First baby: Kedụ onye bụ nwa mbụ a mụrụ n'Alaigbo n'afọ 2019?

Ebe foto si, Donatus Owo
Na steeti ụfọdụ, ọ bụrụla omenala ịmata nwa mbụ a mụrụ n'afọ ọkachasị n'ụlọọgwụ ndị gọọmenti.
Nke a bụ emume nke nwaanyị mbụ bụ nwunye gọvanọ na steeti ụfọdụ ndị a.
Otu a ka o si gaa na steeti ndị ụfọdụ n'Alaigbo.
N'Ebonyi steeti

Ebe foto si, Donatus Owo
Nwa mbụ amụrụ n'Alaigbo ụnyahụ bụ ụbọchị mbụ n'afọ ọhụrụ bụ amụrụ n'ezinaụlọ Nwojiji Akata nke OtereUvie dị na Ishieke dị na okpuru ọchịchị Ebonyi n'Ebonyi steeti.
Amụrụ nwa a ka elekere iri an abụọ nke abalị kụrụ kpọm kwem na Mile 4 Mission Hospital Abakaliki, Ebonyi steeti.
Nwa ohuru a bụ nwaanyị dara 4.1kg nke pụtara na-orijuru afọ n'afọ nne ya. Nwunye gọọvanọ bụ Rachel Umehị gakwara lete ya na ụmụaka ndị ọzọ.
N'Anambara steeti,

Ebe foto si, Anambra State Government
Nwa mbụ a mụrụ n'afọ 2019 bụ Kamsi Eselu, onye a mụrụ oge o ji nkeji iri abụọ na anọ gafee elekere iri na abụọ (12:24 am) nke ụtụtụ Tuzde.
A mụrụ Kamsi na Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu Teaching Hospital dị n'Ọka, Anambara steeti.

Ebe foto si, Anambra State Government
Na Delta steeti,
Nwa mbụ a mụrụ na steeti ahụ bụ nwa a mụrụ n'ezinaụlọ Martin Dibia mgbe ọ kụrụ (1:20 am), ya bụ mgbe o ji nkeji iri abụọ gafee elekere mbụ nke isiụtụtụ na Federal Medical Centre Asaba.

Ebe foto si, NORBERT AMEDE
Odeakwụkwọ ukwu gọvanọ bụ Charles Aniagu sị na nwunye gọvanọ steeti ahụ bụ Dem Edith Okowa agaala leta ya bụ nwa nwaanyị nke nne ya bụ Ifeoma Martin Debie, ndị Issele-Asagba, Aniocha n'okpuru ọchịchị Aniocha-South nke Delta Steeti.

Ebe foto si, NORBERT AMEDE
N'Abia steeti,
Nwa mbụ a mụrụ na steeti ahụ bụ Jidenna Jesse Osondu, bụ onye a mụrụ mgbe o ji nkeji iri anọ na abụọ gafee elekere mbụ nke ụtụtụ.

Ebe foto si, Abia Info
A mụrụ Jidenna n'ụlọọgwụ Living Word Mission Hospital dị n'Aba, Abịa steeti.

Ebe foto si, Abia Info
N'Enugwu steeti,
Nwa mbụ a mụrụ n'Enugwu steeti bụ Akasike, bụ onye a mụrụ mgbe o ji nkeji asaa gafee elekere iri na abụọ nke isiụtụtụ.

Ebe foto si, Enugu State Government
A mụrụ ya n'ụlọọgwụị ESUTH Parklane dị n'Enugwu.

Ebe foto si, Enugu State Government
Akụkọ ga-amasị gị:









