụ 26,039 na Naịjirịa taa - Unicef

Jidenna Jesse Osondu

Ebe foto si, Abia Info

Nkọwa foto, Jidenna na-anyị kilogram atọ oge a mụrụ ya

Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka bụ Unicef, ekwuola na a ga-amụ ihe karịrị ụmụaka puku narị atọ na iri itoolu na abụọ (392,078) naanị n'ime taa bụ mbido afọ ọhụrụ.

N'ime ọnụọgụgụ ahụ, ha kwuru na Naịjiria ga-eketa ụmụ puku iri abụọ na isii na ụma (26,039) n'ime ndị a ga-amụ taa.

Unicef ji ohere ahụ kpọkuo ndị mmadụ ọkachasị gọọmentị mba dị iche iche, sị ka e tinyekwuo ego n'ihe gbasara nlekọta ndị ọrụ ahụike.

Ha sị ka e nye ha ezi ọzụzụ, nye ha ezigbo ọgwụ ha ga-eji na-elekọta nwaanyị dị ime, nne na nwa a mụrụ ọhụrụ nakwa igbochi ọgbatughie nwereike ịdakwasị nwaanyị dị ime.

Mbaka buru amụma

Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry/ Getty Images

Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu Katọlik ọnụ na-eru n'okwu, ebuola amụma ebe ọ sị na mgbanwe ga-abịa n'ọchịchị Imo steeti n'afọ 2020; na "Chukwu ga-ehicha ndị Imo steeti anyammiri".

Mbaka kwuru sị na ọ na-enye Hope Uzodimma zọrọ oche n'okpuru APC ikike ime mmụọ ọ ga-eji bilie weghara ọchịchị steeti ahụ.

Buhari kwukwara nke ya

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwukwaala ọzọ na ọ gaghị azọ ọkwa ọchịchị n'afọ 2023 dịka akụkọ na-efegharị.

O kwuru nke a n'ozi nnabata afọ ọhụrụ o nyere taa.

Arsenal ga-ezute Manchester United

Ọ ga-akpọtụ akpọtụ taa mgbe Arsenal ga-anabata Manchester United n'Emirates.

Dimkpa abụọ a ga-agba egwu onye ike ga-agwụ, ịma onye bụ eze n'etiti ha n'afọ ọhụrụ a.

Ọkụ erepịala ihe karịrị ụlọ 200

Ụlọ na-agba ọkụ n'obodo Mallacoota

Ebe foto si, Kurt Crnic via REUTERS

Nkọwa foto, Ụlọ na-agba ọkụ n'obodo Mallacoota

Ọkụ erepịala ụlọ narị abụọ ọzọ na mba Ọstrelia.

Ọkụ oke ọhịa a malitere kemgbe izu abụọ gara aga ka na-agba si n'obodo fere n'obodo dịka New South Wales, Victoria na East Gippsland.

Ụlọikpe etinyela ọnụ n'okwu nwaanyị megburu odibo ya:

Amaka Otolehi

Ebe foto si, Nigeria Police

Ụlọikpe ekwuola ka a ka jichie Amaka Otolehi bụ nwaanyị a hụrụ n'ihe nkiri ka ọ na-apịa odibo ya n'ala.

E jichikwara nwanne nna nwata ahụ bụ Jonathan Geowam, onye ghọgburu nne na nna ya sị na ọ na-etinye ya n'ụlọakwụkwọ.

Ọdọụgbọelu n'Ebọnyi?

Dave Umahi nke Ebonyi steeti

Gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na ha ga-arụcha ọdọụgbọelu a ga-esi na-efepụ Naịijiria na steeti ahụ n'ime ọnwa iri na asatọ na-abịa.

O kwuru na ebe a na-ejikarị ihe dị ka site afọ isii ruo iri arụ ọdọụgbọelu, na nke a agaghị egbu ụdịrị oge ahụ, mana ọ ga-eso na ndị kacha mma n'ụwa.

Chelsea ga-akwata ya taa:

Chelsea

Ebe foto si, Twitter/ChelseaFC

Ndị Chelsea ga-aga njem n'ụlọ ndị Brighton bụ ebe nwaafọ Naịjirịa bụ Leon Balogun na-agba bọolụ.

Chelsea na-atụ anya imerikwa ha nke ugboro iri dịka ha si emeribu ha mbụ.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Lee emume mgba ndị Imerienwe