Ụmụ nwaanyị chọrọ ka gọọmenti kwụwa ha ego ọmụgwọ

Ọmụgọ nne na nwa

Ebe foto si, Ebere Ekeopara

Nkọwa foto, Gọọmenti enyela Ginika na Chimemela, nwa ya ikike ị nọ ọmụgọ ọnwa anọ zụrụ ezụ

Ụmụ nwaanyị e kwola na ha chọrọ ka gọmentị kwụọwa ha 'ego ọmụgwọ-pụrụ-iche'. Nke a na-esote ozi gọmenti wepụtara na ha agbatịala oge ha ga-anọ nọ ọmụgwọ.

Ụmụ nwaanyị ndị ọrụ oyibo n'Enugwu steeti kelere gọọmenti etiti maka atụmatụ ọhụrụ ewepụtara nke kwuru na ụmụ nwaanyị ga na-anọzị ọmụgọ ruo ọnwa anọ, ha rịọrọ ka a kwụwa ha ego ọmụgwọ.

Na mkparịta ụka ha BBC nwere, ha nyere gọọmenti ndụmọdụ ka ha gbado anya hụ na ụlọ ọrụ niile mejupụtara iwu ahụ n'ụlọ ọrụ dị iche iche.

Ọmụgọ na Ọrụoyibo

Ebe foto si, Ngozí Ugwu

Nkọwa foto, Ngozị Ugwu bụ onye ọrụ ọyibo nwere olile anya n'iwu ọhụrụ a ga-abara ya uru.

N'okwu ya Ngozi Ugwu rịọrọ gọọmentị ka ha nyere ụmụnwaanyi ọkachasị ndị ọrụ gọọmentị aka belata ahụhụ ha na-ata na-ịmụ nwa site na ịkwụ ha ego ọmụgọ pụrụ iche.

Ọ sịrị, "Ọ bụghị nanị ịnye ụmụmwanyị ọnwa anọ bụ ihe anyị chọrọ, ọ ga adị mma ka gọọmentị kwụwa ụmụ nwanyị Ego-ọmụgọ pụrụ iche iji nyere ha aka n'ọrụ ezinaụlọ."

Ugwu kwakwara arịrị na ụfọdụ ndị na- ewe ọrụ na- ajụzị iwe ụmụ nwanyị ka na amụ nwa n'ọrụ. Makana ha na-atụ egwu na ha nwere ike mụọ nwa gaba ọmụgọ ọnwa ole ma ole.

Ọkaiwu Uche Aroh katọrọ ụlọọrụ dị icheiche kwụrụ onwe ha ndị na-achụ ụmụnwaanyị dị ime n'ọrụ ma ha mụọ nwa, ebe ụfọdụ ji obi ọjọọ na-akwụ nwaanyị nọ n' ọmụgwọ ọkara ụgwọ ọnwa ya ganye na ọ laghachite n' ọrụ.

Ọmụgọ na Ọrụoyibo

Ebe foto si, Ebere Ekeopara

Nkọwa foto, Ọkaiwu Uche Aroh bụ ọkaikpe onye ọrụoyibo n'Enugwu

Aro nyere ụmụnwaanyị ụdị ihe metụtara ndụmọdụ ka ha gbaa ụlọọrụ mere etu a akwụkwọ n'ụlọikpe.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ