'A Tribe Called Judah' abụrụla ihe onyonyo Nollywood kachasị dọbata ego
Akụkọ kpuchiri ihe niile mere n'ọnwa ịkpeazụ afọ a bụ ọnwa Disemba na Naịjirịa nakwa na mba ụwa niile.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Chimezie UcheAgbo and Ikechukwu Kalu
Nke bụ eziokwu maka ihe mere Zack Orji
Ebe foto si, Zack Orji/Instagram
Nkọwa foto, Nke bụ eziokwu maka ihe mere Zack Orji
Akụkọ pụtara taa na-ekwu na omeiheonyonyo a ma ama bụ Zack Orji dara ewe buru ya gawa ụlọọgwụ.
Kepu Kepu ahụ kwuru na o nweghi ike ikwu okwu maọbụ zaa ndị na-agwa ya okwu.
Otu onye nọ nso n' ezinaụlọ ya gwara BBC na nke a mere n'ezie."Ọ bụ mgbe ọ gara mposi ka ọ dara n'ụtụtụ taa (ụbọchị ụka).
Mana ugbua ọ na-enweta onwe ya nwayọ nwayọ" ka onye ahụ kwuru.
Onye ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ya gwakwara BBC na e buru ya gawa ụlọọgwụ bụ FMC nke dị n'Abuja.
Orji dị afọ 63 malitere iwu ewu oge achumnta vootu ntuliaka ọkwa onyeisiala Naijiria dịka ya na nwunye ya na-akwado ndị dị iche iche imeri ya bụ okwa.
Ndị omekome egbuola mmadụ abụọ na mwakpo ọzọ na Plateau steeti
Ebe foto si, Channels TV
Akụkọ pụtara na-ekwu na ndị omekome egbuola mmadụ abụọ ọzọ na mwakpo ha mere n'ebe akpọrọ Durbi n'okpuruọchịchị Jos East dị na Plateau.
Ọ bụ n'abalị ka ndị ahụ malitere iwakpo obodo ahụ ọzọ mana ndị nche obodo lusara ha ọgụ ma chụsasịa ha nke butere ọnwụ otu onye n'ime ndị omekome ahụ.
Onyeisi Kọmitii Transition n'ebe ahụ bụ Markus Nyam bụ onye gbara àmà nke a ma kwuo na ọsọ enyemaka nke ndị agha gbatara ha n'oge so n'ihe mere ka mwakpo ghara ịkarị etu ọ dị.
Cheta na ndị omekome ahụ wakporo obodo Barkin Laddi nakwa Bokkos ebe ha gburu opekatampe mmadụ 190.
Nke a mere ka ihe ruru mmadụ puku iri na abụọ ọ kachasị ụmụ nwaanyị na ụmụ aka gbaa ọsọ ndụ gbaga ogige iri abụọ na atọ nke ngalaba enyemaka Red Cross hibere.
Otu dị icheiche gụnyere UN akpọọla oku ka enyocha ya bụ mwakpo ma katọọ ya.
Onyeisiala mba Burundi bụ Évariste Ndayishimiye ekwuola dịka ọ na-asa ndịntaakụkọ okwu na ụmụnwoke na-edina onwe ha maọbụ ụmụnwaanyị na-edina owe ha kwesịrị ka akpụta ha n'ọha "tụọ ha okwute".Ndayishimiye, onye bụ onye ụka Katọlik kpọrọ akpọ ksịrị ndị mba ndị nwere agba jide enyemaka ha, ha enyela ha ma ọ bụrụ nna ọ bụ ịkwado ụdịrị ndị a bụ ọnọdụ ha ga-esi nye enyemaka.Ọ sịrị, " A sị m kwube, echere m na a hụ ụdị ndị a na Burundi, e kwesịrị ịkpụga ha n'amaegwuregwu, tụọ ha okwute. Nke a agaghị abụ ịda iwu."Ndayishimiye kwụrụ na ụdị ndụ ahụ dịka, "ịhara n'etiti Ekwensu na Chukwu," ma sị, " Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhara Ekwensu, gaa na mba ndị ahụ(ala Bekee) ga biri".
Saụt Afrịka agbaala Izrel akwụkwọ n’ụlọikpe mba uwa niile nke a kpọrọ 'International Court of Justice'(ICJ), maka "oke ogbugbu nwere ike ikpochapụ agbụrụ" na-aga n’iru na Gaza.
Ha rịọrọ ụlọikpe ka ha nye
Izrel iwu ịkwụsị ọgụ ha na-alụ na Gaza ozugbo.
N'uche ha,dịka otu onye weliere isi na mba ahụ si kwuo, ihe ndị Palestine na-agabiga yiri ha ha gabigara n'oge ọchịchị 'apartheid'.
Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesị nke Izrel
na-akọwa na ha anabataghị ya bụ akwụkwọ kwuru na Izrel a egbuọla ọtụtụ ndị mmadụ
na Gaza.
Na okwu ya, ‘’Anyi na-akpọkụ ụlọikpe ICJ ka ha jụụ inabata akwụkwọ ahụ Saụt Afrịka gbara n’ihi na ọ chịtaghị aja’’
‘ICJ’ bụ ngalaba UN na-ahụ maka ịkpe dịri mba ụwa,
ụlọọrụ ya dị na obodo Haguedị na mba Netherlands.
Ọrụ ha bụ ikpe ịkpe ziri 'etiti mba na mba ma nye aka kpeziere ha okwu ọbụla ha nwere.
Ọrụ ha ọzọ bụ inye mba
ụwa ndumodu n’ihe gbasara mmekọrịta ha na mba ndị ọzọ.
E chiela Tinubu, Shettima, Akpabio, Abbas echichi n'Abia Steeti
Ndị eze ọdịnala Abia steeti echiela Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu echichi "Omeziri Igbo 1" na Bende dị n'Okpuru Ọchịchị Bende, Abia Steeti n'ụbọchị Fraide.
E chikwara Onyeisi Ulọomeiwu Ugwu Naijiria bụ Godswill Akpabio, "Dike dị na Mba", ebe e chiri ogbo ya nke Ụlọnnochiteanya bụ Tajudeen Abbas, "Okwuruoha".N'okwu ya n'emume ahu nke Osote ya bụ Shettima nọchitere anya ya, tooro Osote Onyeisi Ulọnnochiteanya Naijiriana onye mkpokọba otu udo "Peace In Southeast Project (PISE-P)' bụ Ben Kalu maka ikwudosi ike n'ịkwado mbọ Onyeisiala Tinubu na-agba ịkwụsị nsogbu enweghị nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ.
Ọ rụtụrụ aka mkpa uto akụkụnaba dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ma gosi obi mwute na ndakpọ nchekwa si adọghachị aka elekere azụ n'okwu ntolite akụnaụba mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.Tinubu kwuru na ọchịchị ya agaghị akụghọwa aka na-ele a a naebibi ndụ na akụnaụba mpaghara ahụ.Ọ gara n'ihu kelle ndị eze Ọdịnala maka ịkwanyere ya na ndị ọzọ ugwu pụrụ iche.Gọvanọ Hope Uzodinma, onye kwuru okwu n'aha ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ tụrụ arịrị ahụhụ ndakpọ nchekwa na-ebutere ndị Ọwụwa Anyanwụ kemgbe afọ 2021.O kwupụtara olileanya ya na atụmatụ nke Ben Kalu wepụtara ga-enye aka iweta udo na mpaghara ahụ.Gọvanọ Abia steeti bụ Alex Otti bụ onye nabatara ndị ọbịa ahụ Dr. Alex Otti sịrị na ọ bụ udo ka ndị ọwụwa Anyanwụ chọrọ, na o nweghị ihe na-aga n'ihu ma ọ bụrụ na udo adịghị.
Igbo, mma mmanụ o!
Igbo ndị ọma anyị ji aba, mma mmanụ o!
Mmadụ asatọ si otu ezinaụlọ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ n'Imo
Mmadụ asatọ si otu ezinaụlọ ekpochapụla anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ mere na nkwụsị Amanwozuzu dị n'Okpuru Ọchịchị Ikeduru n'Imo steeti.
Onyeisi ogige ndị uweojii n'Ikeduru bụ Lucky Ahiole gwara onye ntaakụkọ anyị gara ebe ọdachi a mere na nna ezinaụlọ ahụ bu nwunye ya na ụmụ ha n'ụgbọala Sienna gbabara n'ụgbọala bu okporo igwe a kwụbara n'akụkọ ụzọ.
Okporo igwe ahụ mapuru ndị nile nọ na Siena ahụ, ma gbụọ ha niile ozugbo.
Ka a na-ede akụkọ a, ndị uweojii si na ngalaba Okpuru Ọchịchị Ikeduru etinyela ozu ndị ahụ n'ebe a na-edebe ozu.
Etu e si nwụchiela ndị na-atọrọ ụmụaka n'Ugwu-Awusa, ere na Ndịda
Ebe foto si, Getty Images
Aka ndị uweojii Kano akparala ndị ji ịtọrọ ụmụaka n'Ugwu Awusa na-ere ha na steeti dị iche iche na Ndịda Naijiria, mere ọrụ.
N'abalị 15 nke ọnwa Disember af ọ 2023, a nwụchiri otu nwaanyị a kpọrọ Comfort Amos ka ọ kpọ nwatakarịị gbara afọ ise Abdulmutallib Sa'ad achọ ime njem gawa Legọs.
E mechara chọpụta na a tọọrọ Abdulmutallib n'abalị 12 nke ọnwwa Disemba na 'Zango Quarters' dị na Bauchi Steeti.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kano bụ Abdullahi Kiyawa si kwuo, nnyocha ndị uweojii mere ka a nwuchie gosiri ndị ọzọ a na-enyo na aka ha dị n'mkpamkpa otu ahụ.
Ha gụnyere Chika Ezugbu, Joy Nzelu, Clement Ali na Emeka Ekeidigwe, bụ ndị bicha Kano ma na-akpa mkpamkpa na , Bauchi, Anambara.Imo na Legọs.
Kiyawa gwara BBC sị,"Ka ọ dị ugbua, anyị anwụchiela mmadụ itoolu ma hụ ụmụaka asaa dị agbata afọ atọ rue asatọ n'aka ha."
SP Kiyawa kwuru na ha gbanwere aha Abdulmutalib Sa'ad, gụọ ya Ifeanyichukwu, ma ree ya puku nari naira anọ na ụma asatọ (N480,000,
Ndewoonu
Ndeewonụ, Igbo ndị ọma!
Nwata nwaanyị agbagbuola enyi ya nwoke bụ onye Uweojii n'Imo steeti
Ebe foto si, Imo state Police
Nke na afịọ na Imo steeti ugbua bụ na otu nwa agbọghọbịa gbara afọ iri abụọ na atọ (23yrs) aha ya bụ Amanda Uchechi Ugo weere egbe gbagbuo enyi ya nwoke bụ onye Uweojii, ọ nwụọ pịị.
Ozi ndị uweojii wepụtara gosiri na ọ bụ ụbọchi tuzde ka onye Uweojii aha ya bụ Cosmas Ugwu na enyi ya nwaanyị Amanda nọ n’ime ụlọ ya n’enwe nghọtahie, ihe ndị agbataobi nụzịrị bụ ụda egbe tuum tuum ugboro anọ.
Ka ndị uwe ojii agbata obi bịarutere, o wee bụrụ na Amanda amịrịla egbe Cosmas gbaa ya ugboro atọ n’obi ma gbakwaa ya otu n’aka.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru na ya bụ onye uwe ojii nwụrụ pịị tupu eburu ya gaa Evergreen Hospital Ezinihite ebe dokinta kwuru hoo haa na ọ nwụọla.
O nwebeghị onye nwere ike ịkọwa ihe na-esere onye Uweojii Cosmas Ugwu na enyi ya nwaanyị nakwa onye kuziere nwata nwaanyị ahụ ka esi agba egbe nke ọma.
Ka ọ dị ugbua, aka ndị uwe ojii jisiri Amanda ike.
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ asatọ maka ebubo igbu Igwe Adani
Ebe foto si, Enugu state Police
Ndị obodo Adani nke dị na okpuruọchịchị Ụzọ-Ụwani, Enugwu Steeti ka nọ na iru uju na mmapụ obi maka ogbugbu ndị omekome gburu Igwe ha bụ Patrick Ezeugwu.
Mkpa mkpa ahụ kpara n’uchichi foro ụbọchi Ekeresimesi oge ndị omekome wakporo Igwe ahụ na be ya were gbuo ya.
Kọmishọna Uweojii Enugwu bu Kanayo Uzuegbu kọwara na ya ejidela mmadụ asatọ aka ha dị na arụ ahụ ma kwuo na-ya ga ejideriri ndị niile kpara nkata ma mepụta ya bụ ogbugbu.
Kọmishọna Uzuegbu kwuputara nkea oge ọgara njem nleta na ya bu obodo Akụtara, Ụzọ-Uwani LGA na ndị niile aka ha dị na ọnwụ Igwe Patrick agaghị enwe ezumike ganye na aka akpaara ha.
O kwuru na gọvanọ Enugwu bụ Peter Mbah enyela ya ntuziaka ka ọ nọrọzịa n'Adani ugbua na-arụ ọrụ ya ganye na ejidechaa ndị omekome ahụ.
Onye ji ọkwa President General Adani bụ S N Utazi nakwa Traditional Prime Minister Dọkinta Obinna Ayogu kwuru na ogbugbu Igwe Ezeugwu bụ ihe mgbawa obi, ma kelee gọvanọ Peter Mbah na ndị uweojii maka ịgbatara ha ọsọ enyemaka.
Obodo Adani dịzị ka ebe awụrụ mmiri oyi ugbua.
Portable emeriela Charles Okocha n'asọmpi ọkpọ
Ebe foto si, Charles Okocha/Instagram
Otiegwu a ma ama bụ Habeeb Okikiola a ma dịka 'Portable' egosila onye ihe ejije Nollywood bụ Charles Okocha a ma dịka 'Mr Phenomenal' n'odogwu abụghị 'guy name' n'asọmpi ọkpọ ha tiri n'ogige 'Landmark Beach' dị na Victoria Island, Legos ụbọchi Tuzde,abalị 26 nke ọnwa Disemba(Boxing Day).
Portable kụpụrụ Charles Okocha mmụọ na-ejere ya ozi n'agba nke anọ ihe ritere ya ụdọ n'asọmpi ahụ nke ọtụtụ ndị mmadụ gara kiriee.
N'ọsịsa ya ka e mechara asọmpi ahụ, Okocha kwuru na "wuruwuru bara ya" bụ asọmpi. O boro mmeri e meriri ya,"ogbu asọmpi amaghị ọrụ ya"(incompetent referee.)
E hiwere asọmpi ahụ malitere dịka njakịrị dika Portable boro ebubo na ya na Okocha nwere okwe ha zụrụ, a kwụọ ha ụgwọ mana Okocha kpachiri akatakpo ego ruru nde naira 40.
Mana Okocha kwuru na ya kwụrụ ya nde naira ise, na o nweghị akwụkwọ nkwekọrịta ha abụọ binyere aka.
Ndị Ondo steetị enwela Gọvanọ ohuru
Ebe foto si, Bayo Onanuga/X
E duola Lucky Aiyedatiwa bụbụ Osote Gọvanọ iyi ọrụ dika Gọvanọ ọhụrụ Ondo Steetị n'ụlọ gọọmentị ha dị n' Alagbaka, Akure, na mgbede Wednezde.
Akeredolu bụbụ Gọvanọ steeti ahụ nwụrụ n'ụzọ ụtụtụ taa ka ọ rịachara Kansa ogologo oge.
N' ọkwu ya, Govanọ Lucky Aiyedatiwa kwuru na, “ọnwu Gọvanọ Akeredolu bụ ihe na-agbawa obi."
"Nke a bụ nnukwu ihe mgbu."
Cheta na n'abalị 12 nke ọnwa Disemba afọ 2023, Aiyedatiwa malitere ịrụ ọrụ dịka gọvanọ dịka Gọvanọ ya bụ Rotimi Akeredolu gawara ileta ahụike ya.
Aiyedatiwa arụbuola dịka Gọvanọ malite n'ọnwa Juun rue ọnwa Septemba afọ 2023 oge Akeredolu gaburu ileta ahụike ya.
Ebe foto si, Lucky Aiyedatiwa/X
Ihe ndị i kwesịrị ị ma maka Aiyedatiwa
*Onye Obe-Nla dị n'Okpuru Ọchịchị Ilaje n'Ondo steeti a mụrụ ya n'afọ 1965.
*Ọ gara akwụkwọ Pramarị n'obodo ya ma gụọ Sekọdịrị na Ikosi High School, Ketu,Legọs.
*Ọ gara kọlege maka ọzụzụ ndị nkuzi(Lagos State College of Education (nke a na-akpọ 'Adeniran Ogunsanya College of Education' ugbua) ma kuzikwa nkuzi n'ụlọakwụkwọ Reliance International Schools, Ijokodo.
*O mechara gaa mahadum University of Ibadan ebe o nwetara asambodo 'Advanced Diploma' na 'Business Administration' n'afọ 2001.
* Ọ gụrụ 'Master's Degree' na 'Business Administration (MBA) na mahadum University of Liverpool, dị na mba Briten.
Ọ bara ndọrọndọrọ Ọchịchị n'afọ 2011 dịka ọ banyere otu Action Congress of Nigeria(ACN nke mechara bụrụ APC.
N'abalị 11nke ọnwa Oktoba afọ 2020, Inec kpọpụtara ya na Akeredolu dịka Gọvanọ na osote ya.
Na'Abba' bụbụ onyeisi Ụlọnnochiteanya, anwụọla
Ebe foto si, Ghali Umar Na'Abba
Onye bụbụ Onyeisi Ụlọnnọchiteanya Naijiria bụ Ghali Umar Na'Abba a alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 65, dịka ezinaụlọ ya sị gwaa BBC n'ụtụtụ Wenezde.
Na'Abba nwụrụ n'ụlọọgwụ n'Abuja bụ ebe ọ nọ anata nleta.
A ga emeume akwamozu ya n'ebe Elekere Anọ na Ọkara na ngwuru Emir nke Kano.
E mecha e lie ya n'ebe olili ọzụ 'Dan Dolo Cemetery' dị na Goron Dutse.
Ihe i kwesịrị ị ma maka Na'abba
A mụrụ Ghali Na'Abba n'abalị 27 ọnwa Septemba afọ 1958 n'ezinaụlọ Alhaji Umar Na'abba na Kano.
Ghali Na'Abba bụ onyeisi Ụlọnnọchiteanya malite n'afọ 1999 rue 2003.
A họpụtaburu ya ka ọ nọchiite mpaghara 'Kano Municipal Federal Constituency' n'afọ 1999.
Mana nsogbu dagidere Salisu Buhari bụ onye mbụ bụ Onyeisi ụlọnnochite anya n'agba nke anọ ọchịchị Onyekwuouche ya na Naijiria nyere ohere ka a họpụta ya. (Cheta na Salisu Buhari bụ Onyeisi Ụlọnnọchiteanya nwa mgbe nta tupu a chọpụta na ọkpụrụ asambodo adigboroja nke mere ka o tinye akwụkwọ arụkwaghịm)
Peter Obi etinyela ọnụ n'okwu ihe karịrị mmadụ 70 e gburu na Plateau steeti
Ebe foto si, ChannelsTV
Onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi ekwuola okwu banyere ọtụtụ mmadụ e gburu na Naịjirịa n’oge mmemme ekeresimesi afọ a tụmadị na Steeti Plateau, Katsina na Zamfara.
Dịka Obi siri kwuo, “ụfọdụ obodo ndị nọ n’agha ahụbeghị ụdị enweghị nchekwa, tigbuo zọgbuo na igbu mmadụ dịka e si ahụta ya na Naịjirịa taa.”
Obi toro ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ma kwuo na ndị agha Naịjirịa, ndị uweojii na otu ọrụ nchekwa ndị ọzọ bụ ndị ọrụ na-ebu aka dịkwa ka ha na-adịghị anata ekpere nakwa obi ebere ụmụafọ Naijịrịa n’oge ụfọdụ.
Ihe Gọvanọ steeti ahụ kwuru maka ihe mere
Aka na-achị Steeti Plateau bụ Caleb Mutfwang ekwuola okwu banyere njinji jiri n’ụbọchị Sọnde ebe ndị ojiegbe mere mwakpo ma gbuo ọtụtụ mmadụ na steeti ahụ.
N’otu ozi ọnụ na-ekwuru gọvanọ Mutfwang bụ Gyang Bere tinyere aka na ya, ọ sịrị na gọvanọ akatọọla ya bụ ọnọdụ ọjọọ ma kpọọ oku ka ndị bi n’ime obodo mụrụ anya.
Dịka ozi ahụ siri kwuo “Gọvanọ Mutfwang agwaala otu ọrụ nchekwa dị iche iche e nwere na Steeti ahụ ka ha malite ịnwụchi ndị omekoome aka ha dị n’arụ ahụ iji hụ na e kpere ha ikpe.”
“Ọ nyere mmasi obi ike na a ga-etinye atụmatụ ndị kwesịrị ekwesị n’ọrụ iji belata mwakpo ndị na-aga n’ihu ugbua na Steeti ahụ megide ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha.”
Gọvanọ gwakwara ndị bi n’obodo ahụ ka ha mụrụ anya oge niile ma nye mkpesa banyere omume ọ bụla na-ezighị ezi n’aka ndị ọrụ nchekwa.
Ọ gọkwara ọfọ ka ndị niile nwetara ihe mmerụahụ gbakee ngwangwa dịka ọ kasikwara ezinaụlọ tụfụrụ ndị nke ha obi.
Ọ bụ n’ụbọchị bọrọ ekeresimesi ka ndị ọkpaegbe wakporo ụfọdụ obodo ndị e nwere n’okpuru ọchịchị ime obodo Bokkos na Birnin-Ladi nke steeti Plateau gbuo ihe ruru mmadụ 70.
Onyeisioche kọmiti ọchịchị nchereoge nke Bokkos bụ Monday Kasa gwara ndị ọrụ mgbasaozi na mwakpo ahụ malitere n’abalị Satọde ruo n’ụtụtụ Sọnde n’oge ndị obodo ahụ na-akwado maka mmemme ekeresimesi.
Kasa kwuru na ndị ojiegbe ahụ mụnyere ụlọ ndị mmadụ ọkụ, bibie ngwongwo ha ma zurukwa ihe ndị ha kọtara n’ugbo.
Mmadụ atọ anwụọla na mkwapo ụlọụka Katọlik dị n'Ebonyi
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ojiegbe amabeghi ndị ha bụ egbuola mmadụ atọ dịka ha wakporo otu ụlọụka Katọlik dị n'Abakaliki, Ebonyi steeti.
Akụkọ kwuru na nke a mere mgbe ndị ahụ gara ịka ụka n'abalị foro ụbọchị ekeresimesi n'ụlọụka Immaculate Conception dị n'obodo Nkweagu n'okpuruọchịchị Abakaliki.
Bishọpụ Abakaliki bụ Peter Nworie katọrọ ya bụ ihe mere kwio na ọ bụ ihe mwute na ihe ịgụ akwa ma kpee ekpere ka mmụọ ha zuo ike na ndokwa.
"Nke a bụ mbụ ụdịrị ihe a na-eme n'ụlọụka nakwa n'Ebonyi steeti niile" ka o kwuru n'ozi ụbọchị ekeresimesi o nyere n'ụlọụka St Theresa Cathedral dịkwa na steeti ahụ.
Ọ sị na o bụ mgbe Fada na-edu ndị mmadị n'ụka abalị ahụ ka ọdachi ahụ dakwasịrị ha dịka ndị agụtaghị ọnụ merụkwara ahụ na ya bụ ihe.
Ndị uweojii azọpụtala ụmụaka anọ agbatobi ha tọọrọ n'Abia
Ebe foto si, Ifeanyi Okali
Nkọwa foto, Ụmụaka anọ ahụ esighi n'otu nne na nna mana ha biko n'otu ụlọ n'Abia
Ụlọọrụ ndị uweojii Steeti Abịa na-ekwu na ya anwụchiela ndị tọọrọ ụmụntakịrị anọ otu nne na nna mụrụ ma nwụchie ndị tọọrọ ha na Steeti Abịa.
Ozi sitere n’aka ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ndị uweojii Steeti Abịa bụ Maureen Chinaka kwuru na ọ bụ n’abalị 16 nke ọnwa Disemba, 2023 ka ha nwetara mkpesa n’aka nne ụmụntakịrị ahụ bụ Ifeanyi Udoma Ibe banyere ụmụ ya anọ ndị na-efu efu nke mere ka ndị uweojii malite ime nnyocha ozugbo ozugbo.
Site na enyemaka ndị orụ DSS, ndị uweojii napụtara abụọ n’ime ụmụntakịrị anọ ahụ ma nwuchie otu nwaanyị gbara afọ 35 aha ya bụ Ifeoma Abonyi n’abalị 22 nke ọnwa Disemba, 2023 n’Asaba Steeti Delta dịka a chọpụtara na ọ bụ ya bụ onye ‘tenant’ tọọrọ ụmụntakịrị ahụ.
Ka osiladị, anapụtara abụọ ndị nke fọrọ afọ n’abalị 24 nke ọnwa Disemba, 2023 ma nwuchiekwa mmadụ asatọ ndị a na-enyo enyo n’ozuzuoke nke gụnyere ụmụnwaanyị ise na ndị nwoke atọ.
A nọkwaara na nso nso a tọrọ ụmụntakịrị anọ otu nne na nna mụrụ na Steeti Abịa mana ruo ugbua achọtabeghị ha.
Ozi Ekeresimesi si n'ọnụ ndị ọchịchị dị icheiche
Ebe foto si, Getty Images
Dịka taa bụ ụbọchị ekeresimesi, o nwere ndị ha na ezinaụlọ ha nwere oge ezumike na nweta onwe ha ebe ndị ọzọ nọ n'etiti ọnọdụ ọjọọ.
Ọ bụkwa etu ahụ ka ọ dịịrị ndị mmadụ kemgbe mmalite afọ a. Nke a so n'ozi ndị isi dị icheiche tinyere n'ozi ekele ekeresimesi ha.
Lee ozi ndị ahụ ebe a.
Onyeisiala Bola Tinubu
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ọchịchị ya ga-elebanye anya n'iweta ohere ikume nye ndị ọ na-achị iji belata ahụhụ mwepu ụgwọ subsidy buteere ha.
Ọ sị ndị mmadụ na n'obere oge, ala Nọ́ịjirịa ga-abanye "ụtụtụ ọhụrụ nke ọganihu, udo nakwa ịga mgbawanye akụnaụba"
Nke a dị n'ime ozi o zigaara ndị mmadụ n'ihu ekeresimesi.
Ọ gwakwara ndị mmadụ ha ṅomie Kraịsti stite n'iweputa aka enyemaka nye ndị o nweghi ka ọ ha ha nakwa ndị na-eri ụjụ n'ụbọchị taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Onyeisi ụlọụka Katolik bụ Pope Francis arịọla ka ekpee udo megide "agha enweghi isi" n'ozi o nyere n'ụlọụka abalị foro ụbọchị Ekeresimesi.
Ọ sị "n'abalị a, obi anyị dị n'obodo Bethlehem ebe agbahapụrụ udo ọzọ n'ihi agha enweghi isi" bụkwa nke dị ire n'akara X bụbu Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Onyeisiala mba Amerịka na nwunye ya zigaara ndị nile na-eme emume ekeresimesi ozi ekele n'ụbọchị ahụ.
"Anyị na-enye unu ọṅụ na aṅụrị n'abalị foro ekeresimesi a".
O kwuikwara na ọ bụ olileanya ya na ndị mmadụ na ezinaụlọ ha na ikwu na ibe ha nọkọ ọnụ n'oge.
O ji ohere ahụ cheta na ndị ọrụ nchekwa ala ha ọ kachasị ndị enweghi ike nata zute ezinaụlọ ha ma na-ekwu "anyị na-eche maka unu".
Ekeresimesi Ọma!
Ka ụbọchị taa maara gị mma
Onye uweojii agbaala onye na-eme ihe ejije 'Nollywood' egbe
Ndị uweojii Ogun steeti ekwuola na onye otu ha aka na-akọ ọkọ gbara onye na-eme ihe ejije a ma ama bụ Azeez Ololade Ijaduade egbe n'ụtụtụ ụbọchị ụka.
Onye kpuhere nke a bụ onye ya na Azeez na-arụkọ ọrụ bụ Abiodun Adebanjo n'otu ozi o zipụrụ n'akara Instagram ya.
Abiodun kwuru na otu o siri di ugbua, a na-azọ ndụ nwaamadị ahụ n'ụlọọgwụ Babcock University Teaching Hospital, Ilishan Remo.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Steeti Ogun bụ Omolola Odutola sịrị na Azeez Ijaduade gara mmemme ngwụcha afọ na mpaghara Iperu tupu esemookwu adaa n'etiti ndị haziri mmemme ahụ na onye uweojii nke gbara ya egbe, nke mere o jiri gbapụ mgbọ na-amaghị ama, mgbọ were tụọ nwaamadị ahụ n'olu.
Ka osiladị, ọ sịrị na Azeez nọ "n'ezi ọnọdụ" n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.
Ebe foto si, Azeez Ololade Facebook
Nkọwa foto, Onye uweojii gbara onye na-eme ihe ejije 'Nollywood' egbe