Agụiyi egbuola ụkọchukwu na-eme mmiri chukwu

Agụiyi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Agụiyi na-ebi na ezu ụfọdụ

Agụiyi adọgbuola ụkọchukwu na-eme ndị ụka ya mmirichukwu n'akụkụ ezu na mba Etiopịa.

Akụkọ sị na'aka ndị uweojii na ndị bi na mpaghara ahụ kwuru na agụiyi dọgburu Pastọ Docho Eshete ka ọ na-eme ndị otu ya mmirichukwu na nsọ ezu dị n'ugwu mba Etiopịa.

Ha gwara BBC na ụkọchkwu ahụ na-eme ihe ruru mmadụ 80 mmirichukwu ụtụtụ ụbọchị ụka oge ọdachi ahụ mere na mpaghara obodo Arba Minch dị na Merkeb Tabya districktị.

Otu onye bi ebe ahụ aha ya bụ Ketema kairo gwara BBC sị, "O mere onye mbụ mmirirchukwu, gafe n'onye nke abụọ. Na ntụmadị, agụiyi wụpụtara site n'ezu, nwụchie onye ụkọchukwu ma kwatuo onye ọ na-eme mmirichukwu."

Otu onye uweojii a kpọrọ Eiwnetu Kanko kọwara na ndị bi na-ebe ahụ na ndị ọkụazụ gbara mbọ iji zọọ Pastọ Docho mana mbọ ha amịtaghị mkpụrụ.

Eiwnetu si, "Ha gbalịrị nweta ozu ya... mana ha enwenwụghị ike zọọ ya."

Akụkọ ga-amasị gị: