Ụmụnwaanyị na-egoli maka mbugo ọnwa ọmụgwọ

Ụmụnwaanyị etoola gọọmentị etiti maka iweli ọnwa ole nwaanyị mụrụ nwa na-anọ ezumike ọmụgwọ tupu o bidokwa ọrụ.
Na mkparịtaụka ha na onye ntakụkọ BBC nwere, ha kwuru na ọ ga-enyere ụmụnwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ohere ileta nwa ha ma letakwa onwe ha.
Nkiru Santos kwuru: "Ọ dị mma, ọ ga-enye nne ohere iji leta nwa ya ma zukwa ike ọfụma."
Santos onye bụ onyenkuzi gara n'ihu kwuo na "ugbua ọ ga-adịzị mma ka mmadụ turu ime"
N'okwu ya, Chika Obika kwuru na o ga-ebelata oke ọnwụ ụmụaka ọhụrụ na-anwụ n'ihi enweghị ezi nleta.
"O nwere ọtụtụ ụmụaka na-anwụ n'ihi na ha butere ọrịa maka na ha na nne ha anọkọghị ọfụma. Ọ ga-enyekwa ohere ka nwaanyị doo ahụ."
Mịnịsta na-ahụ maka okwu gbasara ọrụ bụ Chris Ngige kwupụtara n'ụbọchị Tuusde n' ọgbakọ ọrụ mba ụwa na-aga n'ihu ugbua na Geneva dị na Swizaland na Gọọmenti etiti ebulitela ọnwa ole nwaanyị na-anọ ọmụgwọ site na ọnwa atọ rue ọnwa anọ.
Ngige gwara ndị bịara nzukọ ahụ na a machiela nb ndị na-ewe ndị mmadụ n'ọrụ gọọmentị nakwa nke ụlọọrụ kwụrụ onwe ha n'ala anyị ịchụ nwaanyị ọbụla n'ọrụ maka ọnọdụ alụmdị maọbụ ịmụ nwa.
Ọ gara n'ihu kwu sị," Iwu ji ndị nwe ụlọọrụ n'ala Naijiria iwepụtara ụmụnwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ebe nlekọta nwa n'ụlọọrụ ha.
"N'ọrụ gọọmentị,, e mere ka ọnwa ọmụgwọ site na izuụka iri na abụọ gbalite rue izuụka iri na isii; iji nye ohere ka nwa na nne nweta onwe ha ọfụma, ọkachasị ka ọsi gbasa inye nwa ara."
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
"Naa mgbakwụịnye, ntarahaụhụ ọbụla a chọrọ nye nwaanyị nọ n'ọmụgwọ ga-echere ganye na ohere ezumike ọmụgwọ akwụsị."
Ngige kwukwara na mmabido ọhụrụ a bụ iji chekwa ụmụnwaanyị nọ n'ọmụgwọ n'ala Naijiria.








