Lee mba ndị meriri iko mbaụwa kemgbe e bidoro

Ebe foto si, Getty Images
Ka asọmpi iko mbaụwa nke 2018 na-ebido, lee ndị buliri iko n'afọ ndị gara aga kamgbe e ji bido.
A sọọla mpi ngwụcha iko mbaụwa ugboro 20, mana nke a ga-agba na mba Russia n'ọnwa Juun a ga-eme ka a mata ma mba ọzọ na-abụghị mba asatọ (8) buligoro ya a ga-ebutenwu ya.
N'ime mba iri atọ na abụọ (32) ga-asọ mpi nke afọ, asaa n'ime ha ebuliela iko a n'oge gara aga, ebe Italy bụ ndị buliri ya na-agaghị abịa asọ mpi a.
Lee mba ole buliri iko mbaụwa a.
Germany:

Ebe foto si, Getty Images
Germany ebuliela iko mbaụwa ugboro anọ. Ya bụ n'afọ 1954, 1974, 1990, 2014
Ugboro atọ ha buliri iko a bụ oge ha ka bụ mba a na-akpọ 'West Germany'.
Ha meriri Argentina n'egwuregwu ngwụcha iji bulie iko nke afọ 2014. Nke a mere ha ndị Europe mbụ ga-ebuli iko mbaụwa n'ala ndị South America.
Mba Brazil hibere asọmpi nke afọ ahụ.
Germany ga-agba mbọ ịhụ ma ha a ga-ejidenwu nturuugo ha nwetara 2014 n'afọ 2018 a.
Spain:

Ebe foto si, Getty Images
Spain buliri iko mbaụwa n'afọ 2010.
Ha buliri iko ka ha meriri Netherlands n'egwuregwu ngwụcha ha.
Mba South Africa hibere asọmpi nke afọ ahụ.
Italy:

Ebe foto si, Getty Images
Italy ebuliela iko mbaụwa ugboro anọ, ya bụ 1934, 1938, 1982, 2006.
Ha bụ nke abụọ na mba ndị kachasị bulie iko mbaụwa kemgbe e bidoro ya.
Ha zutere mba France n'egwuregwu ngwụcha nke ha ji bulie iko nke 2006.
Mba Germany hibere asọmpi nke afọ ahụ.
Brazil:

Ebe foto si, Getty Images
Brazil bụ mba kachasị bulie iko mbaụwa kemgbe e bidoro ya. Ha ebuliela iko a ugboro ise, ya bụ 1958, 1962, 1970, 1994, 2002.
Ha bụkwa mba kacha sonye n'asọmpi a nke bekee kpọrọ 'participation', maka na enwebeghị asọmpi iko mbaụwa ha abịabeghị.
Ha meriri mba Germany n'egwuregwu ngwụcha nke ha ji bulie iko nke 2002.
E hibere asọmpi nke afọ ahụ na mba Korea na Japan.

Ebe foto si, Getty Images
Brazil meriri Italy iji bulie iko nke 1994 e hibere na mba America.
France:

Ebe foto si, Getty Images
Mba France buliri iko mbaụwa n'afọ 1998.
Ha buliri iko ka ha meriri Brazil n'egwuregwu ngwụcha ha.
E hibere asọmpi nke afọ ahụ na France ma bulie iko na be ha.
Argentina:

Ebe foto si, Getty Images
Mba Argentina buliri iko mbaụwa ugboro abụọ n'afọ 1978 na 1986.
Ha buliri iko mbụ ha ka ha meriri Netherlands n'egwuregwu ngwụcha nke afọ 1978.
E hibere asọmpi nke afọ 1978 n'Argentina ma bulie iko na be ha.
E hibere asọmpi nke afọ 1986 na Mexico, ebe ha meriri West Germany n'egwuregwu ngwụcha.
England:

Ebe foto si, Getty Images
Mba England buliri iko mbaụwa n'afọ 1966.
Ha buliri iko ka ha meriri West Germany n'egwuregwu ngwụcha ha.
E hibere asọmpi nke afọ ahụ n'England ma bulie iko na be ha.
Geoff Hurst so n'otu England buliri iko mbaụwa n'afọ 1966, bụ onye a gaghị echefu echefu maka na ọ bụ naanị ya bụ onye nyerela goolu atọ n'ime otu egwuregwu a kpọrọ 'hat-trick', na ngwụcha iko mbaụwa.
Uruguay:

Ebe foto si, Getty Images
Mba Uruguay buliri iko mbaụwa ugboro abụọ; n'afọ 1930 na 1950.
Ha buliri iko mbụ ha ka ha meriri Argentina n'egwuregwu ngwụcha nke afọ 1930.
E hibere asọmpi nke afọ 1930 bụ nke Iko mbaụwa nke mbụ n'Uruguay ma bulie iko na be ha.
Ha buliri iko nke abụọ n'afọ 1950 ka ha meriri Brazil, n'agbanyeghị na Brazil hibere asọmpi nke afọ ahụ.
Kedụ onye ga-ebuli iko nke afọ a?









