Gịnị mere ụmụnwaanyị Afrịka ji eghe ntutu ha eghe?

Ntutu

Ebe foto si, Chimma na Ogoo

Nkọwa foto, Ntutu ndị Afịrịka etu Chukwu si kee ya na nke e ghere eghe

Otu ihe onye mba ofesi kwuru oge ọ hụrụ ntutu otu nwaanyị mba Naịjirịa bụ na ọ dị ogbo.

O kwuru nke a maka na ọ dịghị fịrị fịrị ka nke a ha, ntutu ụmụnwaanyị Afịrịka na-esi ike, juo eju, nwee ume ma rịgọọ arịgọ n'ụdị nke ya.

Ọ naghị anwụla anwụla etu nke ndị mba dị na Yurop maọbụ Amerịka si adị.

Ezenwaanyị

Ebe foto si, Ezenwaanyí Facebook

Isi owu

Ebe foto si, Amarachi Atama/ Facebook

Mana ọ dị ka ụmụnwaanyị Afrịka aka hụ ntutu nke ndị ọcha n'anya karịa ụdị nke Chukwu nyere ha.

Nke a bụ maka na ọtụtụ ụmụnwaanyị Afrịka na-eji akụrụngwa dị iche iche a na-akpọ 'Relaxer' na Bekee wee na-ete n'isi ha ka o were gbatịa dị ka nke ndị ọcha.

Ọtụtụ ndị mmadụ ajụọla ihe kpatara ha jiri hapụ ọmarịcha ntutu Chukwu nyere ha jiri akụrụngwa kemịkal na-ete na ya.

Ogoo

Ebe foto si, Ogoo

Ha jirichaa kemịkaal ahụ, ha arịgọọ ya ka ọ gbatịa dịka nke ndị ọcha.

Onye na-eme isi

Ebe foto si, Getty Images

BBC Igbo gbara ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị na-eghe ntutu ha eghe ka ha kwuo ihe kpatara ha ji eme ya, lee ihe ha kwuru;

Akara ntụ-ntụ

Ihe mere anyị ji eghe ntutu anyị eghe

  • Ọ na-aka ama mma ma e gheesịa ya eghe: Ha kwuru na ntutu ha na-aka enwuke enwuke ma e jiri kemikaal ghee ya. Nke a bu maka na ha kwuru na ntutu ndị Afrịka na-adị ka ihe churu echu
  • Ọ na anwụla anwụla dị mfe ijikọ: Otu ihe e ji eghe isi bụ na e ghesịa ya, ọ nwụlaa, ọ gaghịzị adị ike etu Chukwu si kee ya nke mere dịka ha si kwuo, ọ na-akara ha mfe ijikọ maa mee etu ọbụla ha chọrọ
  • Ntutu anyị na-afụ ụfụ: Ụmụnwaanyị anyị gbara ajụjụọnụkwuru na ha anaghị etinyeli mvọ n'ime ntutu ha ma ọ bụrụ na ha eteghi ya ihe maka na o siri ike nke ukwu, mana kemikaal na-eme ya mfe ivọ
  • Ọ na-adị mfe ịsa mmiri: Ha kwuru na ha nwaa anwa wụọ ntutu ha mmiri ma egheghi ya eghe, ọ na-adị ka ogbo, ọ naghị ekwe ọsịsa gụnyere na ọ na-eri mmiri ma na eri ncha. Ha kwuru na ha nwereike ịnọ elekere abụọ maọbụ atọ ebe ha na-asa isi mana ha ghee ya eghe, ọ naghị egbu oge
  • Ịkpa isi anaghị arịa ahụ ma na aka anọ ọdụ: Ụmụnwaanyị a kwuru na ọ bụrụ na ha egheghi ntutu ha eghe, ha kpasịa isi, ọ naghị anọ ogologo oge, ọ kaa ma na ọ bụrụ na ha ghee ya eghe, ha ga-ebu otu isi ha kpara ma butee ya aka
  • Maka na ndị ibe anyị ghere isi ha: Ụfọdụ n'ime ha kwuru na ọ bụ ndị mmadụ kwanyere ha n'ighe isi. Ha kwuru na oge ha bidoro, ọ bụ ndị ọyị ha kwanyere ha maka ndị ha hụrụ n'ihe onyonyo mere ka ọ bụ ighe ntutu ka mma.
Akara ntụ-ntụ

Ihe ha kwuru nwereike inwe isi mana ụmụaanyị amakwa ụdị ihe e ji eme kemicaal ahụ ha na-awụnye n'isi na ihe ọ na-eme n'ahụ ha?

Onye ghere ntutu ya

Ebe foto si, Getty Images

Ihe kemikaal 'relaxer' na-ebute

  • Ndị na-eme nyocha kwuru na ụdị akụrụngwa siri ike e ji eme ya nwereike imeru ndị na-etinye ha n'isi ahụ
  • Ndị na-eji ya bụ 'relaxer kwuru na ha chọpụtara na ntutu ha na-achagharị ma ha gaa n'ihu na-etinye ya ọtụtụ afọ
  • Ọ na-eme ntutu adapụsịa: Agbanyeghi na ntutu ndị Afịrịka na-eju eju, kemịcaal 'relaxer' nwereike ime ntutu adapụsịa
  • Ọ na-ericha ntutu site na ịgba ndị mmadụ ọkụ n'isi: Ụfọdụ ndị anyị gbara ajụjụọnụ kwuru na ụfọdụ oge, ntutu ha richara site n'ụdị 'Relaxer' ha tinyere maọbụ nke bara ha ọnya n'isi
  • Nchọpụta a ka na-enyocha enyocha kwuru na ndị na'eghe isi ha oge ọbụla nwereike inwe akpụ ara kansa ọsịsọ karịa ndị na-adịghị eji ya.

Ọ bụ eziokwu na ntutu ndị Afịrịka siri ike ma na ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ụzọ iji mee ka ọ dị mfe ivo ka ụmụnwaanyị Afịrịka ghara itinye onwe ha na nsogbu site n'ịghe ntutu ha.

Akara ntụ-ntụ